Leta Alaka
Ezi Ndị Nkwusa Alaeze:
A na-arụ ọrụ pụtara ìhè iji hụ na a na-agbasa ozi ọma na Nigeria. N’ime afọ ije ozi gara aga, a rụnyechara ígwè obibi akwụkwọ rotary ahụ site n’enyemaka nke ndị ọrụ si mba asaa. N’ihi ígwè obibi akwụkwọ rotary a anyị nwere, anyị enwewo ike igbutulata ọnụ ọgụgụ mmadụ a chọrọ iji na-ebipụta magazin. Ọzọkwa, Òtù Na-achị Isi akwadowo ka anyị na-ebipụta broshuọ na traktị ndị a chọrọ iji na-eje ozi na Nigeria, ebe ọ bụ na ike anyị eruwo n’ibipụta ha.
Ndị mmadụ anọwo na-abịa n’ìgwè iji hụ ígwè obibi akwụkwọ rotary ahụ. Otu n’ime akụkụ ya ndị kpaliworo mmasị ọtụtụ ndị bịara ileta ya bụ akụkụ ya a na-akpọ Quantum Pollution Control, bụ́ nke na-egbochi ígwè obibi akwụkwọ ahụ imebi ikuku. Mgbe e gosichara otu onye ígwè obibi akwụkwọ ahụ, ọ jụrụ, sị: “Ebee ka e si enweta ego e ji na-ebipụta akwụkwọ ndị a?” Mgbe e mesịrị, o kwuru ka e gosi ya igbe onyinye afọ ofufo. O nyekwara onyinye. Ọzọkwa, o kwuru na ya ga na-atụkwasịkwu ihe n’ego ya na-enye n’onyinye iji na-akwado ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ.
Anyị na-agba gị ume ka ị bịa jiri anya gị hụ otú e si na-eji onyinye afọ ofufo ị na-enye eme ihe n’ụzọ dị mma n’ibipụta magazin na broshuọ ndị anyị ji ekwusa ozi ọma. Obi siri anyị ike na nke a ga-atọ gị ụtọ!
E nweela ihe ịga nke ọma dị ukwuu ná nguzobe e guzobere ìgwè na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kemgbe e guzobere ìgwè a ihe dị ka afọ ise gara aga, a rụọla ihe karịrị otu puku Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke a emewo ka a na-etiku aha Jehova mkpu otuto. A chọpụtara nke a site n’ihe otu prọfesọ n’ihe banyere ahụ́ ike kwuru mgbe ọ hụrụ ka a na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ekiti Steeti. O kwuru, sị: “Owuwu e wuru ụlọ nzukọ a n’ime oge dị nnọọ mkpirikpi na-egosi na a haziri ihe nke ọma ma rụkọọ ọrụ ọnụ na ya. Ọ bụghị nanị na nke a na-egosi otú ụlọ ahụ si bụrụ ezigbo ebe a na-anọ efe ofufe kamakwa o gosiri otú ndị na-efe ofufe na ya si bụrụ ndị ma ihe a na-akọ, nakwa otú nzukọ ha si bụrụ nke a haziri nke ọma.”
Ọrụ a nile e ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ iji mee ka ihe ndị metụtara Alaeze na-aga n’ihu bụcha ihe ndị kwesịrị ịja mma! Anyị na-enwe nnọọ ekele maka nkwado unu ji mmesapụ aka na-akwado ọrụ a n’ụzọ ego. (Ilu 3:9, 10) Ka Jehova nọgide na-agọzi mgbalị anyị gbakọrọ aka na-eme iji ‘na-eje ozi maka otuto nke ebube ya.’—Efe. 1:12.
Ụmụnna unu,
Alaka Ụlọ Ọrụ Nigeria