Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije” nke Ndịàmà Jehova nke 2004
1 Gịnị na-eme ka mgbakọ distrikti ndị anyị na-enwe kwa afọ bụrụ ihe pụrụ iche nye gị? Ọ̀ bụ okwu ndị na-ewuli elu na ihe nkiri “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” kwadebeere anyị? (Mat. 24:45-47) Ọ̀ bụ akwụkwọ ọhụrụ ndị bu nri ime mmụọ a kwadebere n’oge ha? Ọ̀ bụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-akọ ahụmahụ banyere otú Bible siworo gbanwee ndụ ha n’ụzọ ka mma? Ọ̀ bụ akụkọ banyere otú ọrụ nkwusa Alaeze ahụ si na-enwe ọganihu n’ala ndị ọzọ? Ọ̀ bụ mkpakọrịta nke gị na ndị kwere ekwe ibe gị nọ n’afọ ndụ nile? Ee, anyị na-eji oké mmasị atụ anya mgbakọ anyị n’ihi ihe ndị a nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ!
2 Gaa Ụbọchị Atọ ahụ Dum: Site n’ọnụ Mozis, Jehova nyere iwu, sị: “Kpọkọta ndị Izrel, . . . ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa.” (Deut. 31:12) Site n’aka ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, Jehova akwadebeworo anyị usoro ihe omume pụrụ iche nke izi ihe n’ụbọchị nke ọ bụla nke mgbakọ anyị. Ebe ọ bụ na ọ na-ezi anyị “ime ihe na-aba uru,” anyị kwesịrị ịnọ ya iji nụrụ ihe nile ọ ga-ezi anyị. (Aịsa. 48:17) Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịnata onye were gị n’ọrụ ikike iji hapụ ọrụ, kpekuo Jehova ekpere ma rịọzie onye ahụ were gị n’ọrụ ka o nye gị ikike ịhapụ ọrụ, na-eṅomi ihe nlereanya Nehemaịa nke inwe obi ike. (Neh. 1:11; 2:4) Ọzọkwa, ọ ga-abụ ihe na-egosi ịhụnanya ime ka ndị òtù ezinụlọ gị na-ekweghị ekwe mara ngwa ngwa o kwere mee banyere atụmatụ ị na-eme ịga mgbakọ.
3 Ebe Obibi: Anyị ga-agbalị izitere ọgbakọ ọ bụla fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e dejupụtara fọm Room Request ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere e kwesịrị ide aha ndị nkwusa a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile n’ụzọ dị mma n’anya na nke ga-ekwe ọgụgụ. Biko hụ na i denyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye aha ụmụaka n’ihe ndepụta ahụ. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịrị nke e nyere na fọm ahụ, jirinụ mpempe akwụkwọ ọzọ dee ya. Ọ bụrụ na e dere aha ihe karịrị otu onye na fọm ahụ, biko dejupụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. E kwesịrị izipụ fọm ahụ n’ezi oge tupu oge mgbakọ eruo. BIKO, EZITERELA alaka ụlọ ọrụ fọm Room Request ahụ. E kwesịrị iziga ya n’adres mgbakọ nke kwesịrị ekwesị nke e depụtara n’azụ fọm ahụ.
4 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha na-akwado Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ na-agbaso ntụziaka a, anyị ka na-enweta akụkọ banyere ụfọdụ ndị na-adịghị agbaso ya. Anyị na-agba mmadụ nile ume igosipụta ịhụnanya maka òtù ụmụnna site n’ikwado ndokwa Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme, ọbụna ma a sị na e nyeghị gị ụlọ ị gaara ahọrọ ka e nye gị. Biko, kpọtụrụ Ngalaba Ụlọ Obibi mgbe ị na-eme ndokwa maka ụlọ ị ga-ebi ná mgbakọ, ọ gwụla ma ị̀ ga-ebi na nke enyi gị ma ọ bụ nke onye ikwu gị. Ọ bụrụgodị otú ahụ, ọ dị mma ịchọpụta ma Ngalaba Ụlọ Obibi ò burula ụzọ kwuo okwu ụlọ ahụ. Ọzọkwa, biko agbachitela Ngalaba Ụlọ Obibi ihu site n’ikwu ka ị kwụọ ndị nwe ụlọ ma ọ bụ ndị họtel ego ka ukwuu iji nweta ụlọ ị chọrọ. Site n’ịkwado Ngalaba Ụlọ Obibi, anyị na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego ma na-egosipụta na anyị bụ ndị dị n’otu ma na-erube isi.—Fil. 2:1-4; 1 Jọn 3:17; 1 Ndị Kọrint 10:24.
