Ọ̀ Na-agụsi Gị Agụụ Ike Ijekwu Ozi n’Ụzọ Zuru Ezu?
“EWESORO m Jehova iwe,” ka Laura na-ekwu. “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka o nyere anyị aka idozi nsogbu ego anyị ka m wee nwee ike ịga n’ihu na-asụ ụzọ—ma ọ kụrụ afọ n’ala. M mesịrị kwụsị ịsụ ụzọ. Aghaghịkwa m ikweta na ekwosoro m ndị nwere ike ịga n’ihu ekworo.”
Ọzọ, tụlee ọnọdụ nke Michael, bụ́ ohu na-eje ozi n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ nọwo na-eru eru maka ọnọdụ onye nlekọta. (1 Timoti 3:1) Mgbe a na-emezughị ihe na-agụsi ya ike ruo ọtụtụ afọ, o nwere mwute nke na ọ chọghịzi ka a tụlee ya maka ihe ùgwù ahụ. “Enweghị m nnọọ ike ịnagide ihe mgbu nke ndakpọ olileanya ọzọ,” ka ọ na-ekwu.
Ì nwewo ahụmahụ yiri nke ahụ? Ọ̀ dịwo mgbe ị na-aghaghị ịhapụ ihe ùgwù ọchịchị Chineke nke ị hụrụ n’anya? Dị ka ihe atụ, ọ̀ dịwo mgbe ị na-aghaghị ịkwụsị ije ozi dị ka ọsụ ụzọ, onye mkpọsa Alaeze oge nile? Ka ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike inwe ihe ùgwù ụfọdụ e nyere ndị ọzọ? Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na i nwere ọchịchọ siri ike ije ozi na Betel ma ọ bụ dị ka onye ozi ala ọzọ, ma ọnọdụ gị enyeghị ohere ya.
“Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa,” ka akwụkwọ Ilu na-ekweta. (Ilu 13:12) Nke a pụrụ ịdị otú ahụ karịsịa mgbe ndị ọzọ natara kpọmkwem ihe ùgwù ndị ahụ ị na-atụ anya ha. Okwu Chineke ọ̀ na-enye nghọta, nkasi obi, na olileanya maka onye ọ bụla nwere ndakpọ olileanya ndị dị otú ahụ? Ee, ọ na-enye. N’ezie, Abụ Ọma nke 84 na-ekwupụta mmetụta nke otu ohu Jehova nke nwere ọchịchọ yiri ndị ahụ a na-emezughị emezu n’ihe metụtara ozi Jehova.
Obi Ekele Onye Livaị
Ndị rọrọ Abụ Ọma nke 84 bụ ụmụ ndị ikom Kora, bụ́ ndị Livaị jere ozi n’ụlọ nsọ Jehova ma jiri ihe ùgwù ije ozi ha kpọrọ ihe nke ukwuu. “Lee ka ebe obibi Gị nile si bụrụ ebe a hụrụ n’anya nke ukwuu, Jehova nke usuu nile nke ndị agha!” ka otu n’ime ha kwuru n’olu dara ụda. “Agụụ agụsiwo mkpụrụ obi m ike, ee, ọ gwụsịwokwa n’ịchọ ogige nile nke Jehova; obi m na anụ ahụ m na-etiku Chineke dị ndụ mkpu ọṅụ.”—Abụ Ọma 84:1, 2.
Ọ gụsiri onye Livaị a agụụ ike ije ozi n’ụlọ nsọ Jehova nke na ọbụna nhado ala nkịtị dị n’ụzọ gara Jerusalem yiri ihe na-adọrọ adọrọ nye ya. “Mgbe ha na-agabiga ndagwurugwu Baka,” ka ọ na-ekwu, “ha na-eme ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche.” (Abụ Ọma 84:6) Ee, ala na-adịkarị akọrọ yiri ógbè mmiri dere nke ọma.
