Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
1 Onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ onye okenye n’ụzọ ime mmụọ nke na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe, onye kwesịkwara inweta nsọpụrụ na nkwado anyị. (1 Tim. 5:17) Gịnị bụ ọrụ ya?
2 Ọ bụ ya na-elekọta ọ́bá akwụkwọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke dị n’Ụlọ Nzụkọ Alaeze. Ọ na-enwe mmasị dị omimi n’ịgba mmadụ nile ruru eru ume idenye aha ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ na-ahụ na e nwere ihe ndekọ ziri ezi ka e wee na-ekenye ihe omume n’usoro ma ọ dịkarịa ala izu atọ tupu oge ụlọ akwụkwọ nke ọ bụla. Ọ dị ya mkpa ịmata ọgbakọ nke ọma, na-eburu onye mmụta nke ọ bụla na ikike ya n’uche. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ inwe nwanna nwoke ọzọ ga na-enyere ya aka n’ịkwadebe usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ, ikenye ihe omume nke ọma na-achọ ka onye nlekọta ahụ na-eleru ya anya n’onwe ya.
3 Iji zie ihe n’ụzọ dị irè n’ụlọ akwụkwọ ahụ, onye nlekọta ahụ aghaghị ịkwado nke ọma kwa izu, na-amụ ihe ọmụmụ ahụ e kenyere nke ọma. Nke a na-eme ka o nwee ike ime ka ọgbakọ nọgide na-enwe mmasị dị ukwuu n’usoro ihe omume ahụ, ịmata ma à tụlezuru ihe ọmụmụ ahụ n’ụzọ ziri ezi, na ime ka isi ihe ndị dị mkpa pụta ìhè bụ́ ndị ga-eso ná ntụleghachi odide.
4 Mgbe onye mmụta ọ bụla kwusịrị okwu ya, onye nlekọta ga-aja onye mmụta ahụ mma ma kọwaa ihe mere otú ọdịdị okwu ji dị mma ma ọ bụ ihe mere o ji dị mkpa ka e meziwanye ya. Mgbe ọ dị mkpa ka a kụzikwuoro onye ọ bụla ihe iji na-akwadebe ihe omume ya n’ụlọ akwụkwọ, onye nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara pụrụ inyere onye ahụ aka.
5 Iji rite uru zuru ezu site n’ịrụsi ọrụ ike nke onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na ndị ndụmọdụ ọzọ ọ bụla na-eje ozi n’okpuru nduzi ya, anyị kwesịrị ịdị na-agachi ụlọ akwụkwọ ahụ anya. Anyị kwesịkwara imezu ihe omume anyị nile ma tinye ndụmọdụ anyị na-enweta nakwa ndị e nyere ndị mmụta ndị ọzọ n’ọrụ. N’ụzọ dị otú a, anyị ga na-eme ka ikike anyị nwere izi ozi Alaeze ahụ n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-adịwanye mma n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu.—Ọrụ 20:20; 1 Tim. 4:13, 15.