5 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha maka mgbakọ, karịsịa ndokwa ndị metụtara ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ezi ihe nlereanya, ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche, bụ́ ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, ruru eru inweta enyemaka site ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ọ bụ ọgbakọ ebe ha na-aga nzukọ kwesịrị ime ndokwa ndị ọzọ maka ilekọta ndị nwere mkpa pụrụ iche, kama ibokwasị ndị nhazi mgbakọ ibu ọrụ a. Pọl onyeozi chetaara ọgbakọ ndị dị na Galeshia ka ha “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ [ha] n’okwukwe nọ.” (Gal. 6:10) Ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị merela agadi, ndị ahụ́ na-esichaghị ike, ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, ma ọ bụ ndị nọ n’ozi oge nile nwere ike ha agaghị arịọ gị maka enyemaka, ma ha pụrụ inwe ihe ịma aka ndị ha na-aghaghị imeri iji nwee ike ịga mgbakọ. Ị̀ nọ n’ọnọdụ ‘imere ha ihe ọma’ ma nyetụrụ ha aka? Karịsịa, ndị ikwu bụ́ Ndị Kraịst na ndị okenye kwesịrị ịmata ọnọdụ nke ndị dị otú ahụ.
6 Ọ bụrụ na onye nkwusa ezite fọm Room Request maka Mkpa Ndị Pụrụ Iche, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-atụle ya, na-eji ụkpụrụ nduzi ndị a eme ihe. Ha kwesịrị ịtụle ma ọ̀ bụ mkpa ọgbakọ ha pụrụ igbo. Ọ bụrụ na Ngalaba Ụlọ Obibi nwere ajụjụ ọ bụla banyere fọm ọ bụla e tinyere maka mkpa ndị pụrụ iche, ha ga-akpọtụrụ odeakwụkwọ ọgbakọ.
7 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ ha apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ iso odeakwụkwọ ọgbakọ ha kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta ya iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe omume ọgbakọ inyere ndị a aka inweta ebe obibi. Ọ bụrụ na ọgbakọ apụghị igbo mkpa ya, odeakwụkwọ pụrụ inye onye dị otú ahụ fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịrị n’ụzọ pụtara ìhè, n’elu elu peeji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA PỤRỤ ICHE.” Ọ bụ nanị ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, nakwa iji chọpụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eru maka nlekọta dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere dị n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezi oge tupu mgbakọ ahụ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezigaziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ mara kpọmkwem banyere ụlọ ahụ.
8 Ndị nwere mkpa pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
9 Ije Mgbakọ Ọzọ: Ọnọdụ gị pụrụ ịchọ na ị ga-aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ gị ịga. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e nye gị ụlọ, biko gakwuru odeakwụkwọ ọgbakọ gị bụ́ onye ga-enye gị fọm Room Request. Ziga fọm gị n’adres kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na a na-enwe mgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa n’obodo ahụ, jide n’aka na i depụtara akara ụbọchị nke mgbakọ ị chọrọ ịga.
10 N’otu mgbakọ nke ndị Jehova, bụ́ nke e mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,500 gara aga, Ezra na ndị Livaị ibe ya gụrụ Okwu Chineke ma kọwaara ya ndị gbakọtaranụ. Gịnị si na ya pụta? Nehemaịa 8:12 na-agwa anyị na “ndị ahụ nile [jere] . . . ime ka oké ọṅụ dị, n’ihi na ha ghọtara okwu nile nke e mere ka ha mara.” Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ekele na, dị ka Ezra na ndị Livaị, òtù ohu ahụ e tere mmanụ na-eji Okwu Chineke eme ihe, na-akọwa ya, ma na-egosi anyị otú anyị ga-esi na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị? N’ime nke ahụ, ohu ahụ na-egosipụta ezi ịhụnanya na nchebara echiche Jehova na-enwe maka ndị Ya. Kpebisie ike ịghara ikwe ka ụbọchị nke ọ bụla nke Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije” kwaa gị!
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday
9:20 ụtụtụ - 4:50 uhuruchi
Saturday
9:00 ụtụtụ - 4:30 uhuruchi
Sunday
9:00 ụtụtụ - 3:20 uhuruchi