Anyị Ji Ihe Ùgwù Ndị Anyị Nwere Kpọrọ Ihe!
1 Kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ, Jehova enyela ndị ohu ya ụdị ihe ùgwù dị iche iche. O nyere ha ihe ùgwù n’agbanyeghị afọ ndụ ha ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ, ma hà bụ ụmụ nwoke ma hà bụ ụmụ nwanyị. (Luk 1:41, 42; Ọrụ 7:46; Fil. 1:29) Olee ihe ùgwù ndị ọ na-enye anyị taa?
2 Ihe Ùgwù Ụfọdụ Anyị Nwere: Anyị nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị Jehova na-ezi ihe. (Mat. 13:11, 15) Ihe ùgwù ọzọ anyị nwere bụ na anyị na-eji okwu ọnụ anyị eto Jehova mgbe anyị na-enwe nzukọ n’ọgbakọ anyị. (Ọma 35:18) Mgbe anyị nwere ohere ikwu okwu, anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwu ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ewere ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ dị ka ihe ùgwù, anyị ga-eji ike anyị nile na-arụ ya. Ànyị na-eso mgbe nile enwe ihe ùgwù nke idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na ịrụzi ebe ndị mebiri emebi na ya?
3 Ọ bụ ezie na ọtụtụ nde mmadụ na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere ha, anyị nwere ihe ùgwù bụ́ na Onye kasị mkpa n’eluigwe na ụwa na-anụ ekpere anyị. (Ilu 15:29) Jehova n’onwe ya na-anụ ekpere ndị ohu ya. (1 Pita 3:12) O nyere anyị ohere ikpegara ya ekpere ugboro ole ọ bụla anyị chọrọ. Ọ bụụrụ anyị onyinye magburu onwe ya na anyị nwere ike ikpe ekpere “n’oge nile.”—Efe. 6:18.
4 “Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ”: Otu n’ime ihe ùgwù kasị mma anyị nwere bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke dị ka “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ọ bụ ọrụ na-eme ka anyị nwee afọ ojuju, nweekwa ume. (Jọn 4:34) Ọ bụghị iwu na Jehova ga-ejirịrị ụmụ mmadụ rụọ ọrụ a. Ma, o nyere anyị ọrụ a iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Luk 19:39, 40) Otú ọ dị, ọ bụghị onye ọ bụla Jehova hụrụ ka ọ na-enye ihe ùgwù a. Ndị na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha ga-abụrịrị ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ. Ha ga-anọgidekwa na-abụ ndị ruru eru. (Aịsa. 52:11) Ànyị na-egosi na anyị ji ihe ùgwù a kpọrọ ihe site n’ime ka ije ozi ọma soro n’ihe ndị dị mkpa anyị na-eme kwa izu?
5 Ihe ùgwù ndị Jehova nyere anyị na-eme ka ndụ anyị dị ụtọ. (Ilu 10:22) Ka ọ ghara inwe mgbe anyị ga-eleda ha anya! Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị ji ihe ùgwù ndị anyị nwere kpọrọ ihe n’eziokwu, anyị na-eme ka obi tọọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ, bụ́ Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.”—Jems 1:17.