Ịmụ Amụma Daniel
1 Malite n’izu April 17, anyị ga-amụ akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọtụtụ ndị agụworị akwụkwọ a na-adọrọ mmasị, ma ugbu a, anyị nwere ohere nke inweta abamuru ndị na-abịa site n’ịtụle ihe ọmụma ahụ n’ìgwè. A na-akpọku ndị nkwusa nile, ndị nile nwere mmasị na ụmụaka nile, ee, a na-agba ha ume ịnọ ya kwa izu maka ọmụmụ ihe a dị omimi nke akwụkwọ Bible bụ́ Daniel.—Deut. 31:12, 13.
2 Usoro Ọmụmụ Ihe na Ntụziaka: E depụtara usoro dum maka ịmụ akwụkwọ Amụma Daniel ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị. Jide n’aka na i tinyere otu n’ime ya n’ime akwụkwọ nke gị. Usoro ọmụmụ ihe ahụ na-egosi isiokwu na paragraf ndị sitere n’akwụkwọ ahụ, tinyere amaokwu ndị sitere na Daniel bụ́ ndị a ga-atụle n’oge ọmụmụ ihe nke ọ bụla kwa izu. Ntụaka ala ala peji na-akọwa otú a ga-esi atụle ụfọdụ n’ime ihe ọmụmụ ndị dị n’akwụkwọ ahụ na mgbe a ga-atụle ha. Kwa izu mgbe a mụsịrị ihe, a na-agba onye nduzi ume isoro ìgwè ahụ tụleghachi amaokwu ndị ahụ kpọmkwem bụ́ ndị sitere na Daniel bụ́ ndị e depụtara n’usoro ihe ọmụmụ maka izu ahụ. Dị ka oge nyere ohere ya, a pụrụ ịgụ ma kwuo okwu n’amaokwu ndị ahụ. Amaokwu ụfọdụ pụrụ isite n’otu izu banye n’izu ọzọ n’ihi ntụle na-aga n’ihu nke a na-atụle mmezu ha.
3 Jikere Maka Ọmụmụ Ihe A Kwadebere nke Ọma: E mewo mgbalị inye oge zuru ezu kwa izu ka a ghara ịtụle ebe e kenyere ọkụ ọkụ. Ihe ọmụmụ anọ dị nnọọ mkpirikpi. N’ihi ya mgbe a mụsịrị ihe n’izu nke June 5, onye nduzi pụrụ ịgụnye ntụleghachi nke Daniel 2:1-40. Maka izu nke June 26, ọ pụrụ ịtụleghachi Daniel 3:1-30. Izu nke September 4 kwesịrị ịgụnye ntụle e ji nlezianya mee nke ihe osise na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na peji nke 139. E kwesịrị ịtụle chaatị dị na peji nke 188 na 189 n’ọmụmụ ihe n’izu nke October 2.
4 Kwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ kwa izu, ma nwee obi ụtọ n’ikere òkè na ya. Jiri ihe ùgwù gị nke iso nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-akpakọrịta na nke irite uru site ná nghọta na-esite n’aka ndị e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi, kpọrọ ihe. (Dan. 12:3, 4) Jiri obiọma gbaa ndị ọzọ ume ịgachi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ anya. Ka anyị nile ṅaa ntị n’okwu amụma Chineke dị ka e kpughere ya n’akwụkwọ Daniel dị egwu.—Hib. 10:23-25; 2 Pita 1:19.