Kụziere Ụmụ Gị Ito Jehova
1. Ụmụntakịrị hà pụrụ ito Jehova?
1 Abụ Ọma 148:12, 13 na-agba ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ume ka ha “too aha Jehova.” N’Akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ụmụaka mere otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ‘Samuel nọ na-eje ozi n’ihu Jehova mgbe ọ bụ nwata.’ (1 Sam. 2:18) Ọ bụ “otu nwa agbọghọ nta” gwara nwunye Neeman na onye amụma Jehova nke nọ n’Izrel ga-agwọtali ọrịa ekpenta Neeman. (2 Eze 5:1-3) Mgbe Jizọs gara n’ụlọ nsọ ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube, ọ bụ “ụmụ okoro” tiri mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!” (Mat. 21:15) Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi kụziere ụmụ ha ito Jehova?
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ na-esetịpụrụ ụmụ ha ezi ihe nlereanya?
2 Na-esetịpụrụ Ha Ezi Ihe Nlereanya: A gwara ndị Izrel bụ́ nna ka ha buru ụzọ hụ Jehova n’anya ma kụnye iwu ya n’obi nke ha onwe ha tupu ha akụnye eziokwu ahụ n’ime obi ụmụ ha. (Deut. 6:5-9) Ọ bụrụ na ị na-ekwu okwu ọma banyere ozi ọma, meekwa ka ọ bụrụ otu n’ime ihe ndị ị na-eme kwa izu, ụmụ gị ga-amụta ịdị na-ele ozi ọma anya dị ka ihe dị mkpa na ihe na-eju afọ.
3. Olee otú otu nwanna nwanyị si rite uru site n’ihe nlereanya nke ndị mụrụ ya?
3 Otu nwanna nwanyị ji obi ụtọ kwuo, sị: “Mgbe m ka na-eto eto, ije ozi ọma ná ngwụsị izu so n’otu n’ime ihe ndị ezinụlọ anyị na-eme kwa izu. Ahụrụ m na ikwusa ozi ọma na-atọ ndị mụrụ m ụtọ nke ukwuu. Anyị tolitere ma na-ele ozi ọma anya dị ka ihe na-enye obi ụtọ.” Nwanna nwanyị a ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim mgbe ọ dị afọ asaa, o jewokwa ozi oge nile ugbu a ruo ihe karịrị afọ 32.
4. Olee otú e si enye ụmụaka ọzụzụ na-aga n’ihu n’ihu?
4 Ọzụzụ Na-aga n’Ihu n’Ihu: Na-akpọnụ ụmụ unu aga ozi ọma. Ha nwere ike ịkụ aka n’ụzọ, nyefee onye nwe ụlọ traktị, ma ọ bụkwanụ gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Nke a ga-eme ka ha nwekwuo obi ụtọ, ọ ga-emekwa ka obi sie ha ike na ha ga-ekwusali ozi ọma Alaeze ahụ. Ka ha na-etolite, ha kwesịrị ịdị na-agachikwu ozi ọma anya. N’ihi ya, nyere ha aka inwe ọganihu na iche echiche banyere ihe mgbaru ọsọ ndị ha pụrụ isetịpụrụ onwe ha n’ozi Jehova.
5. Olee ihe a chọrọ n’aka nwatakịrị iji ruo eruo ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim?
5 Ozugbo ọ dị gị ka ụmụ gị hà eruola ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, ha ekwuokwa na ha chọrọ ịghọ, mee ka ndị okenye mara banyere ya. Ọ bụrụ na ụmụ gị aghọọ ndị nkwusa, nke ahụ ga-eme ka ha mara na ito Jehova bụ ọrụ dịịrị ha n’otu n’otu. Ghọta na ọ dịghị mkpa ka nwatakịrị mara ihe ruo ókè onye torurula ogo mmadụ e merela baptizim maara tupu ya eruo eruo ịghọ onye nkwusa. Nwa gị ọ̀ maara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible? Ọ̀ na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible? Ọ̀ na-agụ ya agụụ iso gaa ozi ọma ma chọọkwa ka a mara ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ya bụrụ otú ahụ, ndị okenye nweziri ike ikpebi ma ò ruru eru ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.—Lee akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 79-82.
6. Gịnị mere o ji baa uru ka ndị mụrụ ụmụ na-azụ ụmụ ha?
6 Ịkụziri ụmụaka iji obi ha na-eto Jehova bụ ihe a na-agbara mbọ. Otú ọ dị, o nweghị ihe na-enye ndị mụrụ ụmụ ọṅụ karịa ịhụ ụmụ ha ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Nke ka mkpa bụ na obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe ụmụaka na-akpọsa oké ọrụ ya dị iche iche.