N’ihi na ọbụ abụ ahụ bụ onye Livaị na-abụghị onye nchụàjà, ọ pụrụ ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ maka nanị otu izu n’ime ọnwa isii ọ bụla. (1 Ihe Emere 24:1-19; 2 Ihe Emere 23:8; Luk 1:5, 8, 9) Ọ na-eji oge dum fọọrọ ya nọrọ n’ụlọ n’otu n’ime obodo ndị Livaị. Ya mere ọ bụrụ abụ, sị: “Ọbụna nnụnụ dị nta achọtawo ụlọ, eleké achọwokwara onwe ya akwụ́, ebe o tinyewo ụmụ ya, bụ́ ebe ịchụàjà Gị nile, Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Eze m na Chineke m.” (Abụ Ọma 84:3) Lee obi ụtọ onye Livaị ahụ gaara enwe ma a sị na ọ dị ka nnụnụ ndị nwere ebe obibi na-adịgide adịgide karị n’ụlọ nsọ ahụ!
Ọ gaara adịrị onye Livaị ahụ mfe inwe obi ilu n’ihi na o nweghị ike ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ ọtụtụ ugboro karị. Otú ọ dị, o nwere obi ụtọ ije ozi dị ka o nwere ike, o dokwara anya na ọ ghọtara na inye Jehova nsọpụrụ n’obi dum kwesịrị mgbalị e tinyere. Gịnị nyeere onye Livaị a kwesịrị ntụkwasị obi aka ịnọgide na-enwe afọ ojuju n’ihe ùgwù ije ozi ya?
Mụta Inwe Afọ Ojuju
“Otu ụbọchị n’ogige Gị nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ,” ka onye Livaị ahụ na-ekwu. “Ahọpụtawo m iguzo ná mbata ụzọ n’ụlọ Chineke m, karịa ibi n’ụlọikwuu nile nke mmebi iwu.” (Abụ Ọma 84:10) Ọ ghọtara na ịnọ ọbụna otu ụbọchị n’ụlọ Jehova bụ ihe ùgwù magburu onwe ya. Onye Livaị ahụ nwekwara ihe karịrị nnọọ otu ụbọchị ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ. Afọ ojuju o nwere n’ihe ùgwù ya ndị ahụ mere ka o jiri ọṅụ bụọ abụ.
Gịnị banyere anyị? Ànyị na-agụkọ ngọzi anyị, ka ọ̀ na-eyi ka anyị na-echefu ihe ùgwù ndị anyị nwewororịị n’ozi Jehova? N’ihi nrara ha raara onwe ha nye ya, Jehova enyewo ndị ya ọtụtụ ihe ùgwù na ọrụ dịgasị nnọọ iche iche. Ndị a na-agụnye ibu ọrụ ndị ka arọ nke nlekọta, ịzụ atụrụ, izi ihe, na akụkụ dịgasị iche iche nke ozi oge nile. Ma ha na-agụnyekwa ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa ndị metụtara ofufe Jehova.
Dị ka ihe atụ, tụlee ozi ndị Kraịst. Pọl onyeozi ji ihe ùgwù anyị nke ikwusa ozi ọma ahụ tụnyere anyị inwe “akụ̀ n’ite ájá.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ị̀ na-ele ozi dị otú ahụ anya dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa? Jisọs Kraịst, bụ́ onye butere ụzọ n’ọrụ nkwusa Alaeze, si otú ahụ lee ya anya, na-esetịpụ ihe nlereanya. (Matiu 4:17) “Ebe anyị nwere ije ozi a . . . , ike agwụghị anyị n’obi,” ka Pọl kwuru.—2 Ndị Kọrint 4:1.
Nzukọ ndị Kraịst bụkwa ndokwa dị nsọ a na-agaghị ewere n’ihe nta. Ná nzukọ anyị, anyị na-anara ntụziaka dị mkpa ma na-enwe mkpakọrịta dị mkpa. Ná nzukọ anyị pụkwara ime nkwupụta ihu ọha nke okwukwe na olileanya anyị site n’ịza ajụjụ na site n’ikere òkè n’usoro ihe omume ahụ n’ụzọ ndị ọzọ. (Ndị Hibru 10:23-25) Nzukọ anyị dị iche iche bụ n’ezie ndokwa a ga-eji kpọrọ oké ihe!
