Ndị Mụrụ Ụmụ—Zụọnụ Ụmụ Unu Ime Nkwusa
1 E ji ọtụtụ ụmụaka nwere ezi ọchịchọ ijere Chineke ozi wee gọzie ọgbakọ anyị dị iche iche. (Ekli. 12:1) Ha so ná ndị Jehova kpọrọ ikere òkè n’ito ya. (Abụ Ọma 148:12-14) Ya mere, ọzụzụ ndị mụrụ ụmụ na-enye ụmụ ha kwa ụbọchị kwesịrị ịgụnye ntụziaka n’ụzọ isi soro ndị ọzọ kerịta okwukwe ha n’ọrụ nkwusa Alaeze.—Deut. 6:6, 7.
2 Zụọ Ụmụaka n’Ụzọ Na-aga n’Ihu n’Ihu: Ụmụaka kwesịrị ka a zụọ ha n’oge ha dị ntakịrị isonyere ndị mụrụ ha n’ozi. Tupu a gawa ozi, kwadebe ụmụ gị ikere òkè n’ụzọ bara uru. Buru ụzọ kpebie ihe ị na-atụ anya ka ha mee n’ọnụ ụzọ. Ụmụaka dị nnọọ ntakịrị pụrụ inyefe traktị na mpempe akwụkwọ ma kpọọ ndị mmadụ ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A pụrụ ịkpọ ndị na-eto eto na-agụ ihe nke ọma ịgụpụta akụkụ akwụkwọ nsọ n’ọnụ ụzọ. Ha pụrụ inyefe magazin, na-eji ụzọ dị nkenke nke iche ihe n’ihu mmadụ eme ihe. Ka ha na-enweta ahụmahụ, zụọ ha iji Bible eme ihe n’ụzọ ha si eche ihe n’ihu mmadụ. Ọtụtụ ndị nkwusa na-eto eto amalitewo ụzọ magazin nke ha ma na-ejechi nletaghachi anya. Ọ kasị mma nwatakịrị iso onye toworo eto na-arụ ọrụ kama iso onye na-eto eto ọzọ. Onye ahụ toworo eto pụrụ ịkọwara onye nwe ụlọ na a na-azụ onye ahụ na-eto eto n’ozi.
3 Otu obere nwa agbọghọ rịọrọ ndị okenye maka enyemaka ha ka o wee nwee ike iru eru dị ka onye nkwusa Alaeze. N’agbanyeghị na ọ dị nanị afọ ise mgbe ahụ ma bụrụ onye na-amaghị ka e si agụ ihe, ọ pụrụ iche ozi Alaeze ahụ n’ihu mmadụ n’ụzọ dị irè n’ọnụ ụzọ. O buuru ebe a pụrụ ịchọta akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’isi, sapeta ha, gwa onye nwe ụlọ ka ọ gụọ ha, mgbe ahụzi o nyere nkọwa ya.
4 E kwesịkwara ịkụziri ụmụaka site n’ihe nlereanya nke ndị mụrụ ụmụ abamuru nke inwe usoro ihe omume dị mma maka ikerechi òkè anya n’ozi. Ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa iguzobe usoro ime ihe chiri anya maka ozi ma rapagide na ya, ka ụmụaka wee mara akụkụ izu nke a na-ewepụta mgbe nile maka ọrụ nkwusa.
5 Mgbe a zụrụ ụmụaka site n’oge ha dị ntakịrị ịhụ ozi ahụ n’anya na ịnụ ụtọ ya, a ga-akwali ha iru eru maka ihe ùgwù ndị ka ukwuu n’ọdịnihu, ikekwe gụnyere ozi ọsụ ụzọ. (1 Kọr. 15:58) Anyị nile kwesịrị ịgba ụmụaka nọ n’etiti anyị ume inwe ọganihu dị mma dị ka ndị na-eto Jehova.