Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/03 p. 4
  • Isoro Jehova Na-akpachi Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isoro Jehova Na-akpachi Anya
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Bịaruonụ Chineke Nso”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Soro Jehova Na-akpachi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gị na Jehova Ùnu Dị ná Mma n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 11/03 p. 4

Isoro Jehova Na-akpachi Anya

1. Gịnị ka otu nwanna nwanyị bịara ghọta banyere usoro ihe omume ya n’ụzọ ime mmụọ?

1 “Anọwo m n’eziokwu ruo afọ 20 ma ọ bụ ihe yiri ya, ma nanị ihe m na-eme agwụla ịga nzukọ na ịga ozi ubi,” ka otu nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst kwetara. Otú ọ dị, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Amatawo m ugbu a na ọ bụ ezie na ihe ndị a dị mkpa, nanị ha apụghị ịkwagide m mgbe ihe malitere siwe ike. . . . Aghọtara m ugbu a na aghaghị m idozigharị echiche m ma malite usoro ọmụmụ ihe bara uru ka m wee nwee ike ịmara Jehova n’ezie, hụkwa ya n’anya ma nwee ekele maka ihe Ọkpara ya nyeworo anyị.”

2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa isoro Jehova na-akpachi anya?

2 Mmadụ isoro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya na-achọ mgbalị. Ọ na-achọ ihe karịrị nanị ịgbaso usoro ihe omume nke Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị aghara iso Jehova na-enwe nkwurịta okwu n’ụzọ chiri anya, ka oge na-aga, Ọ pụrụ ịdị anyị ka onye bụbu ezigbo enyi anyị nke anyị na-adịghịzi anụ ozi ya. (Mkpu. 2:4) Ka anyị tụlee otú ọmụmụ Bible onwe onye na ekpere pụrụ isi nyere anyị aka isoro Jehova na-akpachi anya.—Ọma 25:14.

3. Olee ụzọ anyị ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye iji nwee ike ịbịaru Chineke nso?

3 Ekpere na Ntụgharị Uche Dị Mkpa: Ọmụmụ ihe onwe onye nke na-aba n’obi na-agụnye ihe karịrị ịka ihe n’okpuru isi ihe ndị dị n’akwụkwọ anyị na-amụ na ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Ọ na-achọ anyị ịtụgharị uche n’ihe ihe ọmụma ahụ na-ekpughe banyere ụzọ Jehova, ụkpụrụ ya, na àgwà ya. (Ọpụ. 33:13) Ịghọta ihe ime mmụọ na-emetụ anyị n’obi ma na-akpali anyị ichebara ndụ anyị echiche. (Ọma 119:35, 111) E kwesịrị ịdị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye n’ebumnobi nke ịbịaru Jehova nso. (Jems 4:8) Ịmụ ihe nke ọma na-achọ oge nakwa ebe kwesịrị ekwesị, imụchi ihe anya na-achọkwa ọzụzụ. (Dan. 6:10) Ọ bụrụgodị na ị na-eji ọrụ n’aka mgbe dum, ị̀ na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji tụgharịa uche n’àgwà ndị dị ebube nke Jehova?—Ọma 119:147, 148; 143:5.

4. Olee otú ekpere anyị kpere mgbe anyị na-amalite ọmụmụ ihe onwe onye si enyere anyị aka iso Jehova na-akpachi anya?

4 Ekpere si n’ala ala obi bụ akụkụ dị mkpa nke ọmụmụ ihe onwe onye nke nwere nzube. Ka eziokwu Bible wee ruo anyị n’obi ma kpalie anyị ‘ijere Chineke ozi dị nsọ site n’egwu Chineke na ụjọ,’ mmụọ nsọ Chineke dị anyị mkpa. (Hib. 12:28) Ya mere, anyị kwesịrị ịmalite ọmụmụ ihe nke ọ bụla site n’ịrịọ Jehova maka mmụọ ya. (Mat. 5:3) Ka anyị na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ma na-eji ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible bụ́ ndị nzukọ Jehova na-ewepụta eme ihe, anyị na-emeghere Jehova obi anyị. (Ọma 62:8) Isi otú a na-amụ ihe bụ ụdị ofufe nke anyị si na ya egosipụta nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova ma na-eme ka nkekọ anyị na ya sikwuo ike.—Jud 20, 21.

5. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị?

5 Dị ka ọ dị ná mmekọrịta nile, anyị aghaghị ịdị na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova na-aka mma mgbe nile iji mee ka anyị na ya nọgide na-akpachi anya ná ndụ anyị nile. Ya mere, ka anyị na-azụpụta oge kwa ụbọchị iji na-abịaru Chineke nso, na-amara na ya onwe ya ga-abịarukwa anyị nso.—Ọma 1:2, 3; Efe. 5:15, 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya