Vidio Ọ Dị Mkpa Ka E Chebara Echiche nke Ọma
“Vidio a na-eme ka mmadụ chebara onwe ya echiche n’ezie!”
“O ruru m nnọọ n’obi!”
“O metụrụ m nnọọ n’ahụ́!”
1 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị mgbe mbụ i kirisịrị vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Afọ ole na ole gara aga, ihe nọ na-esiri nnọọ otu nwanna nwoke na-eto eto ike, n’ihi ụdị ndị enyi ọ họọrọ. Ha mere ka ọ kwụsị inwe mmasị n’eziokwu ahụ, ya na Jehova akwụsịkwa ịdị ná mma. Ka e mesịrị, e wepụtara vidio Real Friends. Nwanna nwoke ahụ dere, sị: “Ka m kiriri vidio ahụ ugboro ugboro, anya mmiri bịara nnọọ na-agba m. Ekelere m Jehova maka enyemaka ahụ bịara n’oge ya.” Vidio ahụ mere ka ọ gbanwee ụzọ ndụ ya ma nwezie ezi ndị enyi. O kwukwara, sị: “O doro anya na unu maara nnọọ nsogbu ndị na-eto eto na-enwe.” Ndị nne na nna na ndị na-eto eto, gịnị ma unu kirighachi vidio ahụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ọzọ unu ga-enwe? Otú unu ga-esi eme ya bụ, unu kirichaa nkebi nke ọ bụla, unu akwụsịtụ vidio ahụ, mgbe ahụzi, unu ejiri obi ọcha zaa ajụjụ ndị dị na paragraf ndị na-esonụ n’ezoghị ọnụ.
2 Okwu Mmalite: Olee otú e si ama ezigbo enyi?—Ilu 18:24.
3 Ihe Ndị Na-eme Ka Mmadụ Ghara Imete Enyi: Olee ihe i nwere ike ime ka o wee ghara ịdị gị ka ị bụ onye a jụrụ ajụ? (Fil. 2:4) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa na ị ghaghị ịdị njikere imeziwanye àgwà gị, onyekwa pụrụ inyere gị aka ime nke a? Gịnị ga-eme ka i nwekwuo ohere imetekwu ndị enyi, ebeekwa ka ị pụrụ ịhụ ndị ị ga-emete enyi?—2 Kọr. 6:13.
4 Iso Chineke Bụrụ Enyi: Olee otú ị pụrụ isi soro Jehova nwekwuo mmekọrịta chiri anya, oleekwa ihe mere nke a ji kwesị mgbalị ọ bụla i mere maka ya? (Ọma 34:8) Olee onye ga-akasị eme ka enyi gị na Chineke sikwuo ike?
5 Ndị Enyi Ọjọọ: Olee ndị bụ́ ndị enyi ọjọọ? (1 Kọr. 15:33) Olee otú inwe ndị enyi ọjọọ pụrụ isi mebie mmekọrịta mmadụ na Chineke? Olee ihe ị mụtara site n’ihe Bible kọrọ banyere Daịna?—Jen. 34:1, 2, 7, 19.
6 Ihe Nkiri nke Oge Anyị A: Olee otú owu ọmụma si metụta Tara? Olee ihe o kwuru iji mee ka o yie ka o nweghị ihe ọjọọ dị ná mkpakọrịta nke ya na ndị na-eto eto bụ́ ndị ụwa? Olee ihe ize ndụ ndị ha mere ka ọ daba na ya? Gịnị mere na ndị mụrụ ya amataghị ihe ize ndụ ahụ ọ nọ na ya, ma oleezi otú ha siri kpasoo ya àgwà, nke mere ka ọ gbakee n’ụzọ ime mmụọ? Olee otú otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ si gosi na ya bụ ezigbo enyi Tara? Gịnị mere Ndị Kraịst na-aghaghị iji gbasoo ihe e dere n’Ilu 13:20 na Jeremaịa 17:9? Olee ezigbo ihe Tara mụtara?
7 Okwu Mmechi: Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a? Olee otú ị pụrụ isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?—Ọma 71:17.