Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/07 p. 1
  • Ndị E Nyere Akụ̀ Ka Ha Lekọta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Nyere Akụ̀ Ka Ha Lekọta
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ka Obi Gị Dịrị n’Akụ̀ Bara Ezigbo Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • I Nwere Ike Ịchọta “Ihe Ọmụma Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Akụ Anyị, Ije Ọzi Nke Dị Ebube n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 2/07 p. 1

Ndị E Nyere Akụ̀ Ka Ha Lekọta

1 Pọl onyeozi ji ọrụ ikwusa ozi ọma Chineke nyere ya kpọrọ ihe nke ukwuu ma kpọọ ya “akụ̀.” (2 Kọr. 4:7) Ọ tachiri obi n’ihe isi ike na mkpagbu ndị o nwetara mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ahụ. O ji ike ya nile kwusaara onye ọ bụla ọ hụrụ ozi ọma. O ji ma ụkwụ ma ụgbọ mmiri gaa ebe ndị na-adịghị mfe ọgịga na ebe ndị dị ize ndụ. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Pọl ma gosi na anyị ji ozi anyị kpọrọ ihe? (Rom 11:13) Olee ihe mere ozi anyị ji bụrụ akụ̀ na-enweghị atụ?

2 Akụ̀ nke Ka Ibe Ya: Ihe ndị ụwa weere dị ka akụ̀ na-akpatakarị obi mgbawa, ma ọ́ bụghị na uru ndị dị na ha na-adị obere, ya abụrụ na ha anaghị adịte aka. N’aka nke ọzọ, ozi anyị na-abara ma anyị ma ndị ọzọ uru, uru ya na-adịtekwa aka. (1 Tim. 4:16) Ọ na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbịa mara Jehova, mee mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha, ma nweta olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na anyị ejiri ozi anyị kpọrọ nnọọ ihe, ọ ga-eme ka ndụ anyị nwee nzube, mee ka anyị nwee obi ụtọ na anyị na-arụpụta ihe dị mma, meekwa ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu.—1 Kọr. 15:58.

3 Gosi na Ị Na-eji Akụ̀ Gị Akpọrọ Ihe: Ihe na-egosikarị na anyị ji ihe kpọrọ ihe bụ ihe anyị dị njikere imefu maka ya. Ọ bụ nnọọ nnukwu ihe ùgwù iji oge anyị na ume anyị na-eto Jehova? (Efe. 5:16, 17) Otú anyị si eji oge anyị eme ihe kwesịrị igosi na anyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe karịa ihe onwunwe? Ebe ọ bụ na anyị nwere ozi dị oké ọnụ ahịa anyị na-ezi ndị mmadụ, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi ezi ya ma na-adịkwa njikere mgbe nile iji ohere ọ bụla dapụtaranụ ezi ya.

4 Akụ̀ dị oké ọnụ ahịa abụghị ihe a na-ezokarị ezo, kama a na-edebe ya ebe ndị mmadụ nwere ike ịhụ ya. Ọ bụrụ na anyị weere ozi anyị dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, anyị ga-ewere ya dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. (Mat. 5:14-16) Ka anyị jiri obi ekele na-agbaso ihe nlereanya Pọl onyeozi mgbe nile ma jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-egosi na anyị na-eji ozi anyị akpọrọ ihe n’eziokwu, ma na-ewere ya dị ka akụ̀.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya