Rite Uru Site n’Ịmụ Bịaruo Jehova Nso
1 Ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi,” anyị nwere obi ụtọ ná mwepụta nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso n’asụsụ Bekee. Ọtụtụ ndị na-agụ Bekee gụrụ akwụkwọ ahụ ozugbo. Obi abụọ adịghị ya na isiokwu dịịrị afọ 2003 bụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso” kpalikwara ọtụtụ ndị ọzọ ime otú ahụ.—Jems 4:8.
2 Na March, anyị ga-amalite ịmụ Bịaruo Jehova Nso n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru kasịnụ site n’ọmụmụ ihe anyị? Nkwadebe dị oké mkpa. Ọ ga-ewe izu abụọ iji mụchaa isiakwụkwọ nke ọ bụla, a ga-atụlekwa ọnụ ọgụgụ paragraf dị nnọọ nta n’izu nke ọ bụla. Nke a ga-enye gị oge buru ibu iji zaa ajụjụ sitere n’obi dabere ná nkwadebe na ntụgharị uche i mere n’ihe ọmụmụ ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, a ga-atụle paragraf ka nta n’izu nile a ga-amụ akụkụ nke ikpeazụ nke isiakwụkwọ ọ bụla iji nwee oge a ga-eji jiri akụkụ pụrụ iche nke akwụkwọ ahụ mee ihe.
3 Malite n’isi nke 2, e nwere igbe bụ́ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche” ná ngwụsị nke isiakwụkwọ ọ bụla. Mgbe a mụsịrị paragraf ikpeazụ nke isiakwụkwọ ọ bụla, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ga-esoro ìgwè ahụ tụlee igbe ahụ. Ọ ga-agwa ndị so n’ìgwè ahụ ka ha kwuo echiche ha iji chọpụta ihe si ná ntụgharị uche ha mere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ pụta. (Ilu 20:5) Tụkwasị n’ajụjụ ndị e dere n’igbe ahụ, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịjụ ajụjụ ndị dị ka ndị na-esonụ: “Gịnị ka ihe ọmụma a na-agwa gị banyere Jehova? Olee otú o si emetụta ndụ gị? Olee otú ị pụrụ isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?” Ebumnobi ya ga-abụ ime ka a zaa ajụjụ ndị sitere n’obi, ọ bụghị ile ìgwè ahụ ule n’ihe ndị dị nnọọ nta.
4 Akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso pụrụ iche. Ọ bụ ezie na mbipụta nile nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye Jehova otuto, nzube bụ́ isi e ji bipụta akwụkwọ a bụ iji tụlee àgwà Jehova. (Mat. 24:45-47) Lee ohere magburu onwe ya na-echere anyị nke a bụ! Anyị ga-erite uru dị ukwuu site n’ịmụ banyere àgwà Jehova n’ụzọ miri emi. Ka ọmụmụ anyị ga-amụ akwụkwọ a nyere anyị aka ịbịarukwu Nna anyị nke eluigwe nso, ka anyị dịkwuokwa irè n’inyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ.