Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Jizọs ji ndị mmadụ kpọrọ ihe, o gosikwara na ya nwere mmasị n’ebe ha nọ. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ọ chọpụtara na ahụ́ eruchaghị otu nwoke ntị chiri ọ chọrọ ịgwọ ala. N’ihi ya, ọ kpọọrọ ya gaa n’ebe ndị mmadụ na-anọghị, nọrọ ebe ahụ gwọọ ya. (Mak 7:31-35) Mgbe ọ matara na ndị na-eso ụzọ ya agaghị aghọtacha ihe niile ọ chọrọ ịgwa ha, ọ kụziiri ha ole isi ha ga-ebuli. (Jọn 16:12) Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ọ ka nọkwa na-egosi na ya nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. (2 Tim. 4:17) Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya. (1 Pita 2:21; 1 Jọn 3:16, 18) N’ihi ya, anyị ga-emekwu nke ọma n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere mmasị n’ebe onye anyị bịara na nke ya nọ, chọpụta otú ihe si dịrị ya na ihe bụ́ nsogbu ya. Onye ahụ ga-ege anyị ntị ma ọ chọpụta na anyị nwere mmasị n’ebe ọ nọ nakwa na ihe anyị ji bịa abụghị naanị ka anyị nye ya akwụkwọ ma ọ bụ zie ya ozi ọma.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu nwewe ofufe ezinụlọ, mee ihe ngosi otú onye nkwusa ga-esi jiri ihe onye ọ gara na nke ya gwara ya zie ya ozi ọma. I nwekwara ike ịkụziri onye gị na ya so n’ozi ọma otú e si eme ya.
Mgbe ụfọdụ, nwanna na-eduzi nzukọ ozi ubi nwere ike ịkọwa ma ọ bụ gosi ụzọ dị iche iche e nwere ike isi gosi ndị mmadụ na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ.