Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị bụ uru ndị dị n’ịnọ n’ọgbakọ nwe ókèala ebe anyị bi?
Site ná ndokwa ọgbakọ, anyị na-enweta agbamume nke ‘na-akpali anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:24, 25) Site n’ọgbakọ, anyị na-amụta eziokwu ma bụrụ ndị a kwadebere ịrụzu ọrụ anyị nke bụ́ ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) A na-agbakwa anyị ume ijiri ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọnwụnwa, anyị nwekwara ndị nlekọta na-ahụ n’anya iji nyere anyị aka ịnagide nrụgide na nchegbu ndị na-ebuwanye ibu. N’ụzọ doro anya, ọgbakọ dị oké mkpa maka anyị ịnọgide na-adị ndụ n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, è nwere uru ndị dị n’ịnọ n’ọgbakọ nwe ókèala ebe anyị bi?
Ọnọdụ ndị mmadụ dịgasị iche iche, ma ihe ndị dị ka ọrụ ego, onye òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe, na ime njem pụkwara inwe mmetụta ná mkpebi mmadụ ga-eme n’ikpeazụ n’okwu a. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere uru ime mmụọ na uru ndị ọzọ doro nnọọ anya ndị a na-enweta mgbe mmadụ na-esonyere ọgbakọ nwe ókèala ebe o bi. Ndị okenye ga-enwe ike ịkpọtụrụ ndị nkwusa nile ngwa ngwa mgbe e nwere ọnọdụ mberede. Igbe Ajụjụ ndị e bipụtara n’oge ndị gara aga akọwapụtawo ọtụtụ abamuru ndị ọzọ dị na ya.—June 1991, August 1976, na January 1968 (Bekee).
Dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-aka nnọọ mfe ije nzukọ n’ebe dị anyị nso, na-eme ka anyị nwee ike ịbịarute n’ezi oge iji soro ndị ọzọ kwurịta okwu, meekwa ihe ndị dị mkpa, ma kere òkè n’abụ na ekpere mmeghe. Mgbe e nwere ndị ọhụrụ nwere mmasị, ndị bi gburugburu ebe anyị bi, ọ na-adịrị anyị mfe karị ịkpọtụrụ ha, iduziri ha ọmụmụ Bible, na ịkpọrọ ha gaa nzukọ ndị ga-adịrị ha mfe karịsịa.
Anyị nwere obi ike na ndị isi ezinụlọ ga-eji ekpere chebara okwu a echiche, jiri nnọọ nlezianya tụlee ihe nile dị n’okwu ahụ mgbe ha na-ekpebi ihe kachasị mma maka ọdịmma ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke ezinụlọ ha.—1 Tim. 5:8.