Iji Ozi Ọma ahụ Gakwuru Ọtụtụ Mmadụ Dị Ka O Kwere Mee
1. Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere iji hụ na ha ji ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee?
1 Ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge mbụ gbasiri mbọ ike n’ịgbasa ozi ọma Alaeze ahụ. Ha mere ihe ndị kwesịrị ekwesị iji hụ na ha ji ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee. Ndị Kraịst so dee Bible ji ike mmụọ nsọ dee ihe odide ha n’asụsụ Grik nkịtị, bụ́ asụsụ a na-asụ n’ebe nile n’Alaeze Ukwu Rom. Tụkwasị na nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A. bụ ndị mbụ ji codex mee ihe, bụ́ nke dị mfe karịa akwụkwọ mpịakọta ma a bịa n’ịchọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ.
2, 3. (a) Olee otú Aịsaịa 60:16 si na-emezu n’oge a? (b) Olee otú e si jiri nkà na ụzụ na-eme ka ezi ofufe na-aga n’ihu?
2 Iji Nkà na Ụzụ Mee Ihe: Jehova site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma buo amụma, sị: “Ị ga-aṅụkwa mmiri ara nke mba dị iche iche.” (Aịsa. 60:16) Ná mmezu amụma a n’oge anyị a, ndị ohu Jehova ji ngwá ọrụ ndị bara uru si n’aka mba dị iche iche na-eme ka ọrụ nkwusa na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1914, ọtụtụ afọ tupu ihe nkiri sinima a na-anụ olu mmadụ na ha aghọọ ihe e ji akpata ego, Ndị Mmụta Bible malitere igosi “Photo-Drama of Creation.” E ji ihe nkiri a na-ewe awa asatọ, bụ́ nke bu ihe nkiri slide na ihe nkiri a na-emegharị ahụ́ na ya, nke nwekwara àgwà na ụda olu zuru ezu, gbaara ọtụtụ nde mmadụ àmà.
3 Taa, ndị Chineke na-eji ígwè ndị na-agba oké ọsọ e ji ebi akwụkwọ nakwa ígwè ọrụ ndị bu kọmputa ebipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ọtụtụ narị asụsụ. A na-eji ụgbọ njem ndị na-agba oké ọsọ ebuga akwụkwọ ndị a n’ebe ndị dị anya n’ụwa, na-eme ka o ruo ndị bi ná mba 235 aka. Jehova ejiriwo mmụọ ya kpalie ndị ohu ya iji ngwá nkà na ụzọ ndị a mee ihe n’ụzọ bara uru, na-eme ka eziokwu Bible na-erutekwu ọtụtụ mmadụ karịa ka o rutụrụla ha mbụ.
4. Olee mgbanwe ụfọdụ meworo ná ndụ ha iji jiri ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ karị?
4 Anyị Onwe Anyị Ime Mgbanwe: A kpaliwokwa ndị na-efe ezi ofufe ime mgbanwe iji nwee ike iji ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ karị. Ọtụtụ emewo ka ndụ ha dị mfe iji kerekwuo òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Ụfọdụ akwagawo ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị ọzọ etinyekwuola mgbalị n’ozi ha site n’ịmụ asụsụ ala ọzọ.
5, 6. Olee ihe anyị pụrụ ime iji jiri ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee n’ókèala ọgbakọ anyị?
5 Anyị pụkwara iji ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ mmadụ karị site n’ime nkwusa mgbe ndị mmadụ nọ n’ụlọ nakwa n’ebe a pụrụ ịhụ ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ adịghị anọkarị n’ụlọ n’oge ụtụtụ na n’ehihie n’ókèala unu, ị̀ pụrụ ịgbanwegharị oge i ji agba àmà ma na-agba àmà n’oge mgbede? È nwere ebe ọhaneze na-anọkarị ị pụrụ ịgba àmà? Ị̀ nwalewo iji telifon gbaa àmà na ịgba àmà n’ógbè azụmahịa? Ị̀ na-achọpụta ohere i nwere ike iji gbaa àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi?
6 Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ anyị iso ná ndị na-agba àmà dị ukwuu bụ́ nke a na-agbara aha Jehova na Alaeze ya! Ka anyị nọgide na-ekesara ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee eziokwu ahụ na-enye ndụ sitere n’Okwu Chineke.