Igbe Ajụjụ
◼ Ọ̀ dị mma itinye ihe nile a ga-atụle n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’otu akwụkwọ, ma kesaara ya ndị ọzọ?
Ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ mee ya maka ndị ezinụlọ ya na ụfọdụ ndị enyi ya. Otú ọ dị, e kwesịghị ime ya ma kesaara ya ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụ ree ya eree, n’ihi na nke ahụ ga-abụ imebi iwu metụtara ibipụta akwụkwọ.—Rom 13:1.
Ihe omume ụfọdụ a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enwe nanị isiokwu; a naghị ede ebe a ga-esi nweta ihe a ga-ekwu. Ọ̀ bara uru mmadụ idepụtasị ebe ndị e nwere ike isi nweta ihe omume ahụ ma ọ bụkwanụ weta ihe ọmụma ndị dị n’ebe ndị ahụ ma jikọta ha ọnụ, ka ndị e nyere ihe omume ndị ahụ jiri ha mee ihe? Mba. Ọ gaghịkwa ekwesị ekwesị idepụtara ndị ọzọ azịza nke ajụjụ ndị dị ná Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, n’ihi na nke a ga-eme ka ha ghara iburu isi ihe ndị dị mkpa n’uche. Ụmụ akwụkwọ kwesịrị imere onwe ha nchọnchọ. Nke a bụ otu ụzọ dị mkpa Jehova si eji ụlọ akwụkwọ ahụ azụ anyị ka anyị wee nwee ike iji “ire nke ndị mmụta” na-ekwu okwu.—Aịsa. 50:4.