Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịjụ Ajụjụ na Ige Ntị
1 Ọtụtụ mmadụ na-enwe mmasị ikwu echiche ha, ma ha adịghị enwe mmasị ka a na-agwa ha mee nke a, emela nke a, ma ọ bụkwanụ ka a na-ajụkasị ha ajụjụ ahụ́. N’ihi ya, ebe anyị bụ ndị ozi Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịmụta ụzọ dị mma e si ajụpụta ndị mmadụ ihe bụ́ echiche ha.—Ilu 20:5.
2 Ajụjụ anyị kwesịrị ịkpali ndị mmadụ ikwu echiche ha, ọ bụghị imenye ha ụjọ. Ihe otu nwanna nwoke na-eme ma ya na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ịjụ, sị, “Ì chere na a ga-enwe oge ndị mmadụ ga-eji nkwanye ùgwù na-emeso ibe ha ihe?” Dabere n’ihe onye ahụ zara, ọ na-ajụzi ya, sị, “Gịnị ka i chere a ga-eme ka ụmụ mmadụ wee mewe otú ahụ?” ma ọ bụ “Gịnị mere i ji chee otú ahụ?” Ihe nwanna nwoke ọzọ na-eme ma ya na-agba àmà n’ebe ọhaneze na-anọ bụ ịjụ ndị nwere ụmụ, sị, “Olee ihe kasị eme ka obi na-atọ gị ụtọ n’ọbụbụ ị bụ nne (ma ọ bụ, nna)?” Onye ahụ zasịa, ya ajụọkwa ya, sị, “Olee ihe ndị kasị enye gị nsogbu n’obi?” Rịba ama na ajụjụ ndị a na-enye ndị mmadụ ohere ikwu echiche ha n’emeghị ka ihere mewe ha. Ebe ọ bụ na ọnọdụ e nwere ebe nile abụghị otu, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị na-agbanwe ajụjụ anyị na ụzọ anyị si ajụ ya iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala anyị.
3 Ịjụpụta Ndị Mmadụ Echiche Ha: Ọ bụrụ na ndị mmadụ dị njikere ịgwa gị echiche ha, gee ha ntị nke ọma ma zere ịnapụ ha okwu n’ọnụ n’ụzọ na-enweghị isi. (Jems 1:19) Jiri amara gosi na ị ghọtara ihe ha kwuru. (Kọl. 4:6) Ihe ị ga-ekwu pụrụ ịbụ nanị: “Nke ahụ amaka. I meela maka ịkọrọ m ya.” Jaa ha mma ma ọ bụrụ na ị pụrụ iji obi ọcha mee ya. Jiri obiọma jụkwuo ha ajụjụ iji chọpụta ihe ha chere na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Chọpụta ihe gị na ha kwekọrịtara na ya. Mgbe ị chọrọ ịdọrọ uche ha gaa n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ị pụrụ ikwu, sị, “Ọ̀ dịtụla mgbe i lere ihe a anyị na-aga ịgụ ugbu a anya dị ka ihe pụrụ ime eme?” Zere ikwesi olu ike ma ọ bụ ịrụkarị ụka.—2 Tim. 2:24, 25.
4 Otú anyị si ege ndị ọzọ ntị pụrụ ikpebi otú ha ga-esi ele ajụjụ anyị jụrụ ha anya. Ndị mmadụ pụrụ ịma ma ànyị ji obi anyị dum na-ege ha ntị. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị, “Mgbe i gosiri na ị dị njikere iwepụta oge iji gee ndị mmadụ ntị, ọ na-eme nnọọ ka ha nwee ike ịkọrọ gị obi ha, ọ bụkwa ụzọ magburu onwe ya isi gosi na i nwere mmasị n’ebe ha nọ.” Mgbe anyị na-ege ndị ọzọ ntị, ọ bụ ùgwù ka anyị na-akwanyere ha, ọ pụkwara ịkpali ha ige ntị n’ozi ọma anyị chọrọ izi ha.—Rom 12:10.