Ndị Mụrụ Ụmụ—Na-azụnụ Ụmụ Unu Malite na Nwa Ọhụrụ
1 “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Ndị mụrụ ụmụ, ọ bụrụ na unu achọghị ka ụmụ unu si n’ụzọ nke eziokwu “wezụga” onwe ha, olee mgbe ọzụzụ dị otú ahụ kwesịrị ịmalite? Na nwa ọhụrụ!
2 Mgbe Pọl kwuru na ọzụzụ ime mmụọ Timoti nwere malitere n’oge ọ bụ “nwa ọhụrụ,” ihe àmà na-egosi na o bu n’uche malite mgbe e ku ya n’aka. (2 Tim. 3:14, 15) N’ihi ya, Timoti ghọrọ nwoke ji nnọọ ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (Fil. 2:19-22) Ndị mụrụ ụmụ, unu onwe unu kwa aghaghị ịmalite na “nwa ọhụrụ” nyewe ụmụ unu ọzụzụ dị ha mkpa iji ‘soro Jehova na-eto.’—1 Sam. 2:21.
3 Mee Ka Ha Na-enweta Mmiri Dị Ha Mkpa Iji Na-eto: Dị nnọọ ka mmiri dị osisi ndị ka na-epupụta epupụta mkpa iji topụta ghọọ nnukwute osisi, ọ dị mkpa ka a gbasa ụmụaka nọ n’afọ ndụ nile mmiri nke eziokwu Bible nke ọma iji too ghọọ ndị ohu Chineke tozuru okè. Ụzọ bụ́ isi nke isi kụziere ụmụaka eziokwu ahụ na inyere ha aka ka ha na Jehova nwee mmekọrịta chiri anya bụ site n’ọmụmụ Bible ezinụlọ a na-enwechi anya. Ma ndị mụrụ ụmụ, burunụ n’uche ogologo oge nwatakịrị nke ọ bụla pụrụ itinyeru uche n’ihe. Maka obere ụmụaka, ma eleghị anya nnọkọ ọmụmụ ihe ndị dị mkpirikpi, ndị a na-enwe ugboro ugboro ga-adị irè karịa ole na ole ndị toro ogologo.—Deut. 11:18, 19.
4 Eledala ikike ụmụ gị nwere ịmụta ihe anya mgbe ọ bụla. Na-akọrọ ha akụkọ banyere ndị a kpọrọ aha na Bible. Gwa ha ka ha see ọnọdụ ndị a kọrọ maka ha na Bible ma ọ bụ mee ha n’ihe ngosi. Hazie ọmụmụ ihe ezinụlọ ka o kwekọọ n’afọ ndụ na ikike ịmụta ihe nke ụmụ gị. Ọzụzụ ndị mbụ a ga-enye ga-abụ n’ihe ndị na-ataghị akpụ, ntakịrị ntakịrị; ma ka nwa ahụ na-eto, ọzụzụ ya kwesịrị ịsawanye mbara ma na-aga n’ihu n’ihu.” Mee ka ọmụmụ Bible na-atọ ụtọ ma gwaa ọgwa. Ị chọrọ ka ụmụ gị “zụlite agụụ” maka Okwu ahụ, ya mere mee ka ọmụmụ ihe ahụ dị ụtọ ruo n’ókè i nwere ike.—1 Pita 2:2.
5 Mee Ka Ha Na-ekere Òkè n’Ọgbakọ: Na-esetịpụrụ ụmụ gị ihe mgbaru ọsọ ndị na-eji nke nta nke nta adịwanye elu ka ha wee na-ekere òkè zuru ezu n’ọgbakọ. Gịnị pụrụ ịbụ ihe mgbaru ọsọ mbụ ha? Nne na nna nke obere ụmụaka abụọ kwuru, sị: “Ha abụọ malitere ịnata ọzụzụ n’ịnọ jụụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Ka oge na-aga, nyere ụmụaka aka ịza ajụjụ n’okwu nke aka ha ná nzukọ na ime ya ihe mgbaru ọsọ ha idebanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’ozi ubi, ihe mgbaru ọsọ dị mma ndị a pụrụ iru ga-agụnye inyefe traktị n’ọnụ ụzọ, ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, iche magazin n’ihu mmadụ, na iso ndị nwe ụlọ nwee nkwurịta okwu dị mma.
6 Na-esetịpụ Ihe Nlereanya nke Ịnụ Ọkụ n’Obi: Ụmụ gị hà na-anụ kwa ụbọchị ka ị na-ekwu banyere Jehova ma na-ekpegara ya ekpere? Hà na-ahụ ka ị na-amụ Okwu ya, na-aga nzukọ, na-ekere òkè n’ozi ubi, na-enwekwa obi ụtọ n’ime uche Chineke? (Ọma 40:8) Ọ dị mkpa ka ha na-ahụ nakwa ka unu na-emekọ ihe ndị a ọnụ. Otu nwatakịrị nwanyị toworo eto kwuru banyere nne ya, bụ́ onye zụliteworo ụmụaka isii ịghọ Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Ihe kasị nwee mmetụta n’ahụ́ anyị bụ ihe nlereanya mama anyị setịpụrụ n’onwe ya—o nwere mmetụta karịa okwu ọnụ.” Otu onye mụrụ ụmụ anọ kwuru, sị: “‘Jehova na-ebute ụzọ’ abụghị nanị okwu e ji emekarị ihe kama ọ bụ ụzọ anyị si bie ndụ anyị.”
7 Ndị mụrụ ụmụ, malitenụ na nwa ọhụrụ zụwa ụmụ unu, na-akụziri ha eziokwu sitere n’Okwu Chineke, na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ji nke nta nke nta adịwanye elu, na-esetịpụkwa ihe nlereanya kasị mma unu pụrụ isetịpụ. Unu ga-enwe obi ụtọ na unu mere ha!