Ṅomie Ịdị Mma Jehova
1 Mgbe anyị kirisịrị ịma mma nke anwụ ọdịda ma ọ bụ mgbe anyị risịrị nri tọrọ ụtọ, ọ̀ bụ na ọ dịghị akpali anyị ikele Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ịdị mma nile? Ịdị mma ya na-akpali anyị iṅomi ya. (Ọma 119:66, 68; Efe. 5:1) Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta àgwà nke ịdị mma?
2 N’ebe Ndị Na-ekweghị Ekwe Nọ: Otu ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie ịdị mma Jehova bụ site n’inwe ezi nchegbu n’ebe ndị na-abụghị ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ. (Gal. 6:10) Igosipụta ịdị mma n’ụzọ ndị bara uru pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ụzọ ha si ele Ndịàmà Jehova na ozi anyị na-ezi anya.
3 Dị ka ihe atụ, ka otu nwanna nwoke na-eto eto nke bụ́ onye ọsụ ụzọ nọ na-echere ịhụ dọkịta n’otu ụlọ ọgwụ, ọ nọdewere otu agadi nwanyị bụ́ onye yiri ka ọ̀ na-arịasi ọrịa ike karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ ebe ahụ. Mgbe o ruuru ya ịhụ dọkịta, o kwere ka nwanyị ahụ were ọnọdụ ya. Ya na ya mesịrị zute ọzọ, na nke ugbu a ọ bụ n’ọmà ahịa, obi tọkwara nwanyị ahụ ụtọ nke ukwuu ịhụ ya. Ọ bụ ezie na ọ dịghị anabatabu ozi ọma ahụ, o kwuru na ya amatawo ugbu a na Ndịàmà Jehova hụrụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie. A malitere ịmụrụ ya Bible n’ụzọ chiri anya.
4 N’ebe Ụmụnna Anyị Nọ: Anyị na-eṅomikwa ịdị mma Jehova mgbe anyị na-agbasi mbọ ike inyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka. N’oge e nwere ọdachi, anyị na-eso ná ndị mbụ na-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Anyị na-egosipụta otu àgwà a mgbe anyị na-enyere ndị ọ dị mkpa ka e buga ná nzukọ aka, na-eleta ndị ahụ́ na-adịghị, na-emekwa ka ịhụnanya anyị gbasapụruo n’ebe ndị anyị na-amachaghị nke ọma n’ọgbakọ nọ.—2 Kọr. 6:11-13; Hib. 13:16.
5 Ụzọ ọzọ Jehova si egosipụta ịdị mma bụ ná njikere ọ na-adị ‘ịgbaghara mmehie.’ (Ọma 86:5) N’iṅomi ya, anyị pụrụ igosipụta na àgwà nke ịdị mma na-amasị anyị site n’ịdị na-agbaghara ndị ọzọ. (Efe. 4:32) Nke a na-enye aka eme ka mkpakọrịta anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị ‘dị mma ma dị ụtọ.’—Ọma 133:1-3.
6 Ka ịdị mma bara ụba nke Jehova mee ka anyị na-enye ya otuto n’ụba ma jupụta n’ọṅụ. Ka ọ kpaliekwa anyị ịgbalịsi ike iṅomi ịdị mma ya n’ihe nile anyị na-eme.—Ọma 145:7; Jer. 31:12.