Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 12
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 12
Abụ nke 80 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 9 ¶8-18 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 120-134 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 124:1–126:6 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ekwensu Bụ Onye A Na-adịghị Ahụ Anya nke Na-achị Ụwa—td 10B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Legide Anya Otu Ebe’?—Mat. 6:22, 23 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Otú Ị Ga-esi Ruo Mmadụ n’Obi—Nkebi nke Mbụ. Okwu si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 258 ruo peeji nke 261, paragraf nke 1. Jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ e kwuru n’isiokwu ahụ.
Nkeji 10: Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma. (Ekli. 11:6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche October 1, 2004, peeji nke 8. Unu kwurịtachaa ihe e dere ebe ahụ, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Jiri Ozi Ọma Ị Na-ekwusa Kpọrọ Ihe.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 22 na Ekpere