Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi—Ọnụ Ụzọ Buru Ibu nke Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ
1 Site n’ọnụ onye amụma bụ́ Jeremaịa, Jehova buru amụma, sị: “M ga-emekwa ka ndị ọzụzụ atụrụ biliere [ndị m], ndị ga-azụ ha: ha agaghị atụkwa egwu ọzọ, ha agaghị atụkwa ụjọ, a gaghị elekwa anya otu efu n’ime ha na o furu efu.” (Jer. 23:4) A na-arụ ọrụ ọzụzụ atụrụ dị otú ahụ taa n’etiti ndị nke mba nile. Imerime ndị okenye ọgbakọ na-arụ ya. Tụkwasị na nke ahụ, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ okorobịa ndị dị nnọọ ka igirigi ewepụtawo onwe ha n’afọ ofufo ije ozi Jehova. (Ọma 110:3) Ụmụnna ndị a dị umeala n’obi bụụrụ nnọọ ọgbakọ nke ndị Chineke ngọzi! Ka ọrụ nchịkọbata ime mmụọ ahụ na-aga n’ihu, ọ ka dị mkpa ka ndị ikom ruru eru wepụta onwe ha ijere ụmụnna ha ozi.
2 Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi bụ ndokwa magburu onwe ya e mere iji na-azụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-ejighị nwanyị maka inwetakwu ibu ọrụ. Ihe karịrị ụmụ akwụkwọ puku 22 bụ́ ndị si ihe dị ka mba 140 enwetawo ọzụzụ a na klas 999 ndị e nweworo kemgbe e guzobere ụlọ akwụkwọ ahụ n’afọ 1987. Ụlọ akwụkwọ ahụ emegheworo ụmụnna ndị a “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.”—1 Kọr. 16:9.
3 Ihe E Ji Maka Ya Guzobe Ụlọ Akwụkwọ Ahụ: Ihe mere e ji guzobe Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi bụ iji zụọ ma kwadebe ndị ikom ruru eru maka ibu ibu ọrụ n’ebe ọ bụla a pụrụ inwe mkpa ná nzukọ a. Ụlọ akwụkwọ ahụ na-eme ka ha nwekwuo ike idu ndú n’ọrụ izisa ozi ọma, ikere òkè n’ịzụ ìgwè atụrụ ahụ, nakwa n’izi ihe n’ọgbakọ. Ha gụsịa akwụkwọ, a na-ekenye ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ. A na-ekenye ndị ọzọ ọrụ ije ozi n’ọgbakọ ha si bịa ma ọ bụ n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu n’ókèala alaka ha.
4 N’ime izu asatọ nke ihe ọmụmụ ahụ, ụmụ akwụkwọ na-amụ Bible n’ụzọ ka mie emi. Ha na-eji nlezianya atụle ọtụtụ ozizi Bible nakwa ọrụ ọzụzụ atụrụ na usoro ndị a na-agbaso n’idozi nsogbu ná ndụ Ndị Kraịst. Ha na-amụkwa ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi banyere ihe ndị metụtara nlekọta, ikpe, na nhazi, n’ọgbakọ. Ha na-enweta ọzụzụ pụrụ iche n’ikwu okwu n’ihu ọha, na-enwetakwa enyamaka iji mee ka ha too ngwa ngwa n’ụzọ ime mmụọ.
5 Ihe Ndị A Chọrọ: O kwere nghọta na ihe ndị a chọrọ iji gaa ụlọ akwụkwọ ahụ dị elu. Ndị na-etinye akwụkwọ maka ụlọ akwụkwọ ahụ aghaghị ijewo ozi dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi ruo ma ọ dịkarịa ala afọ abụọ ndị sochiri ibe ha. Ọ dịghị onye nke ga-eji nwanyị, ha ga-anọkwa n’agbata afọ ndụ 23 na 50. Ndị na-edejupụta akwụkwọ maka ụlọ akwụkwọ ahụ aghaghị ịbụ ndị nwere ike ịgụ ihe, ide ihe, na ikwu okwu n’ụzọ na-aga werewere n’asụsụ e ji eduzi ụlọ akwụkwọ ahụ, ha aghaghịkwa inwe ezi ahụ́ ike, n’abụghị ndị na-achọ nlekọta ma ọ bụ ihe oriri pụrụ iche. Ọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile ka a na-ahọrọkarị.
6 Ndị na-ewepụta onwe ha aghaghị ịdị njikere ma nweekwa ike ije ozi n’ebe ọ bụla a chọrọ ha. Nke a chọrọ àgwà dị ka nke onye amụma bụ́ Aịzaịa, bụ́ onye ji obi ya dum wepụta onwe ya ịrụ otu ọrụ pụrụ iche, na-asị: “Lee m; ziga m.” (Aịsa. 6:8) Ọ dịkwara umeala n’obi n’oge ndụ ya nile. Ndị na-ewepụta onwe ha maka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi aghaghị ịbụ ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe ụmụnna ha nọ na ọchịchọ ijere ha ozi kwaliri kama ịbụ ndị ọchịchọ nke ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ nke ịnọ n’ọnọdụ pụrụ iche kpaliri. Mgbe ha natasịrị ọzụzụ mara mma otú ahụ, a ga-atụ anya ka ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ jiri ihe ha mụtara mee ihe iji mee ka ndị ọzọ rite uru.—Luk 12:48.
7 Abamuru Ya: N’ime ọnwa asatọ ndị ahụ ha ji mụchie ihe anya, ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ na-abụ ndị ‘e ji okwu okwukwe na nke ezi ozizi ahụ zụọ.’ (1 Tim. 4:6) Nke a na-akwadebe ha inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nakwa na sekit e kenyere ha ọrụ na ya aka nakwa ịgba ha ume. N’ọtụtụ ebe e kenyeworo ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ọrụ na ha, ozi ubi amụbawo, a gbawo ndị mmadụ ume ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ, karịsịa ndị na-eto eto; e lebaworo ọtụtụ ndị ọhụrụ na-eso ndị Chineke akpakọrịta anya n’ụzọ ka ukwuu.
8 Ị̀ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nke na-alụbeghị nwunye, bụ́ onye nọ n’agbata afọ 23 na 50? Leenụ ma ị ga-edejupụta akwụkwọ maka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ị̀ bụ nwanna na-eto eto nke na-eche ihe mgbaru ọsọ na-adịte aka ị ga-esetịpụ n’ozi Jehova? Maranụ ma ị ga-eme ka ndụ gị dị mfe ma bụrụ nke na-enweghị ihe ndọpụ uche ka i wee nwee ike ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ a buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.’ Ọ pụrụ iwetara gị ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu. N’ezie, Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi abụwo ngọzi nye, ọ bụghị nanị ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ kamakwa nye ọgbakọ ndị Chineke n’ụwa nile.
Igbe dị na peeji nke 3]
Uru Ndị Ha Ritere n’Ọzụzụ Ahụ
“N’ezie, ọzụzụ ahụ emewo ka ozi m ka mma, meekwa ka m nwekwuo nkà n’iji amamihe na-azụ atụrụ, na-eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe.”
“Ụlọ akwụkwọ ahụ emewo ka m nwee nnọọ obi ike n’ịrụ ọrụ ndị m nwere n’ọgbakọ.”
“Ọ gbanwewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ m, gụnyere otú m si ele ọchịchị na nzukọ Chineke anya.”
“Ọzụzụ m nwetara nyeere m aka ịghọta mkpa ọ dị iwepụta onwe m ije ozi n’ebe e nwere mkpa.”