Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Isiokwu nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ ije ozi 2008 bụ “Anyị Bụ Ụrọ—Jehova Na-akpụ Anyị,” ọ dabekwaara n’Aịsaịa 64:8. Ndụmọdụ a ga-eji Akwụkwọ Nsọ nye anyị ná mgbakọ ahụ ga-eme nnọọ ka anyị ghọtakwuo amamihe, ikpe ziri ezi, ike, na ịhụnanya Jehova na-egosipụta dị ka Ọkpụite Ukwu.
Okwu onye nlekọta sekit ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Ije Ozi Ọma Dị Ka Arịa Ndị Kwesịrị Nsọpụrụ,” ga-egosi otú ọtụtụ ndị mmadụ si na-enweta ngọzi n’ihi ịmata eziokwu ahụ na ịkọrọ ya ndị ọzọ. Okwu nke isiokwu ya bụ “Ntụgharị Uche Ga-echebe Gị” ga-egosi anyị otú iji obi anyị nile atụgharị uche n’ụkpụrụ Jehova ndị ziri ezi si echebe anyị. Ọkà okwu si esi bịa ga-agwa ndị bịara mgbakọ ahụ okwu n’isiokwu ndị bụ́, “Kwụsịnụ Ịbụ Ndị Na-eme Omume Dị Ka Usoro Ihe Nke A Si Dị” na “Bụrụ Onye Ọkpụite Ukwu ahụ Na-akpụ.” Okwu ndị bụ́, “Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Baara Jehova Uru” na “Ọrụ Dị Mkpa Ndị Mụrụ Ụmụ Na-arụ n’Ịkpụ Ụmụ Ha,” ga-agba ndị nne na nna na ndị na-eto eto ume. Ihe ngosi na ajụjụ ọnụ ndị a ga-agba ndị mmadụ ga-atọ anyị ụtọ n’ihi na ha ga-eme ka anyị nụ ma hụ ihe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-arụzu n’ozi ha. Ndị chọrọ ka e mee ha baptizim iji gosi na ha ararala onwe ha nye Chineke kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ozugbo o kwere mee. Hụ na i ji Ụlọ Nche a ga-amụ n’izu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ bịa.
Ọkpụite Ukwu ahụ na-emezu ihe ọ bụla o zubere. Ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-ekwe ya kpụọ anyị. Dị ka ụrọ dị na wiil ọkpụite, e nwere ike ịkpụ, nụchaa, ma gbanwee ndị ji amamihe nabata ụkpụrụ Jehova na mgbazi ọ na-agbazi ha ma mee ka ha ghọọ arịa ndị bara uru. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova kpụọ anyị, anyị na-eto ọbụbụeze ya ma na-enweta ọtụtụ ngọzi.