Zụlite Nkà n’Iso Ndị Ọzọ Atụgharị Uche
1. Olee ihe ndekọ dị na Bible nke anyị gaje ịtụle, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
1 Okwu Pọl onyeozi kwuru n’otu ụlọ nzukọ dị n’Antiọk nke Pisidia, bụ́ nke e dekọrọ n’Ọrụ 13:16-41, bụ ihe atụ magburu onwe ya na-egosi otú e si eso ndị ọzọ atụgharị uche. Pọl ghọtara ụzọ e si zụlite ndị ọ na-agwa okwu na ụzọ ha si eche echiche ma buru nke ahụ n’uche mgbe ọ na-ezi ha ozi ọma. Ka anyị na-atụle ihe ndekọ a, ka anyị leba anya n’otú anyị pụrụ isi meekwa otu ihe ahụ n’ozi anyị.
2. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ụzọ Pọl si malite okwu ya?
2 Chọpụta Ihe Gị na Ha Kwekọrịtara na Ya: Ọ bụ ezie na ozi Pọl hiwere isi n’ọrụ dị mkpa Jizọs na-arụ n’ịhụ na e mezuru nzube Chineke, ma Pọl esighị ebe ahụ malite okwu ya. Kama nke ahụ, o kwuru banyere ihe ya na ndị na-ege ya ntị, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Juu, kwekọrịtara na ya—akụkọ banyere ndị Juu n’oge ochie. (Ọrụ 13:16-22) N’otu aka ahụ, anyị ga-enwekwu ihe ịga nke ọma n’iru n’obi ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị achọpụta ihe ndị anyị na ha kwekọrịtara na ya. Nke a pụrụ ịchọ anyị iji akọ jụpụta ha ihe dị ha n’obi ma gee ha ntị nke ọma iji mata ihe ndị ha weere dị ka ihe ndị dị mkpa n’ezie.
3. Olee ihe mere o ji siere ndị Pọl gwara okwu ike ikweta na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa?
3 Mgbe Pọl na-akọrọ ndị gere ya ntị banyere ndị Juu oge ochie, o chetaara ha na Chineke kwere nkwa ime ka Onye Nzọpụta si n’agbụrụ Devid pụta. Ma, ọtụtụ ndị Juu nọ na-atụ anya ọchịagha ga-atọhapụ ha n’ọchịchị nchigbu ndị Rom ma mee ka mba ndị Juu dị elu karịa mba ọ bụla ọzọ. O doro anya na ha maara na ndị ndú okpukpe ndị Juu nọ na Jeruselem jụrụ Jizọs, rara ya nye n’aka ndị ọchịchị Rom, e gbuokwa ya. Olee otú Pọl pụrụ isi mee ka ha kweta na Onye a bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa?
4. Olee otú Pọl si jiri akọ soro ndị Juu na-ege ya ntị tụgharịa uche?
4 Na-agbanwe Ụzọ I Si Ezi Ozi Ọma: Ebe ọ bụ na Pọl maara otú ndị na-ege ya ntị si eche echiche, o ji Akwụkwọ Nsọ soro ha tụgharịa uche n’ihe ndị ha kweere na ya. Dị ka ihe atụ, ọ kọwara Jizọs dị ka nwa Devid nakwa dị ka onye Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye ha nile weere dị ka onye amụma Chineke, kwuru na ọ bụ Mezaịa. (Ọrụ 13:23-25) Pọl gosiri na site n’ịjụ Jizọs ma maa ya ikpe ọnwụ, ndị ndú okpukpe ahụ “mezuru ihe Ndị Amụma kwuru.” (Ọrụ 13:26-28) Ọzọkwa, ọ kọwara na e nwere ndị ji anya ha hụ na Jizọs si n’ọnwụ bilie, ọ dọkwaara uche ha gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ha maara, bụ́kwa ndị mezuru mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie.—Ọrụ 13:29-37.
5. (a) Olee mgbanwe Pọl mere mgbe ọ na-ezi ndị Gris ozi ọma? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ókèala anyị?
5 N’aka nke ọzọ, mgbe Pọl na-agwa ndị Gris okwu n’Areọpagọs nke dị n’Atens, o si ụzọ dị iche zie ha ozi ọma. (Ọrụ 17:22-31) N’agbanyeghị nke ahụ, ozi ọma o ziri ha na nke ahụ o ziri ndi Juu bụ otu ihe ahụ. Na nke ọ bụla n’ime ha, mgbalị ya rụpụtara ihe ndị dị mma. (Ọrụ 13:42, 43; 17:34) N’otu aka ahụkwa taa, anyị ga-emekwu nke ọma n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị achọpụta ihe anyị na ndị na-ege anyị ntị kwekọrịtara na ya nakwa ma ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe ụzọ anyị si ezi ha ozi ọma, na-eburu n’uche ụzọ e si zụlite ha na otú ha si eche echiche.