Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke Ndịàmà Jehova nke 2002
1 “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.” (Ọma 122:1) Ka ị na-enyocha ihe ọbụ abụ ahụ kwuru, rịba ama (1) mmetụta o nwere mgbe a kpọrọ ya òkù ka o sonye n’ife Jehova ofufe, (2) ezigbo ndị enyi o nwere, bụ́ ndị nwekwara mmasị dị ukwuu n’ezi ofufe, na (3) atụmatụ na-aghaghị ịdịworị mkpa ka e mee iji kpọsaa òkù ahụ, iji zukọta ọnụ, na iji gaa n’ụlọ Chineke.
2 Ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru adịghị ekwupụta mmetụta ndị anyị onwe anyị na-enwe mgbe anyị nụrụ na a na-eme atụmatụ maka mgbakọ ọzọ anyị gaje inwe? Anyị na-atụsi anya ya ike mgbe anyị chetara ọṅụ ndị anyị nwere ná mgbakọ ndị gara aga nakwa atụmanya nke iso ndị ibe anyị hụrụ Jehova n’anya nọkọọ ọzọ ná nnọkọ pụrụ iche. E mewo ndokwa maka inwe Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke ga-ewe ụbọchị atọ gburugburu Nigeria n’afọ 2002/2003. Ugbu a bụ oge anyị ga-amalite mewe atụmatụ iji gaa ma rite uru kasịnụ site n’oriri ime mmụọ na-echere anyị.
3 “Onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ onye nwere uche,” amalitewo ịkwadebe nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya nke a ga-ewepụta ná mgbakọ ahụ. (Luk 12:42) E kenyewo ọgbakọ ọ bụla ịga otu mgbakọ kpọmkwem ka e wee zere ijubiga ókè n’ebe nke ọ bụla a ga-enwe mgbakọ. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ ụmụnna amalitewo ịhazi ngalaba dị iche iche nke mgbakọ “ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.” (1 Kọr. 14:40) Ebe e dokwaworo ọtụtụ ihe maka abamuru anyị nakwa ka anyị wee nwee ntụsara ahụ́, gịnị ka anyị pụrụ ime n’onwe anyị iji kwadebe maka mgbakọ ahụ?
4 Mee Atụmatụ Ugbu A Ịgazu Ụbọchị Atọ Ahụ: Ọ̀ dị gị mkpa ịrịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị oge iji gazuo mgbakọ ahụ e kenyere gị? Jehova maara na ụfọdụ ndị were mmadụ n’ọrụ bụ “ndị ọ na-esi ike imeta mma.” (1 Pita 2:18) Ma mgbakọ anyị dị oké mkpa, anyị chọkwara ime ezigbo mgbalị iji gaa usoro ihe omume ahụ dum. Kpegara Jehova ekpere maka okwu ndị dị otú ahụ, na-achọ nduzi ya iji rụpụta ihe dị mma.—Neh. 2:4.
5 Chekwaa Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tinyere ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge iji malite chekwawa ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọkwa, ụfọdụ nwere ezinụlọ buru ibu. Ego dị ndị a, nakwa anyị nile mkpa maka inye onyinye, ịgba ụgbọ, iri ihe ná mgbakọ, na maka ihe ndị ọzọ pụrụ ịdapụta. Ọ dị ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo na ichekwa ego ga-ezunụ ka ezinụlọ ha dum nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ihe dị irè a pụrụ ime bụ ibu ụzọ mee atụmatụ ego ole a ga-achọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iburu ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe n’uche mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Jirizie ọnụ ọgụgụ ọnwa ndị dị malite ugbu a ruo mgbe unu ga-enwe mgbakọ distrikti unu kee ego ole e mere atụmatụ ya. Nke a bụ ego ole ọ ga-adị mkpa ka ị na-echekwa kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga-ebu ụzọ wepụ ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ ịdị na-etinye nke a n’obere igbe ma ọ bụ envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego ahụ a na-echekwa kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-edebe ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka mgbakọ malite tupu ị malite chekwawa ego maka njem a a na-eme kwa afọ.—Ilu 21:5.
6 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e zigara nke ọma. Unu EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere ebe e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jidenụ n’aka na unu nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye aha ụmụaka n’ihe ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ depụtara nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka o sie ike ime ndokwa maka ebe obibi zuru ezu. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịrị nke e nyere na fọm ahụ, jirinụ mpempe akwụkwọ ọzọ dee ya. Ọ bụrụ na e depụtara ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụtanụ ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. E kwesịrị izipụ fọm ahụ n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo. BIKO, EZIGARALA Society fọm Room Request ahụ. E kwesịrị iziga ya n’adres mgbakọ nke kwesịrị ekwesị nke e depụtara n’azụ fọm ahụ.
7 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha kwadoo Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a na-emezu ihe abụọ site n’ịṅa ntị ná ntụziaka a:
8 Ichekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ọnụ ala karị. Kama ego anyị ịgara ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ dị iche iche nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nakwa ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dara ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme. A kọwara mmụọ a nke ichebara ndị ọzọ echiche na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
9 Igosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Nke a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-ekwu, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’isu ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na anyị na-akwado ha n’ụzọ zuru ezu. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị maka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi kwadoo mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe ga-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị nakwa ụwa si na-ahụ ya, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
10 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha maka mgbakọ, karịsịa ndokwa maka ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ezi ihe nlereanya, ndị nwere mkpa pụrụ iche, bụ́kwa ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, ruru eru inweta enyemaka site ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ọ bụ ọgbakọ ebe ha na-aga nzukọ kwesịrị ime ndokwa ndị ọzọ maka ilekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche, kama ibokwasị ndị nhazi mgbakọ ibu ọrụ a. Ndị okenye na ndị ọzọ, bụ́ ndị maara ọnọdụ nke ọ bụla, pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ́ na-esichaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’igbo mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jems 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
11 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ ha kwurịta banyere ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye aka ahụ dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu elu nke peeji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Ọ bụ nanị ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, nakwa iji nwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere dị n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezigaziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
12 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
13 Ọtụtụ ndị egosipụtawo ekele maka ndokwa ndị a na-eme maka ụlọ obibi n’oge mgbakọ. Ì so na-enwe ekele maka ọtụtụ ndokwa ndị e mere maka gị? Obi dị Society ụtọ ịdị na-eme ka e nwee ebe obibi ndị dị ntụsara ahụ́, ndị aka pụrụ iru n’oge mgbakọ, na-enye anyị nile ohere itinye uche n’abamuru ime mmụọ nke mgbakọ ahụ na n’usoro ihe omume ya.
