Ịja Mma Na-enye Ume Ọhụrụ
1 “Ọ̀ bụ na emeghị m nke ọma taa?” ka nwatakịrị nwanyị ahụ ji olu ákwá kwuo n’oge ọ chọrọ ịlakpu ụra. Ajụjụ ahụ tụrụ nne ya n’anya. N’agbanyeghị na ọ chọpụtara otú obere nwa ya nwanyị siworo gbalịsie ike ịkpa ezi àgwà n’ụbọchị ahụ, ọ jaghị ya mma ọbụna otu ugbo. Anya mmiri nwatakịrị nwanyị ahụ kwesịrị ichetara anyị na anyị nile—ma nwata ma okenye—chọrọ ịja mma. Ànyị na-eme ka ndị nọ anyị gburugburu nwee ume ọhụrụ site n’ịja ha mma maka ihe ha meziri emezi?—Ilu 25:11.
2 E nwere ọtụtụ ihe ndị mere anyị ga-eji na-aja Ndị Kraịst ibe anyị mma. Ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike iji rụzuo ọrụ ha. (1 Tim. 4:10; 5:17) Ndị nne na nna bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke na-anwa ike ha iji zụlite ụmụ ha n’ụzọ Jehova. (Efe. 6:4) Ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-agbalịsi ike iji guzogide “mmụọ nke ụwa.” (1 Kọr. 2:12; Efe. 2:1-3) Ndị ọzọ na-eji ikwesị ntụkwasị obi efe Jehova n’agbanyeghị nká, nsogbu ahụ́ ike, ma ọ bụ ule ndị ọzọ. (2 Kọr. 12:7) Ndị nile dị otú ahụ kwesịrị ịja mma. Ànyị na-egosi na anyị na-ahụ mgbalị kwesịrị otuto ndị ha na-eme?
3 Na-aja Mmadụ Mma Ma Na-akpọ Okwu Aha: N’ezie, ọ na-amasị anyị nile ịnụ ka a na-aja ọgbakọ mma n’ikpo okwu. Otú ọ dị, ịja mma na-enye ume ọhụrụ ọbụna karị mgbe a bịakwutere mmadụ ma jaa ya mma. Dị ka ihe atụ, n’isi nke 16 nke akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl jara Fibi, Priska na Akwila, Traịfina na Traịfosa, na Pesis, nakwa ndị ọzọ mma kpọmkwem maka ihe ndị ha mere. (Rom 16:1-4, 12) Lee ka okwu ya na-aghaghị isiwo bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ nye ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi! Ịja mma ndị dị otú ahụ na-emesi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị obi ike na ha dị mkpa, ọ na-adọtakwa anyị nso n’ebe ibe anyị nọ. Ọ̀ dịwo onye ị jara mma kpọmkwem maka ihe o mere na nso nso a?—Efe. 4:29.
4 Ịja Mma Sitere n’Obi: Iji bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ, ịja mma aghaghị ịbụ nke e ji ezi obi nye. Ndị mmadụ pụrụ ịma ma ihe anyị na-ekwu ò sitere anyị n’obi ka ànyị ‘na-ekwu okwu ire ụtọ efu.’ (Ilu 28:23) Ka anyị na-azụ onwe anyị ịhụta ebe ndị ọzọ na-emezi emezi, obi anyị ga-akpali anyị ịja ha mma. Ka anyị jiri ezi obi na-aja ndị mmadụ mma mgbe nile, ebe anyị maara na ‘okwu e kwuru na mgbe ya dị mma nke ukwuu!’—Ilu 15:23.