Michael, onye a kpọrọ aha ná mmalite, weere ngọzi ndị a dị ka ihe bara oké uru, o nwekwara ekele miri emi maka ha. Ma ndakpọ olileanya ya n’ihi enweghị ike ije ozi dị ka okenye belatara ekele o nwere maka ha ruo nwa oge. Site n’ilekwasị anya na ha ọzọ, o nwere ike ịkwụsighachi ike ma jiri ndidi chere Jehova.
Kama inwe echiche nke enweghị afọ ojuju n’ihi enwetaghị ihe ùgwù ụfọdụ, anyị ga-eme nke ọma inyochaghachi ụzọ ndị Jehova si agọzi anyị, dị ka ọbụ abụ ahụ mere.a Ọ bụrụ na anyị ahụghị ọtụtụ ihe, ọ dị anyị mkpa ile anya ọzọ, na-arịọ Jehova ka o mepee anya anyị ịhụ ihe ùgwù anyị na ụzọ ndị o si agọzi anyị, jirikwa anyị na-eme ihe maka otuto ya.—Ilu 10:22.
Ọ dịkwa mkpa ịghọta na ihe ùgwù ndị pụrụ iche, dị ka ọnọdụ nke onye nlekọta, chọrọ iru eru ụfọdụ kpọmkwem. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Ya mere ọ dị anyị mkpa inyocha onwe anyị, na-achọ akụkụ ọ bụla ebe imeziwanye ihe dị mkpa, mgbe ahụkwa mee mgbalị siri ike imeziwanye ihe.—1 Timoti 4:12-15.
Adala Mbà
Ọ bụrụ na anyị enwetaghị otu ihe ùgwù ije ozi, ọ dịghị anyị mkpa ikwubi na Jehova nwere ịhụnanya ka ukwuu n’ebe ndị nwetara ya nọ ma ọ bụ na ọ na-egbochi ihe ọma n’ebe anyị nọ. N’ezie, anyị ekwesịghị iji anya ụfụ chee na ndị nke ọzọ a esitewo n’imelara mmadụ ihe nweta ihe ùgwù ha na-erughị eru inweta kama ịbụ site ná nhọpụta ọchịchị Chineke. Inwe nchekasị n’echiche ndị dị otú ahụ pụrụ iduga n’ekworo, nkewa, na ọbụna mee ka anyị daa mbà kpam kpam.—1 Ndị Kọrint 3:3; Jemes 3:14-16.
Laura, onye a kpọrọ aha ná mmalite, adaghị mbà. O mesịrị nagide mmetụta ya nke iwe na ekworo. Laura kpegaara Chineke ekpere ugboro ugboro maka enyemaka iji merie mmeghachi omume ya na-ezighị ezi banyere ụzọ ọ na-enweghị ike ịsụ. Ọ chọkwara enyemaka site n’aka ndị ikom ruru eru n’ọgbakọ ma nwee mmesighachi obi ike banyere ịhụnanya Chineke. “Jehova nyere m udo nke uche,” ka o kwuru. “Ọ bụ ezie na mụ na di m apụghị ịsụ ụzọ ugbu a, anyị na-ewere oge mgbe anyị sụrụ ụzọ dị ka nke dị oké ọnụ ahịa ma na-enwetakwa ume site n’ahụmahụ ndị anyị nwere. Anyị na-enyekwara nwa anyị nwoke toworo eto aka n’ịsụ ụzọ ya.” N’inwe afọ ojuju, Laura nwere ike ugbu a ‘iso ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ’ n’ozi ọsụ ụzọ ha.—Ndị Rom 12:15.
Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Pụrụ Iru
Anyị inwe afọ ojuju n’ihe ùgwù ije ozi ndị anyị nwere ugbu a apụtaghị na anyị ga-akwụsị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke. N’ịtụle mbilite n’ọnwụ eluigwe, Pọl kwuru banyere ‘isetịpụ aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị.’ O kwukwara, sị: “N’ihe anyị gbaruru, ka anyị na-agazi dị ka ihe ahụ si dị.” (Ndị Filipaị 3:13-16) Ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke pụrụ inyere anyị aka isetịpụ aka n’ihu. Otú ọ dị, ihe ịma aka bụ ime ka ha bụrụ ndị kwere omume.