14 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla ịga mgbakọ kasị dịrị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa iji dokwaa maka oche, ụlọ, akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere unu ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
15 Jiri Ọchịchọ Obi Nye Onwe Gị Dị Ka Onye Ọrụ Afọ Ofufo: N’oge mgbakọ ahụ, ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo na-enye aka n’ịhụ na ngalaba dị iche iche na-aga nke ọma. Ndị atendantị nọ n’ụlọ mgbakọ na n’ebe ndọba ụgbọala na-enye nduzi maka ịnọdụ ala ma na-eche ụgbọala anyị nche n’ehihie. Ngalaba Na-ahụ Maka Idebe Ihe Ọcha nwere ihe ùgwù nke ịhụ na anyị nọgidere na-enwe aha ọma anyị maka ịdị ọcha, na-eme ka ebe anyị na-efe ofufe dị ọcha karịa otú ọ dị mgbe anyị bịara. Ànyị pụrụ inyere ngalaba ndị a ma ọ bụ ndị ọzọ ndị pụrụ ịchọ enyemaka anyị aka? Ị̀ ga-ewepụta onwe gị n’afọ ofufo isoro ụmụnna gị jee ozi “n’otu ubu”?—Zef. 3:9.
16 Ndị Mmadụ Hà Na-ahụ n’Ezie Ihe Anyị Na-eme? N’otu mgbakọ e nwere n’afọ a gara aga, otu nwoke nke kwụsịworo iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe eri ihe karịrị afọ 20 nọ na-arụ ọrụ na họtel. Ọ kọọrọ Ndịàmà ụfọdụ na ya na-echezi echiche ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ya na ịga nzukọ. N’ihi gịnị? N’ihi otú e si jiri ịhụnanya mesoo ya n’ụbọchị ndị ahụ Ndịàmà nọrọ na họtel ahụ.
17 Otu onye nke na-ere ihe na họtel kwuru banyere ụmụnna anyị, sị: “Ndị òtù unu bụ ìgwè kasị mma ná ndị na-anọ na họtel anyị. Ndị òtù unu na-enwe nnọọ ndidi ma na-akpa ezi àgwà.” Lee obi ụtọ nke a na-aghaghị ịdị na-ewetara Nna anyị nke eluigwe ka ọ na-ahụ ka anyị na-agbaso ndụmọdụ Jizọs: “Kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụrụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto”!—Mat. 5:16.
18 Otú ọ dị, anyị nwetakwara akụkọ ndị na-adịghị mma site ná mgbakọ ụfọdụ banyere ma ụmụaka ma ndị okenye ịdị na-agagharị n’oge ihe omume na-aga n’ihu. A hụrụ ka ụfọdụ nọ na-ehi ụra n’ebe e nyere ha ụlọ ma nọrọ n’ebe e nyere ha ụlọ mgbe ihe omume na-aga n’ihu n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Ụfọdụ ndị bịara mgbakọ gawara ịṅụ mmanya ọcha n’oge e nwere nkwụsịtụ ma laghachite mgbe ihe omume maliteworo wee malite ihi ụra. A kọkwara na mgbe ihe omume nọ na-aga n’ihu ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ na-ese foto. Ndị a na-agụnye ndị mụrụ ụmụ ha na ụmụ ha nọ na-ese foto ezinụlọ. Ka anyị ghara igosi ejighị ndokwa Jehova kpọrọ ihe site n’ikwe ka ihe ndị ahụ mee ọzọ ná mgbakọ afọ a. Anyị na-agba mmadụ nile ume igosi njide onwe onye. A na-echetakwara ndị mụrụ ụmụ ka ha na-elekọta ụmụ ha.—Fil. 1:9-11; 1 Kọr. 10:31; tụleekwa Levitikọs 10:9.
19 Ka anyị gosipụta ụdị àgwà ahụ Eze Devid nwere, bụ́ onye ji ọṅụ tụọ anya ịga n’ụlọ ebe a na-efe Jehova ofufe. Mgbakọ distrikti anyị bụ ebe dị mkpa e si enweta nri ime mmụọ nakwa ohere na-enweghị atụ maka mkpakọrịta ịhụnanya. Ya mere, anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ unu òkù ịmalite mewe ndokwa ugbu a iji gaa nnọkọ nile nke ụbọchị atọ dum nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke afọ a!
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Ozugbo unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochinụ, ebe na ụbọchị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịkanye ihe n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ịga mgbakọ ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu iji hụ na e mere ihe ozugbo, n’ịnụ ọkụ n’obi, nakwa n’ụzọ dị irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday: 9:20 ụtụtụ – 4:40 uhuruchi
Saturday: 9:00 ụtụtụ – 4:20 uhuruchi
Sunday: 9:00 ụtụtụ – 3:20 ehihie