Ọrụ Nkwusa Alaeze—Ihe Ùgwù Dị Oké Ọnụ Ahịa
1 Kwa ụbọchị, ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa na-erite uru n’ihe ndị Jehova ji mmesapụ aka na-enye iji mee ka ndụ na-aga n’ihu. (Mat. 5:45) Otú ọ dị, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nwere ihe ùgwù pụrụ iche nke igosipụta ekele ha nwere n’ebe Onye Okike ha nọ site n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) Olee otú i jiruru ihe ùgwù a dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe?
2 Ọrụ nkwusa Alaeze na-enye Chineke otuto ma na-eme ka ndị na-ahụsi anya n’ihi oge dị oké egwu anyị nọ na ya nwee olileanya na udo. (Hib. 13:15) Ndị nabatara ozi ahụ ga-enweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Olee ọrụ ego nke mmadụ pụrụ irite ụdị uru ahụ na ya? Pọl onyeozi gosipụtara ekele o nwere maka ozi ahụ site n’ụzọ o si jee ya. O lere ya anya dị ka akụ̀.—Ọrụ 20:20, 21, 24; 2 Kọr. 4:1, 7.
3 Iji Ihe Ùgwù Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Kpọrọ Ihe: Otu ụzọ anyị si egosi ekele anyị nwere maka ihe ùgwù nke ime nkwusa bụ site n’ime ka ozi anyị bụrụkwuo ịgba. Ànyị na-ewepụta oge iji kwadebe ụzọ anyị ga-esi ezi ozi ọma n’ụzọ ga-eru n’obi ndị ga-ege anyị ntị? Ànyị pụrụ imeziwanye nkà anyị n’otú anyị si eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe nakwa n’otú anyị si eso ndị mmadụ atụgharị uche? Ànyị na-ejezu ókèala anyị nke ọma? Ànyị pụrụ ịmalite ma na-eduzi ọmụmụ Bible? Dị ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a, ihe na-akpali anyị ije ozi bụ echiche ziri ezi anyị nwere banyere ya, anyị ejighịkwa ihe ùgwù a anyị nwere egwuri egwu.—Mat. 25:14-23.
4 Mgbe ịka nká, ọrịa, ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ na-emekpa anyị ahụ́, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na e ji mgbalị anyị ji ịnụ ọkụ n’obi eme iji na-eje ozi ọma akpọrọ ihe nke ukwuu n’ezie. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na Jehova ji mgbalị ndị dị otú ahụ anyị na-eme iji jeere ya ozi akpọrọ ihe, ọbụna mgbalị ndị ahụ ọ pụrụ ịbụ na ha ebughị ibu n’anya ndị ọzọ.—Luk 21:1-4.
5 Ọrụ nkwusa Alaeze na-enye nnọọ afọ ojuju. Otu nwanna nwanyị dị afọ 92 kwuru, sị: “Lee ihe ùgwù ọ bụ ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 80 nke ozi a raara nye Chineke—n’enweghị ihe ịkwa ụta ọ bụla! Ọ bụrụ na m pụrụ ịmalite ndụ m n’isi ọzọ, aga m ebi ya n’otu ụzọ ahụ n’ihi na, n’ezie, ‘ebere Chineke dị mma karịa ndụ n’onwe ya.’” (Ọma 63:3) Ka anyị onwe anyị kwa jiri ihe ùgwù a dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị—ọrụ nkwusa Alaeze—kpọrọ ihe.