A Chọrọ Enyemaka Gị
1 “Anyị na-ekele unu maka ihe nile unu na-emere anyị. N’ezie, ha na-abara anyị uru.” Okwu ahụ na-egosi obi ekele anyị na-enwe maka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ anyị. Ka nzukọ Chineke nọgidere na-eto, a nọgidewo na-achọ ụmụ nwoke ruru eru ka ha jee ozi n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị puku ọgbakọ e nwere n’ụwa nile. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e mere baptizim, a chọrọ enyemaka gị.
2 ‘Ịgbalị Iru Eru’: Olee otú ị ga-esi ruo eruo iji nwetakwuo ihe ùgwù ije ozi? (1 Tim. 3:1) N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ nile nke ndụ gị. (1 Tim. 4:12; Taị. 2:6-8; 1 Pita 5:3) Na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa ma na-enyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ. (2 Tim. 4:5) Na-enwe ezi mmasị n’ọdịmma nke ndị kwere ekwe ibe gị. (Rom 12:13) Na-amụchi Okwu Chineke anya, na-azụlitekwa “nkà izi ihe.” (Taị. 1:9; 1 Tim. 4:13) Jiri ịdị uchu na-arụ ọrụ ndị okenye nyere gị. (1 Tim. 3:10) Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, ‘na-elekọta ezinụlọ gị n’ụzọ dị mma.’—1 Tim. 3:4, 5, 12.
3 Ije ozi dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi chọrọ na ị ga na-arụsi ọrụ ike ma na-enwe mmụọ nke ịchụ onwe gị n’àjà. (1 Tim. 5:17) N’ihi ya, iji ruo eruo, lekwasị anya n’iji obi umeala ejere ndị ọzọ ozi. (Mat. 20:25-28; Jọn 13:3-5, 12-17) Tụgharịa uche n’ọchịchọ obi Timoti nwere, ma gbalịa iṅomi ya. (Fil. 2:20-22) Dị ka Timoti mere, mee ka àgwà ọma gị gbaara gị àmà na i ruru eru. (Ọrụ 16:1, 2) Ka ị na-azụlite àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ gị n’aka iji ruo eru ibu ibu ọrụ ndị a ga-enyekwu gị ma na-etinye ndụmọdụ ọ bụla e nyere gị iji mekwuo nke ọma n’ọrụ, “ọganihu gị [ga-apụta] ìhè nye mmadụ nile.”—1 Tim. 4:15.
4 Ndị Mụrụ Ụmụ, Zụọnụ Ụmụ Unu Inye Aka: Ụmụaka pụrụ ịmalite ịmụta otú e si enye aka mgbe ha ka dị obere. Zụọ ha ige ntị ná nzukọ, izi ozi ọma, na ịkpa àgwà kwesịrị nṅomi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ụlọ akwụkwọ. Kụziere ha inwe mmụọ nke ijere ndị ọzọ ozi, ịrụ ọrụ ndị dị ka inye aka n’idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, inyere ndị agadi aka, na ihe ndị ọzọ. Kwe ka ha nweta obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe. (Ọrụ 20:35) Ọzụzụ dị otú ahụ pụrụ inyere ha aka ịghọ ndị ọsụ ụzọ, ndị ohu na-eje ozi, na ndị okenye n’ọdịnihu.