Gosipụta Ekele Gị
1 N’agbanyeghị na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi,’ anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-enye Jehova ekele. (2 Tim. 3:1) Nke kasịnụ n’ime ha bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa o nyere anyị nke bụ́ Ọkpara ya. (Jọn 3:16) Ọzọkwa, ka agụụ nọ na-egbu ndị nọ n’okpukpe ụgha n’ụzọ ime mmụọ, anyị na-eriju nri ime mmụọ afọ. (Aịsa. 65:13) Anyị so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, anyị nwekwara ihe ùgwù nke ikere òkè ná mmụba na-akpali akpali a na-enwe n’ezi ofufe. (Aịsa. 2:3, 4; 60:4-10, 22) Olee otú anyị pụrụ isi gosi Jehova ekele anyị maka ngọzi ndị ọ na-awụkwasị anyị?—Kọl. 3:15, 17.
2 Ozi E Ji Ọṅụ na Obi Nile Eje: Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere inye ihe onwunwe n’onyinye, o dere, sị: “Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.” (2 Kọr. 9:7) Ụkpụrụ a na-emetụtakwa ozi anyị na-ejere Chineke. Anyị na-egosipụta ekele anyị nwere site n’ịnụrụ eziokwu ahụ ọkụ n’obi, site n’ọṅụ anyị na-enwe ná nzukọ Ndị Kraịst, site n’ịnụ ọkụ n’obi anyị na-enwe n’ozi ubi, nakwa site n’obi ụtọ anyị na-enwe n’ime uche Chineke.—Ọma 107:21, 22; 119:14; 122:1; Rom 12:8, 11.
3 N’Izrel oge ochie, Iwu ahụ ekwughị kpọmkwem ókè ihe a ga-enye n’onyinye ụfọdụ ga-aharu. Onye nke ọ bụla na-efe ofufe pụrụ igosipụta ekele o nwere site n’inye onyinye ‘dị ka ngọzi Jehova si dị’ bụ́ nke o nwetaworo. (Deut. 16:16, 17) N’otu aka ahụ taa, obi ekele ga-akpali anyị imeru ókè ọnọdụ anyị kwere anyị mee n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. Ụfọdụ ndị ọrụ ma ọ bụ ndị na-aga akwụkwọ na-eji oge ezumike amụba oge ha na-etinye n’ozi ubi, ọbụna na-eji ya arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ị̀ pụrụ ịmụba ozi gị n’oge ndị ahụ?
4 Ijubiga Ókè n’Ekele: Otu ụzọ bụ́ isi anyị si egosipụta ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ bụ site n’ekpere. (1 Tes. 5:17, 18) Okwu Chineke na-agba anyị ume ịdị “na-ejubiga ókè n’okwukwe n’inye ekele.” (Kọl. 2:7) Ọbụna mgbe anyị ji nnọọ ọrụ n’aka ma ọ bụ na-enwe nrụgide, ekpere anyị na-ekpe kwa ụbọchị kwesịrị ịgụnye ekele. (Fil. 4:6) Ee, site n’ozi anyị nakwa n’ekpere anyị, ka anyị ‘na-ejupụta n’ọtụtụ okwu ekele nye Chineke.’—2 Kọr. 9:12.