Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe
1. Olee otú ọtụtụ ndị si ele ozi ọma anyị na-ekwusa anya?
1 Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa Setan a na-ewere ozi ọma anyị na-ekwusa ka “ihe nzuzu.” (1 Kọr. 1:18-21) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwu ọjọọ ha na-ekwu gbasara ozi ọma a nwere ike mee ka ike ịga ozi ọma gwụ anyị. (Ilu 24:10; Aịza. 5:20) Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị jiri àmà a anyị na-agbara Jehova kpọrọ ihe?—Aịza. 43:10.
2. Gịnị mere anyị ga-eji asị na ozi ọma anyị na-ekwusa bụ “ọrụ dị nsọ”?
2 “Ọrụ Dị Nsọ”: Pọl onyeozi kwuru na ozi ọma anyị na-ekwusa bụ “ọrụ dị nsọ.” (Rom 15:15, 16) Olee otú o si bụrụ “ọrụ dị nsọ”? Ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka anyị bụrụ ndị ha na “Onye Nsọ ahụ,” bụ́ Jehova, “na-arụkọ ọrụ,” ọ bụkwa otu n’ime ụzọ e si edo aha ya nsọ. (1 Kọr. 3:9; 1 Pita 1:15) Jehova weere ozi ọma anyị na-ekwusa ka “àjà otuto” anyị na-achụrụ ya. N’ihi ya, ozi ọma a bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Jehova.—Hib. 13:15.
3. Olee ihe mere ikwusa ozi ọma ji bụrụ ihe ùgwù na-enweghị atụ?
3 Ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù Jehova nyere naanị mmadụ ole na ole. Ndị mmụọ ozi gaara enwe mmasị ikwusa ya ma à sị na Jehova gwara ha mee otú ahụ, ha gaara ekwusakwa ya nke ọma. (1 Pita 1:12) Ma, Jehova họọrọ anyịnwa na-ezughị okè ka anyị na-ekwusa ozi ọma a n’agbanyeghị na anyị bụ “arịa e ji ụrọ kpụọ.” N’eziokwu, ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ.—2 Kọr. 4:7.
4. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa kpọrọ ihe?
4 Ihe Kacha Mkpa: Ọ bụrụ na anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa kpọrọ ihe, anyị ga-ewere ya ka otu n’ime “ihe ndị ka mkpa” ná ndụ anyị. (Fil. 1:10) Nke a ga-eme ka anyị wepụta oge n’izu ọ bụla gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na mmadụ so òtù ndị na-akụ egwú a ma ama n’obodo akụ egwú, onye ahụ ga na-akwadebe nke ọma maka egwú ọ bụla ha ga-aga ịkụ ma ọ bụrụ na o ji egwú ahụ ọ na-akụ kpọrọ ihe. Ọ ga na-agbakwa mbọ ka otú o si akụ egwú kakwuo mma. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị na-akwadebe nke ọma tupu anyị agawa ozi ọma, anyị ga ‘na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ Nke a ga-emekwa ka “nkà izi ihe” anyị kakwuo mma.—2 Tim. 2:15; 4:2.
5. Ònye ka ozi ọma anyị na-ekwusa na-adị mma n’obi?
5 Ekwekwala ka otú ọtụtụ ndị mmadụ si ele ozi anyị anya mee ka ike ikwusa ya gwụ gị. Cheta na a ka nwere ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị, ndị ọbịbịa anyị na-abịa na nke ha na-amasị. Ma, ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị maka na ọ na-amasị ndị mmadụ. Ihe ka mkpa mere anyị ji ekwusa ya bụ n’ihi na ọ dị Jehova mma n’obi, o jighịkwa mbọ anyị na-agba egwu egwu.—Aịza. 52:7.