Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/05 p. 3-5
  • Oge Ememe Ncheta—Oge Ịrụsikwu Ọrụ Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Ememe Ncheta—Oge Ịrụsikwu Ọrụ Ike
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?—Òkù Ọzọ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Usoro Ihe Omume Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 2/05 p. 3-5

Oge Ememe Ncheta—Oge Ịrụsikwu Ọrụ Ike

1. Mmetụta dị aṅaa ka ememe ndị e mere n’oge “a kara aka” nwere n’ahụ́ ndị Izrel na-atụ egwu Chineke?

1 N’oge ndị “a kara aka” n’afọ, ndị Izrel oge ochie mere ememe ndị Jehova hiwere. (Lev. 23:2) Iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ịdị mma nke Chineke ha wetaara ha ọṅụ dị ukwuu ma kpalie ha ịnụrụ ofufe dị ọcha ọkụ n’obi.—2 Ihe 30:21–31:2.

2, 3. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị rụsikwuo ọrụ ime mmụọ ike n’oge Ememe Ncheta a, oleekwa mgbe anyị ga-eme Ememe Ncheta ahụ?

2 N’oge a, anyị na-arụsikwu ọrụ Chineke nke anyị ji ọṅụ na-arụ ike n’oge Ememe Ncheta. Ọ bụ oge anyị ji atụgharị uche nke ukwuu n’onyinye na-enweghị atụ Jehova nyere anyị—Ọkpara ọ mụrụ nanị ya. (Jọn 3:16; 1 Pita 1:18, 19) Ka anyị na-atụgharị uche n’ịhụnanya Chineke na Ọkpara ya nwere n’ebe anyị nọ, anyị na-abụ ndị a kpaliri inye Jehova otuto na ịgbasi mbọ ike ime uche ya.—2 Kọr. 5:14, 15.

3 N’afọ a, a ga-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụbọchị Thursday, March 24, mgbe anyanwụ dasịrị. Olee otú anyị pụrụ isi jesikwuo ozi ọma ike n’ọnwa March, April, na May?

4, 5. (a) Olee ihe nyewooro ụfọdụ mmadụ aka izi ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu ozi ọma? (b) Olee ụzọ ị chọpụtara na ọ na-arụpụta ihe n’ógbè unu?

4 Ịgbara Ọnụ Ọgụgụ Ka Ukwuu Àmà: Mgbe ị na-eje ozi ubi, chọọ ụzọ ndị ị ga-esi gbaara ọtụtụ mmadụ àmà ruo ókè o kwere mee. Ị̀ pụrụ ime ndokwa ije ozi ụlọ n’ụlọ mgbe ndị mmadụ na-aka anọ n’ụlọ, dị ka ná mgbede ma ọ bụ n’anyasị? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ unu ije ozi ọma tupu a malite ọmụmụ ihe, onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ ime ndokwa ka e nwee nzukọ dị mkpirikpi maka ije ozi ubi iji jee ozi n’ókèala dị nso.

5 Ụzọ ọzọ ị ga-esi agbara ọtụtụ mmadụ àmà bụ site n’ịga n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Otu nwanna nwanyị nọ na Japan chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’agbanyeghị na ọ na-arụ ọrụ ego site n’ụtụtụ ruo mgbede. Otu okenye tụụrụ ya aro na tupu ya agaa ọrụ kwa ụbọchị, na ya gbaa àmà okporo ámá n’akụkụ otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Mgbe ọ kwụsịtụrụ ime ihere ma mụta idi ọchị ụfọdụ ndị njem ibe ya na-achị ya, o nwetara mmadụ iri anọ ọ na-ewegara magazin kwa ọnwa. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị njem ibe ya, ndị na-arụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, na ndị ụlọ ahịa ha dị nso n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ. Ná nkezi, o nyefere magazin 235 n’ọnwa. Site n’iji obere oge na-agwa ndị mmadụ okwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ọ bịara nwee ike ịmalite ọmụmụ Bible isii.

6. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi rụsikwuo ọrụ ime mmụọ ike?

6 Ohere Ndị E Nwere Iji Gbaa Àmà: Ọtụtụ ndị nkwusa na-aga akwụkwọ na-enwe oge ha na-emechi akwụkwọ n’afọ. Oge ndị a pụrụ ịbụ oge magburu onwe ha ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Tụkwasị na nke ahụ, ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst pụrụ ịrụsikwu ọrụ ike site n’ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya otú ụmụ akwụkwọ ibe gị si chọsie ike ịmata banyere ihe ndị i kweere. Gịnị ma i jiri oge unu ji na-amụ ihe na klas ma ọ bụ mgbe ị na-ede ihe odide klas gbaa àmà? Ndị ọzọ enwewo ike ime otú ahụ site n’iji vidio anyị mee ihe. Ụfọdụ amalitewo ịmụrụ ụmụ klas ha Bible ma nyere ha aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke ime nraranye na baptizim. Ihe ndị a bụ ụzọ magburu onwe ha isi “too aha Jehova.”—Ọma 148:12, 13.

7. (a) Olee otú otu nwanna nwoke si jiri ohere nke ịgbara ndị ọzọ àmà mee ihe n’ụzọ bara uru? (b) Ì nweela ahụmahụ yiri nke ahụ?

7 N’ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị, chọọ ohere ị ga-eji gwa ndị mmadụ banyere Chineke anyị dị ebube na nkwa ya ndị magburu onwe ha. Otu nwanna nwoke nke na-aba otu ụgbọ okporo ígwè kwa ụbọchị na-adị agbara ndị njem ibe ya àmà n’oge kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè na-eche ụgbọ, ọ na-agbara otu nwa okorobịa àmà kwa ụbọchị ruo ihe dị ka minit ise. N’ihi ya, nwa okorobịa ahụ na ndị enyi ya kwetara ka o duziwere ha ọmụmụ Bible. Ọ na-anọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ eduziri ha ọmụmụ Bible ka ụgbọ ahụ na-aga. Obere oge mgbe e mesịrị, otu agadi nwanyị nọworo na-ege mkparịta ụka ha bịakwutere nwanna nwoke ahụ ma rịọ ya ka o duziwere ya ọmụmụ Bible. Nwanna ahụ na-eduzikwara ya ọmụmụ ihe n’ụbọchị ndị ọ na-aba n’ụgbọ ahụ. N’ụzọ dị otú a, o duziworo mmadụ iri ọmụmụ ihe n’ime ụgbọ ahụ.

8. Olee ụzọ ndị meworo agadi na ndị na-arịa ọrịa pụrụ isi na-ezi ozi ọma iji nwee ike ịrụsikwu ọrụ ike n’ozi a?

8 Gịnị ma ọ bụrụ na ihe ị ga-emeli ebughị ibu n’ihi na ị bụ agadi ma ọ bụ na ị na-arịa ọrịa? A ka pụrụ inwe ụzọ ndị ị ga-esi nyekwuo Jehova otuto. Ị̀ nwaletụla iji telifon gbaa àmà? Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi mee ya, mee ka onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị mara. Ọ pụrụ ime ndokwa ka i soro ndị nkwusa na-agba ụdị àmà a rụkọọ ọrụ. Ọ bụrụ na i soro ha rụkọọ ọrụ, unu pụrụ ịmụta ihe n’aka ibe unu ma nyere ibe unu aka ịgba àmà nke ọma. A pụrụ ịchọta aro ndị magburu onwe ha a tụrụ banyere iji telifon agba àmà n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2001, peeji nke 5-6.

9. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka iru eru iso ọgbakọ na-aga ozi ọma?

9 Ịga Ememe Ncheta pụrụ ime ka ndị ọhụrụ nyekwuo Jehova otuto. Ị pụrụ inyere ha aka ime ka ụjọ ọ bụla ha na-atụ banyere ije ozi ọma kwụsị site n’ịkọrọ ha ahụmahụ ndị dị mma i nwere n’ozi ubi na iji nwayọọ nwayọọ na-enye ha ọzụzụ banyere otú ha ga-esi na-akọwa ozizi Bible ma na-eji Bible akwado ihe ndị ha kweere. (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Bible ekwuo na ya chọrọ ịmalite izi ozi ọma, mee ka onyeisi oche ndị nlekọta mara. Ọ ga-eme ndokwa ka e soro ya nwee nzukọ iji mara ma ò ruru eru iso ọgbakọ na-aga ozi ọma. Lee ka ọ ga-esi atọ Jehova ụtọ n’obi ịhụ ndị ọhụrụ ka ha na-akwado ya dị ka onye o ruuru ịbụ eze eluigwe na ala!—Ilu 27:11.

10. (a) Olee otú usoro ihe omume dị mma pụrụ isi nyere anyị aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? (b) Ì meliri ndokwa ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge Ememe Ncheta nke afọ gara aga? Olee otú i si mee ya?

10 Ị̀ Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka? E kwesịghị iji awa 50 a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka gwurie egwu. (Mat. 5:37) Nke a pụtara na ọ ga-adị mkpa ka i mee ndokwa ịhụ na ị na-arụta awa 12 n’ozi ubi kwa izu. Ọ̀ dị nke ọ bụla dabaara gị n’ime ihe atụ nke usoro oge a ga-agbaso iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka bụ́ nke dị na peeji nke 5? Ọ bụrụ na ọ dịghị, ị̀ pụrụ idokwa oge nke ga-adabara gị iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa March, April, ma ọ bụ May? Rịọ Jehova ka ọ gọzie mgbalị ị na-eme ijekwu ozi ọma.—Ilu 16:3.

11. Olee otú ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ isi kwadoo ndị ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

11 Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ga-akwado gị nke ọma ná mgbalị ị na-eme ịhụ na oge Ememe Ncheta a wetaara Jehova otuto n’ụzọ pụrụ iche. Ikekwe ọtụtụ n’ime ha ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ndị okenye ga-eme ndokwa ka e nwekwuo nzukọ ije ozi, dị ka ná mgbede, n’uhuruchi, nakwa ná ngwụsị izu, dị ka mkpa si dị. Iji chọpụta ebe na oge a ga-enwe nzukọ ndị a na onye ga-anọ ya iji duzie ha, ndị okenye pụrụ iso ndị meworo atụmatụ ịsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ka na-eche ime otú ahụ kwurịta banyere ya. Ndị okenye ga-agbalịsi ike ịhazi ndokwa ahụ ka e wee nwee ndị nkwusa ọzọ gị na ha ga-arụ n’ụbọchị nakwa n’oge i mere ndokwa ije ozi. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ịhazi ihe nke ọma ma rụpụta ihe magburu onwe ya.—Ilu 20:18.

12. Gịnị na-akpali anyị inye Jehova otuto mgbe nile?

12 Mee Ike Gị Nile: Ọ bụrụ na ọnọdụ gị agaghị ekwe gị rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, cheta na Jehova na-anabata mgbalị anyị na àjà ndị anyị na-achụ ‘dị ka ihe anyị nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe anyị na-enweghị si dị.’ (2 Kọr. 8:12) Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-ekele Jehova maka ha. E nwere ezigbo ihe mere Devid ji dee, sị: “M ga-agọzi Jehova na mgbe nile; mgbe nile ka otuto Ya ga-adị n’ọnụ m.” (Ọma 34:1) Ka anyị kpebisie ike ime otú ahụ n’oge Ememe Ncheta a.

Igbe dị na peeji nke 3]

Olee Otú Ị Ga-esi Rụsikwuo Ọrụ Ike?

◼ Mee nkwusa mgbe ndị mmadụ nọ n’ụlọ

◼ Na-agba àmà n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị

◼ Na-agba àmà n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ

◼ Jiri telifon na-agba àmà

◼ Rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka

[Chaatị dị na peeji nke 5]

Ihe Atụ nke Usoro Oge A Ga-agbaso Iji Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka—Usoro A Ga-agbaso Iji Na-enweta Awa 12 n’Ozi Ubi Kwa Izu

Ụtụtụ—Monday Ruo Saturday

Ị pụrụ iji ụbọchị Sunday gbanwere ụbọchị ọ bụla ọzọ.

Ụbọchị Oge Awa

Monday Ụtụtụ 2

Tuesday Ụtụtụ 2

Wednesday Ụtụtụ 2

Thursday Ụtụtụ 2

Friday Ụtụtụ 2

Saturday Ụtụtụ 2

Ngụkọta Awa: 12

Ụbọchị Abụọ Zuru Ezu

Ị pụrụ ịhọrọ ụbọchị abụọ masịrị gị n’izu (Dabere n’ụbọchị ndị ị họọrọ, ị pụrụ inweta nanị awa 48 n’ọnwa ma ị gbasoo usoro ihe omume a.)

Ụbọchị Oge Awa

Wednesday Site n’Ụtụtụ Ruo Ehihie 6

Saturday Site n’Ụtụtụ Ruo Ehihie 6

Ngụkọta Awa: 12

Uhuruchi Abụọ na Ngwụsị Izu

Ị pụrụ ịhọrọ uhuruchi abụọ masịrị gị n’etiti izu.

Ụbọchị Oge Awa

Monday Uhuruchi 1 1⁄2

Wednesday Uhuruchi 1 1⁄2

Saturday Site n’Ụtụtụ Ruo Ehihie 6

Sunday Ụtụtụ Ma Ọ Bụ Ehihie 3

Ngụkọta Awa: 12

Ehihie Atọ na Ụbọchị Saturday

Ị pụrụ iji ụbọchị Sunday gbanwere ụbọchị ọ bụla ọzọ.

Ụbọchị Oge Awa

Monday Ehihie 2

Wednesday Ehihie 2

Friday Ehihie 2

Saturday Site n’Ụtụtụ Ruo Ehihie 6

Ngụkọta Awa: 12

Usoro Oge M Ga-eji Na-aga Ozi

Kpebie awa ole ị ga na-enweta n’oge nke ọ bụla.

Ụbọchị Oge Awa

Monday

Tuesday

Wednesday

Thursday

Friday

Saturday

Sunday

Ngụkọta Awa: 12

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya