Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/11 p. 1
  • Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Nkwusa Alaeze—Ihe Ùgwù Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ndị E Nyere Akụ̀ Ka Ha Lekọta
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ka Obi Gị Dịrị n’Akụ̀ Bara Ezigbo Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 9/11 p. 1

Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe

1. Olee otú ọtụtụ ndị si ele ozi ọma anyị na-ekwusa anya?

1 Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa Setan a na-ewere ozi ọma anyị na-ekwusa ka “ihe nzuzu.” (1 Kọr. 1:18-21) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwu ọjọọ ha na-ekwu gbasara ozi ọma a nwere ike mee ka ike ịga ozi ọma gwụ anyị. (Ilu 24:10; Aịza. 5:20) Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị jiri àmà a anyị na-agbara Jehova kpọrọ ihe?—Aịza. 43:10.

2. Gịnị mere anyị ga-eji asị na ozi ọma anyị na-ekwusa bụ “ọrụ dị nsọ”?

2 “Ọrụ Dị Nsọ”: Pọl onyeozi kwuru na ozi ọma anyị na-ekwusa bụ “ọrụ dị nsọ.” (Rom 15:15, 16) Olee otú o si bụrụ “ọrụ dị nsọ”? Ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka anyị bụrụ ndị ha na “Onye Nsọ ahụ,” bụ́ Jehova, “na-arụkọ ọrụ,” ọ bụkwa otu n’ime ụzọ e si edo aha ya nsọ. (1 Kọr. 3:9; 1 Pita 1:15) Jehova weere ozi ọma anyị na-ekwusa ka “àjà otuto” anyị na-achụrụ ya. N’ihi ya, ozi ọma a bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Jehova.—Hib. 13:15.

3. Olee ihe mere ikwusa ozi ọma ji bụrụ ihe ùgwù na-enweghị atụ?

3 Ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù Jehova nyere naanị mmadụ ole na ole. Ndị mmụọ ozi gaara enwe mmasị ikwusa ya ma à sị na Jehova gwara ha mee otú ahụ, ha gaara ekwusakwa ya nke ọma. (1 Pita 1:12) Ma, Jehova họọrọ anyịnwa na-ezughị okè ka anyị na-ekwusa ozi ọma a n’agbanyeghị na anyị bụ “arịa e ji ụrọ kpụọ.” N’eziokwu, ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ.—2 Kọr. 4:7.

4. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa kpọrọ ihe?

4 Ihe Kacha Mkpa: Ọ bụrụ na anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa kpọrọ ihe, anyị ga-ewere ya ka otu n’ime “ihe ndị ka mkpa” ná ndụ anyị. (Fil. 1:10) Nke a ga-eme ka anyị wepụta oge n’izu ọ bụla gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na mmadụ so òtù ndị na-akụ egwú a ma ama n’obodo akụ egwú, onye ahụ ga na-akwadebe nke ọma maka egwú ọ bụla ha ga-aga ịkụ ma ọ bụrụ na o ji egwú ahụ ọ na-akụ kpọrọ ihe. Ọ ga na-agbakwa mbọ ka otú o si akụ egwú kakwuo mma. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị na-akwadebe nke ọma tupu anyị agawa ozi ọma, anyị ga ‘na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ Nke a ga-emekwa ka “nkà izi ihe” anyị kakwuo mma.—2 Tim. 2:15; 4:2.

5. Ònye ka ozi ọma anyị na-ekwusa na-adị mma n’obi?

5 Ekwekwala ka otú ọtụtụ ndị mmadụ si ele ozi anyị anya mee ka ike ikwusa ya gwụ gị. Cheta na a ka nwere ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị, ndị ọbịbịa anyị na-abịa na nke ha na-amasị. Ma, ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị maka na ọ na-amasị ndị mmadụ. Ihe ka mkpa mere anyị ji ekwusa ya bụ n’ihi na ọ dị Jehova mma n’obi, o jighịkwa mbọ anyị na-agba egwu egwu.—Aịza. 52:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya