Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-eme Mgbanwe
1 Pọl onyeozi setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya ma a bịa n’ịdị na-agbanwe ụzọ o si ezi ozi ọma ka o kwekọọ mgbe nile n’ụzọ ndị na-ege ya ntị si eche echiche nakwa n’ụzọ e si zụlite ha. (1 Kọr. 9:19-23) Anyị kwesịrị ịgba mbọ ime otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị echetụkwuo echiche tupu anyị amalite okwu, anyị pụrụ ime ka aro ndị a tụrụ banyere ụzọ e si ezi ozi ọma, bụ́ ndị a na-ahụ n’Ozi Alaeze Anyị, kwekọọ ná mkpa nke ndị nọ n’ókèala anyị. Mgbe anyị rutewere n’ụlọ ndị mmadụ, anyị pụrụ ịhụ ihe ndị na-egosi ihe onye nwe ụlọ nwere mmasị na ya ma tinye ha n’okwu anyị. Otú ọ dị, e nwere ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi na-eme mgbanwe n’ozi anyị.
2 Mee Ka Okwu Gị Kwekọọ n’Ihe Onye Nwe Ụlọ Kwuru: Mgbe anyị na-ezi ozi ọma, anyị na-ajụkarị ndị nwe ụlọ ajụjụ ka ha zaa. Olee otú ị na-esi ele azịza ha anya? Ihe ị na-emekarị ọ̀ na-abụ ikwu ihe gosiri na ị nụrụ ihe ha zara ma kwuru nnọọ okwu gị gaa n’ihu otú ahụ i si kwadebe ya? Ka okwu gị ọ̀ na-egosi na i chebaara ihe ndị nwe ụlọ zara echiche? Ọ bụrụ na i nwere ezi mmasị n’ihe onye nwe ụlọ kwuru, ị pụrụ iji akọ jụkwuo ya ajụjụ iji chọpụta ihe dị ya n’obi n’ezie. (Ilu 20:5) Iji mee nke a, ị pụrụ ikwuru okwu gị gaa n’akụkụ ụfọdụ nke ozi Alaeze ahụ bụ́ nke kasị metụta ihe na-enye ya nsogbu n’obi.
3 Nke a na-achọ na anyị ga-adị njikere ikwu banyere isi ihe na-abụghị ndị anyị bubu n’obi ikwu. Ọ bụrụ na anyị amalite site n’ikwu banyere otu nsogbu a kọrọ n’akụkọ ụwa, onye nwe ụlọ ekwuo banyere otu ihe na-enye ya nsogbu n’obi bụ́ nke metụtara nanị ya ma ọ bụ ndị bi n’ógbè ahụ, ezi mmasị anyị nwere igbo mkpa ya ga-akpali anyị ịhụ na ihe anyị ga-agwa ya site na Bible hiwere isi n’ihe ahụ na-enye ya nsogbu n’obi.—Fil. 2:4.
4 Ime Ka Okwu Anyị Kwekọọ n’Ọnọdụ E Nwere: Mgbe onye nwe ụlọ jụrụ ajụjụ, ọ pụrụ ịbara anyị uru ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’oge ọzọ mgbe anyị mekwuru nnyocha iji mara ihe ndị ọzọ Bible kwuru banyere ihe ahụ. Anyị pụkwara inye ya akwụkwọ anyị ndị tụlere banyere ihe ahụ nke ọma. Ihe a nile na-egosi na anyị nwere ezi mmasị inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova.—2 Kọr. 2:17.