Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/02 p. 1
  • Nzaghachi Na-ekpo Ọkụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzaghachi Na-ekpo Ọkụ!
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Vidio Ọ Dị Mkpa Ka E Chebara Echiche nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, Olee Otú M Ga-esi Emete Ezigbo Ndị Enyi?
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 4/02 p. 1

Nzaghachi Na-ekpo Ọkụ!

1 Ezinụlọ Ndị Kraịst n’ebe nile egosipụtawo ekele ha na-ekpo ọkụ maka vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Otu nna nọ na United States kwuru na mgbe ha kirisịrị ya, ụmụ ya ndị ikom nọdụrụ jụụ—ha ghọtara ihe nile dị na vidio ahụ! Otu akụkọ sitere Malawi kwuru na ụmụnna ndị nwoke na ụmụnna ndị nwanyị na-eto eto nọ n’ebe ahụ ghọtakwara ya n’ihi na ha na-enwe ụdị nrụgide ahụ site n’aka ndị ọgbọ ha n’ụlọ akwụkwọ. Otu nna nọ na Germany kwuru banyere vidio ahụ, sị: “Elere m ya anya dị ka azịza nye ekpere m.” Otu onye ntorobịa kwuru, sị: “Unu emeela maka ichetara m na Jehova na-eche banyere m.” Otu onye okenye nọ na New Zealand kọrọ, sị: “O nyeere otu n’ime ụmụnna anyị ndị nọ n’afọ iri na ụma aka ịbataghachi n’ụzọ nke ndụ.” Otu onye toworo eto nke lụworo di kiriri ya ma kwuo, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na onye ọ bụla na-eto eto nọ n’eziokwu ahụ ga-ekiri vidio a ma bụrụ onye a kwaliri ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ya!” Ndị òtù ezinụlọ, gịnị ma unu kirie ya ọzọ? E mesịa, tụlekọtanụ ajụjụ ndị na-esonụ ọnụ.

2 Okwu Mmeghe: Ònye bụ ezi enyi?—Ilu 18:24.

3 Ihe Mgbochi nke Ọbụbụenyi: Olee otú ị pụrụ isi merie mmetụta nke ịbụ onye a kpapụrụ iche? (Fil. 2:4) N’ihi gịnị ka ị na-aghaghị iji dị njikere ime ka àgwà gị ka mma, ònye pụkwara inyere gị aka ime nke ahụ? Gịnị ga-emeghe ohere maka inwetakwu ndị enyi, oleekwa ebe a pụrụ ịhụ ha?—2 Kọr. 6:13.

4 Iso Chineke Bụrụ Enyi: Olee otú ị pụrụ isi soro Jehova na-enwe mmekọrịta, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị mgbalị a ga-etinye? (Ọma 34:8) Ònye pụrụ ime n’ụzọ kasị mma ka ọbụbụenyi gị na Chineke sikwuo ike?

5 Ụdị Enyi Ndị Na-ezighị Ezi: Olee ndị bụ́ ajọ ndị enyi? (1 Kọr. 15:33) Olee otú ajọ ndị enyi pụrụ isi duga mmadụ ná mbibi n’ụzọ ime mmụọ? Gịnị ka ihe ndekọ Bible banyere Daịna na-akụziri gị?—Jen. 34:1, 2, 7, 19.

6 Ihe Nkiri nke Oge A: Olee otú owu ọmụma si metụta Tara? Olee otú o si kọwaa na mkpakọrịta ya na ndị ntorobịa ụwa na-enwe ziri ezi? Olee ihe ize ndụ ndị ha tinyere ya na ha? N’ihi gịnị ka ndị mụrụ ya na-ejighị hụ ihe ize ndụ ọ nọ na ya, ma àgwà dị aṅaa ka ha ji nyere ya aka inwetaghachi onwe ya n’ụzọ ime mmụọ? Olee otú otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ si gosipụta na ya bụ ezi enyi nye Tara? N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst na-aghaghị iji ṅaa Ilu 13:20 na Jeremaịa 17:9 ntị? Ihe dị aṅaa dị mkpa ka Tara mụtara?

7 Mmechi: Ihe ndị dị aṅaa ka ị mụtaworo na vidio a? Olee otú ị pụrụ isi jiri ya mee ihe n’inyere ndị ọzọ aka?—Ọma 71:17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya