Ụgwọ Anyị Ji Ndị Ọzọ
1 Pọl onyeozi weere ya na iwu ji ya ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ọ maara na Jehova emewo ka o kwe omume ịzọpụta ụdị mmadụ nile site n’ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara Ya. (1 Tim. 2:3-6) N’ihi ya, Pọl kwuru, sị: “Eji m ma ndị Grik ma Ndị Ala Ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-amaghị ihe ụgwọ.” O ji ịnụ ọkụ n’obi rụsie ọrụ ike iji kwụọ ụgwọ o ji ụmụ mmadụ ibe ya site n’ikwusara ha ozi ọma.—Rom 1:14, 15.
2 Dị ka Pọl, Ndị Kraịst taa na-achọ iji ohere ọ bụla kwusaara ndị agbata obi ha ozi ọma. Ebe ọ bụ na “oké mkpagbu” ahụ na-eru nso n’ike n’ike, anyị kwesịrị ime ngwa ngwa ịchọ ndị nwere obi eziokwu. Ka ezigbo ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kpalie anyị ịrụsi ọrụ a na-azọpụta ndụ ike.—Mat. 24:21; Ezik. 33:8.
3 Ịkwụ Ụgwọ Anyị Ji: Ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ụzọ bụ́ isi anyị si eme ka ndị mmadụ nụ ozi ọma ahụ. N’ókèala ebe a na-adịghị enwetakarị ndị mmadụ n’ụlọ, inwe ezigbo ihe ndekọ na ịgaghachi n’oge dịgasị iche ga-eme ka anyị nwee ike inwetakwu ndị mmadụ. (1 Kọr. 10:33) Anyị pụkwara inweta ndị mmadụ site n’ịgba àmà n’ógbè azụmahịa, n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, n’ebe ọhaneze na-anọkarị na n’ebe a na-adọba ụgbọala, nakwa site n’iji telifon na-agba àmà. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m eme ike m nile iji na-ekere òkè n’ụzọ nile e si ezi ozi ọma iji nwee ike izi ndị mmadụ ozi nke ndụ ahụ?’—Mat. 10:11.
4 Otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ weere ya nnọọ dị ka ibu ọrụ ya ikwusara ndị nile bi n’ókèala ya ozi ọma. E nwere otu ụlọ ákwà mgbochi windo ya na-emechikarị emechi, nke ọ na-adịghị mgbe a na-enweta mmadụ na ya. Ma, otu ụbọchị mgbe onye ọsụ ụzọ a na-anọghị n’ozi, ọ hụrụ otu ụgbọala a dọbara n’ihu ụlọ a. Ebe ọ na-achọghị ka ohere a dapụtaranụ funahụ ya, ọ gara pịa mgbịrịgba ụlọ ahụ. Otu nwoke apụta, mkparịta ụka mbụ nwanna nwanyị a na nwoke a nwere mekwara ka ya na di ya gaa nletaghachi ọtụtụ ugboro n’ụlọ nwoke a. N’ikpeazụ, nwoke ahụ kweere ka e duziwere ya ọmụmụ Bible. Ọ bụkwa nwanna emere baptizim ugbu a. Obi dị ya ụtọ na nwanna nwanyị a mere ya ibu ọrụ ya ikwusara ndị ọzọ ozi ọma.
5 Ebe oge ji ọsọ na-aga, ugbu a bụ oge anyị kwesịrị iji kwụọ mmadụ ibe anyị ụgwọ anyị ji ha site n’ịgbasi mbọ ike n’ọrụ nkwusa ahụ.—2 Kọr. 6:1, 2.