Ịgbara Ndị Ikwu Àmà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
1. N’ihi gịnị ka nghọta ji dị mkpa mgbe anyị na-agbara ndị ikwu anyị àmà?
1 Ọ̀ dị ihe ga-enye anyị ọṅụ karịa isoro ndị anyị hụrụ n’anya banye n’ụwa ọhụrụ, na-efekọ Jehova ofufe? Site n’ịgbara ndị ikwu anyị àmà, atụmanya a na-enye obi ụtọ pụrụ imezu. Otú ọ dị, ọ chọrọ nghọta iji mee nke ahụ n’ụzọ na-ewuli elu. Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Ndị na-akpali ndị ikwu ha ịchọ ịmatakwu ihe site n’ịgbara ha àmà nke nta nke nta, na-arụpụta ihe kasị mma.” Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
2. Olee otú inwe ezi mmasị n’ebe ndị ikwu anyị nọ pụrụ isi nyere anyị aka ime ka ha chọọ ịmatakwu ihe?
2 Kpalie Ha Ịchọ Ịmatakwu Ihe: Chebara otú ị pụrụ isi kpalie mmasị ndị ikwu gị echiche nke ọma. (Ilu 15:28) Olee ihe ndị na-echegbu ha? Olee ihe ndị na-eche ha aka mgba? Ikekwe ị pụrụ igosi ha otu isiokwu ma ọ bụ hota otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-adọrọ mmasị, bụ́ nke na-ekwu banyere isiokwu na-amasị ha nke ukwuu. Ọ bụrụ na ndị ikwu gị ebighị nso, ikekwe ị pụrụ ime nke a site n’idegara ha akwụkwọ ozi ma ọ bụ ịkpọ ha na telifon. N’ejighị ihe ọmụma na-ebogbu ha, na-akụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ, na-elegakwara Jehova anya ime ka mkpụrụ ndị ahụ na-eto.—1 Kọr. 3:6.
3. Olee otú mmasị ndị ikwu anyị nwere n’ebe anyị nọ pụrụ isi meghee ohere maka ịgbara ha àmà?
3 Jizọs gwara otu nwoke nke ọ chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya, sị: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe nile Jehova mewooro gị nakwa ebere o meere gị.” (Mak 5:19) Chegodị otú nke ahụ na-aghaghị isiwo metụta ndị ikwu ya! Ọ bụ ezie na e nwere ike ị gaghị enwe ahụmahụ dị ịrịba ama otú ahụ, ma eleghị anya, ndị ikwu gị nwere mmasị n’ihe ndị ị na-eme nakwa n’ihe ndị ụmụ gị na-eme. Ikwu banyere ihe omume i mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, mgbakọ ị gara, nleta i letara Betel, ma ọ bụ otu ihe dị ịrịba ama i mere, pụrụ ime ka i nwee ohere ịgwakwu ha banyere Jehova na nzukọ ya.
4. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị izere mgbe anyị na-agbara ndị ikwu anyị àmà?
4 Jiri Nghọta Na-eme Ihe: Mgbe ị na-agbara ndị ikwu gị àmà, zere ịgwa ha ọtụtụ ihe n’otu mgbe. N’icheta mgbe ọ malitere ịmụ Bible, otu nwanna kwetara, sị: “N’oge ahụ, ana m eji ọtụtụ awa akọwara mama m ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla m mụtara na Bible, nke a na-akpatakarịkwa arụmụka, nke ka nke n’etiti mụ na papa m.” Ọbụna mgbe onye ikwu kwupụtara mmasị o nwere n’ozi Bible, zaghachi n’ụzọ ga-eme ka ọ chọọ ịmatakwu ihe. (Ilu 25:7) Na-egosipụta nkwanye ùgwù, obiọma, na ndidi mgbe nile, dị nnọọ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-agwa onye ị na-amaghị okwu n’ozi ubi.—Kọl. 4:6.
5. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị ikwu anyị adịghị ege ntị mgbe anyị na-agbara ha àmà?
5 N’otu oge, ndị ikwu Jizọs chere na uche ezukwaghị ya okè. (Mak 3:21) Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ha mesịrị ghọọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 1:14) Ọ bụrụ na mgbalị mbụ i mere ịgwa ndị ikwu gị banyere eziokwu ahụ arụpụtaghị ihe, adala mbà. Ọnọdụ na àgwà pụrụ ịgbanwe. Nọgide na-achọ ohere ọzọ ị ga-eji gwa ha banyere otu ihe nke pụrụ ime ka ha chọọ ịmatakwu ihe. Ị pụrụ inweta ọṅụ site n’inyere ha aka ịbata n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Mat. 7:13, 14.