Ihe mgbaru ọsọ ndị kwere omume bụ ndị ezi uche dị na ha na ndị a pụrụ iru. (Ndị Filipaị 4:5) Nke a apụtaghị na ihe mgbaru ọsọ chọrọ ọtụtụ afọ nke ọrụ siri ike ekweghị omume. A pụrụ iji nwayọọ nwayọọ ruo ihe mgbaru ọsọ dị otú ahụ na-ewe ogologo oge site n’isetịpụ usoro ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ nzọụkwụ, ndị dị n’agbata ha. Ndị a pụrụ ije ozi dị akara maka ọganihu ime mmụọ. Imezu nzọụkwụ nke ọ bụla n’ụzọ gara nke ọma ga-enye echiche nke afọ ojuju n’ụzọ ahụ kama ndakpọ olileanya.
Nguzozi Dị Mma
Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịmara na n’ihi ọnọdụ na erughị eru anyị, e nwere ike ghara inweta ihe ùgwù ụfọdụ. Isetịpụ ha dị ka ihe mgbaru ọsọ na-eduga nanị ná ndakpọ olileanya na nkụda mmụọ. E kwesịrị idebegodị ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ n’ụsọ, ma ọ dịghị ihe ọzọ ka ọ dị ugbu a. Ime nke a agaghị esi ike ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka afọ ojuju Chineke na-enye ma mee ka ime uche Jehova bụrụ nchegbu anyị bụ isi. Mgbe anyị na-eru eru maka ihe ùgwù dị iche iche, otuto Jehova—ọ bụghị nhụta nke ihe ndị anyị onwe anyị rụzuru—dị mkpa. (Abụ Ọma 16:5, 6; Matiu 6:33) Bible na-agwa anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Tụrụ ọrụ gị nile ruo Jehova ahụ, echiche gị nile ewee guzosie ike.”—Ilu 16:3.
N’ịtụle Abụ Ọma nke 84, anyị pụrụ ịhụ na ọbụ abụ ahụ gosipụtara àgwà dị otú ahụ n’ebe ihe ùgwù ije ozi dị, Jehova gọzikwara ya n’ụba. Ọzọkwa, abụ ọma a nọgidere na-abara ndị Jehova uru ruo taa.
Site n’iji ekpere dabere na Jehova, ị pụrụ idebe afọ ojuju n’ihe ùgwù ndị i nwere ugbu a na agụụ i nwere maka ndị ọzọ n’ezi nhazi. Ekwela ma ọlị ka ọchịchọ nke imekwu ihe napụ gị ekele maka ihe i nwere ugbu a na ọṅụ nke ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. Tụkwasị Jehova obi, n’ihi na nke a na-arụpụta obi ụtọ, dị ka e gosiri n’okwu onye Livaị ahụ: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha, onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị obi na Gị.”—Abụ Ọma 84:12.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Biko lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-amata Uru Ihe Ndị Dị Nsọ?” ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15, 1988.
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Anyị Pụrụ Isetịpụ
Ịgụ Bible kwa ụbọchị.—Joshua 1:8; Matiu 4:4
Iwulite ikike nghọta anyị site n’ọzụzụ Akwụkwọ Nsọ.—Ndị Hibru 5:14
Ịzụlite mmekọrịta ka chie anya n’ebe Chineke nọ.—Abụ Ọma 73:28
Ịzụlite nke ọ bụla ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Ndị Galetia 5:22, 23
Imeziwanye ọdịdị nke ekpere anyị.—Ndị Filipaị 4:6, 7
Ịdịkwu irè n’ime nkwusa na izi ihe.—1 Timoti 4:15, 16
Ịgụ na ịtụgharị uche ná mbipụta ọ bụla nke magazin Ụlọ Nche na Teta!—Abụ Ọma 49:3
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
N’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye, tinye ime uche Chineke n’ọnọdụ mbụ