Bụrụ Onye Na-ekwurịta Okwu!
1 Iji rụzuo ọrụ anyị nke bụ́ ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ, anyị aghaghị ime ka ndị ọzọ nweta ihe ọmụma. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Nkwurịta okwu pụrụ ịbụ ihe siri ike ọbụna n’etiti ndị bụ́ enyi. Gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe ike izi ndị anyị na-amabughị ozi ọma ahụ?
2 Site n’Ịbụ Onye A Na-amabughị Gaa n’Ịbụ Enyi: Gbalịa itinye onwe gị n’ọnọdụ ndị ahụ ị na-ejekwuru n’ozi. N’ụwa nke oge a, a pụrụ ịghọta ihe mere ụfọdụ ndị pụrụ iji na-enyo onye ha na-amabughị enyo, ma ọ bụ ọbụna na-atụ ya ụjọ. Nke a pụrụ igbochi nkwurịta okwu. Olee otú ị pụrụ isi merie egwu mbụ ahụ ndị ị na-ezute na-enwe? Tupu anyị ekwuo ihe ọ bụla, otu ụzọ anyị si ekwurịta okwu bụ site n’ọdịdị anyị kwesịrị ekwesị. Uwe anyị a haziri nke ọma na otú anyị si nọrọ n’ụzọ nkwanye ùgwù na-enye aka ebelata ụjọ ahụ.—1 Tim. 2:9, 10.
3 Ihe ọzọ na-enye aka ná nkwurịta okwu bụ inwe ahụ́ iru ala na omume enyi. Nke a na-eme ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala ma na-eme ka ha nwekwuo ọchịchọ ịṅa ntị. Ime ezi nkwadebe dị mkpa na nke a. Mgbe ihe anyị gaje ikwu doro anyị anya n’ezie, ọ na-ebelata ahụ́ ịma anyị jijiji . Anyị inwe ọnọdụ uche a dị jụụ pụkwara ime ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ozi anyị. Otu nwanyị kwuru nke a banyere nleta nke otu Onyeàmà, sị: “Ihe m na-echeta banyere ihu ọchị ya bụ udo. Ọ kpaliri mmasị m.” Nke a mere ka nwanyị ahụ gee ntị n’ozi ọma ahụ.
4 Àgwà Ndị Na-eme Ka E Nwee Mmasị: Ọ dị anyị mkpa inwe ezi mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ. (Fil. 2:4) Otu ụzọ isi mee nke a bụ ekweghị ka ọ bụrụ nanị gị na-ekwu okwu ná mkparịta ụka ahụ. E kwuwerị, mkparịta ụka na-agụnyekwa ige ntị. Mgbe anyị gwara ndị na-ege anyị ntị ka ha kwuo echiche ha ma jiri mmasị gee ntị n’ihe ha na-ekwu, ha na-enwe mmetụta na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’ahụ́. N’ihi ya, mgbe ndị na-ege gị ntị na-ekwu okwu, ya adịla gị ọkụ ọkụ ịlaghachi n’ụzọ iche ihe n’ihu ị kwadebeworo. Jaa ha mma ma ọ bụrụ na ị pụrụ iji ezi obi mee otú ahụ, ma gbalịa ịdabere n’ihe ha kwuru wee kwuo okwu. Ọ bụrụ na ihe ndị ha kwuru na-ekpughe ihe ndị dị ha n’obi, mee ka ozi gị lebara nchegbu ha anya.
5 Iwetu onwe onye ala na ịdị umeala n’obi na-eme ka nkwurịta okwu na-aga nke ọma. (Ilu 11:2; Ọrụ 20:19) A dọtara ndị mmadụ n’ebe Jizọs nọ n’ihi na o nwere ‘obi dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.’ (Mat. 11:29) N’aka nke ọzọ, inwe àgwà nke ịdị mkpa karịa onye ị na-agwa okwu na-eme ka ndị mmadụ na-agbara gị ọsọ. N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị kwenyesiri ike na anyị nwere eziokwu ahụ, anyị na-eji amamihe ezere iji ikwesi olu ike na-ekwu okwu.
6 Gịnị ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ kwuru egosipụta na o nwere nkwenkwe ndị na-ekwekọghị n’ihe Bible na-akụzi? Ọ̀ bụ iwu na anyị ga-agbazi ya? Ee, ka oge na-aga, ma ọ dịghị mkpa na anyị ga-agbalị ime otú ahụ ná nleta mbụ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-aba uru ibu ụzọ kwuo okwu n’ihe ndị anyị na onye na-ege anyị ntị kwekọrịtara na ha tupu anyị esoro ya kerịta ozizi Bible ndị pụrụ isiri ya ike ịnakwere. Nke a na-achọ ndidi na akọ. Pọl setịpụrụ ezi ihe nlereanya na nke a mgbe ọ na-agbara ndị ọkàikpe nke Ariopagọs àmà.—Ọrụ 17:18, 22-31.
7 Karịsịa, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị dị irè n’inwe nkwurịta okwu. Dị ka Jizọs, anyị aghaghị imere ndị ‘a gbara akpụkpọ, chụsasịakwa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’ ebere. (Mat. 9:36) Nke a na-akpali anyị iwegara ha ozi ọma ahụ na inyere ha aka ịbata n’ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ. Ozi anyị bụ ozi ịhụnanya, ya mere, ka anyị nọgide na-ekwusa ya n’ụzọ ịhụnanya. Site n’ime otú ahụ, anyị na-eṅomi Jehova Chineke na Jizọs Kraịst—Ndị kasị enwe nkwurịta okwu n’eluigwe na ala.