Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 10/1 p. 8
  • Akwụkwọ Ozi Alejandra Dere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Ozi Alejandra Dere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ịnụ Ọkụ ná Mmụọ” na Mexico
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Edebesịwo M Okwukwe Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịnakwere Ozi Ọma ahụ na Belgium
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 10/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Akwụkwọ Ozi Alejandra Dere

Ọ DỊWO anya ide akwụkwọ ozi bụwara ụzọ dị irè isi agba àmà. Ọ bụ ezie na ihe ọ ga-arụpụta pụrụ iyi ihe a na-ejighị n’aka mgbe ụfọdụ, a gọziwo ndị nọgidere na-eji ụzọ ịgba àmà a eme ihe n’ụba. Ha na-echeta ndụmọdụ Bible a amamihe dị na ya: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.”—Eklisiastis 11:6.

Alejandra, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà nke nọworo na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico ruo ihe dị ka afọ iri, nọ na-anara ọgwụ maka ọrịa cancer. Ọnọdụ ya kara njọ, o nwekwara nnọọ ike ọgwụgwụ nke na ọ pụghịzi ime ihe ndị ọ na-eme kwa ụbọchị. Otú ọ dị, n’achọghị ileghara ozi ya anya, Alejandra kpebiri ide akwụkwọ ozi. O dere banyere ndokwa nke ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu ma tinye nọmba telifon nne ya. Mgbe ahụ, o nyere nne ya akwụkwọ ozi ndị ahụ ka ọ na-edebe ha n’ebe ndị ọ na-enwetaghị ndị mmadụ n’ụlọ mgbe ọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ.

Ka ọ dịgodị, Diojany, bụ́ nwata nwanyị na-eto eto si Guatemala, jere ịrụ ọrụ dị ka odibo na Cancún, Mexico. Ka ọ nọ ebe ahụ, o zutere Ndịàmà Jehova, ya na ha nwekwara mkparịta ụka ndị sitere na Bible. Ka e mesịrị, ndị ọ na-arụrụ ọrụ kpebiri ịkwaga Mexico City ma chọọ ka o soro ha. Diojany lara azụ iso ha gaa n’ihi na ọ ga-apụta na ọ gaghịzi na-ahụ Ndịàmà.

“Echegbula onwe gị,” ka ndị ọ na-arụrụ ọrụ mesiri ya obi ike, “Ndịàmà Jehova nọ ebe nile. Anyị ga-achọ ha ozugbo anyị ruru ebe ahụ.” N’ihi atụmanya ahụ na-enye obi ụtọ, Diojany kwetara iso ha gaa. Ozugbo ha ruru Mexico City, ndị Diojany na-arụrụ ọrụ chọrọ Ndịàmà. N’ihi ihe ụfọdụ, ha apụghị ịchọta ha, ọ bụ ezie na e nwere ihe karịrị Ndịàmà 41,000 na ọgbakọ 730 n’obodo ahụ.

N’oge na-adịghị anya, Diojany malitere inwe nkụda mmụọ n’ihi na o nwebeghị ike ịchọta Ndịàmà iji maliteghachi inwe mkparịta ụka ndị dabeere na Bible. Otu ụbọchị, nne ya ukwu bịakwutere ya, na-asị: “Ihe ọma emeerela gị! Chineke gị anụla ekpere gị.” Ka ọ na-enye ya otu akwụkwọ ozi, ọ sịrị: “Ndịàmà hapụụrụ gị akwụkwọ ozi a.” Ọ bụ akwụkwọ ozi Alejandra dere.

Diojany zutere nne Alejandra na nwanne Alejandra nke nwanyị, bụ́ Blanca, ma nakwere ọmụmụ Bible. Mgbe izu ụfọdụ gasịrị, o letara Alejandra, ha nwekwara obi ụtọ izute onwe ha. Alejandra gbara ya ume ịnọgide na-etinye uche n’ọmụmụ Bible ya ka o wee nwee ike inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.

Ka ọnwa ole na ole gasịrị, na July 2003, Alejandra nwụrụ, na-ahapụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ihe nlereanya ọma nke okwukwe na obi ike. N’olili ya, o metụrụ ọtụtụ ndị n’ahụ́ mgbe ha zutere Diojany ma nụ ka ọ na-ekwu, sị: “Alejandra na ezinụlọ ya abụworo m ihe nlereanya magburu onwe ya. Ekpebisiri m ike ijere Jehova ozi ma ghọọ onye e mere baptizim n’oge na-adịghị anya. Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ Alejandra ọzọ na Paradaịs na-abịanụ!”

Ee, akwụkwọ ozi pụrụ ịbụ ihe dị nta. Ma lee mmetụta dị mma na nke na-adịgide adịgide ọ pụrụ inwe!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya