Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/09 p. 3-4
  • Gbalịsie Ike Na-ezi Ụmụ Nwoke Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gbalịsie Ike Na-ezi Ụmụ Nwoke Ozi Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Kraịst Ndị Ezinụlọ Ha Na-abụghị Ndị Kraịst Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ì Nwere Ike Inyere Di ma Ọ Bụ Nwunye Na-ekweghị Ekwe Aka?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 8/09 p. 3-4

Gbalịsie Ike Na-ezi Ụmụ Nwoke Ozi Ọma

1. Olee mkpa e nwere n’ihe gbasara ilekọta ọrụ Alaeze ahụ?

1 Ebe ọ bụ na a ka nwere ọtụtụ ndị a ga-ekwusara ozi ọma Alaeze ahụ n’oge ikpeazụ a, ọ dị ezigbo mkpa ka e nwekwuo ụmụ nwoke ruru eru, ndị ga-abụ ndị nlekọta n’ọgbakọ. (Mak 4:30-32; Ọrụ 20:28; 1 Tim. 3:1-13) Ma n’ebe ụfọdụ, ụmụ nwaanyị na-aka anabata ozi ọma Alaeze ahụ karịa ụmụ nwoke. N’obodo ụfọdụ, ụmụ nwoke na-ewere na ọ bụ ndị nwunye ha ka okwu gbasara ife Chineke dịịrị nakwa na ịkụziri ụmụ ha Okwu Chineke bụ ọrụ dịịrị ndị nwunye ha. Olee otú anyị ga-esi nyekwuoro ụmụ nwoke aka ka ha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe ma soro anyị fewe Jehova?

2. Olee otú mbọ Pọl na Pita gbara zie ndị nwoke ozi ọma si rụpụta ezigbo ihe?

2 Na-achọ Ndị Nwoke Ị Ga-ezi Ozi Ọma: Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ anabata eziokwu, ndị ọzọ n’ezinụlọ ya na-esokarị ya bịa fewe Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe a tụrụ Pọl na Saịlas mkpọrọ maka ikwusa ozi ọma, ha ziri onye na-elekọta ụlọ nga ahụ ozi ọma. E mere nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya niile baptizim. (Ọrụ 16:25-34) Ozi ọma Pọl ziri na Kọrịnt mere ka ‘Krispọs, onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, ghọọ onye kwere ekwe n’Onyenwe anyị, otú ahụkwa ka ọ dị ezinụlọ ya dum.’ (Ọrụ 18:8) Jehova si n’aka Pita zie Kọniliọs ozi ọma. Kọniliọs bụ onyeisi ndị agha, a kpọkwara ya ‘nwoke obi ya dị ọcha, onye na-atụ egwu Chineke.’ E mere Kọniliọs, ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya baptizim.—Ọrụ 10:1-48.

3. Olee onye “nọ n’ọkwá dị elu” i nwere ike izi ozi ọma otú ahụ Filip mere?

3 Ọ bụrụ na e zie ụmụ nwoke “nọ n’ọkwá dị elu” ozi ọma, o nwere ike ịba ezigbo uru. (1 Tim. 2:1, 2) Dị ka ihe atụ, mmụọ ozi Jehova gwara Filip ka o zie otu nwoke nke “nwere ike dị ukwuu” ozi ọma, bụ́ onye na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị ndị Itiopia nwere. Filip nụrụ ka nwoke ahụ “na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma,” ma zie ya ozi ọma banyere Jizọs. Nwoke Itiopia a ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ọ ga-abụkwa na mgbe ọ na-ala obodo ya, o ziri ndị ọzọ ozi ọma. O nwekwara ike bụrụ na o ziri eze nwaanyị ahụ na ndị ọzọ nọ n’obí ya ozi ọma, bụ́ ndị ọ gaara esiri ike ịhụ onye ga-ezi ha ozi ọma.—Ọrụ 8:26-39.

4. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka ụmụ nwoke nwekwuo ohere ịnụ ozi ọma?

4 Chọtakwuo Ndị Nwoke: Ebe ọ bụ na ụmụ nwoke na-anọkarị n’ebe ha na-arụ ọrụ mgbe anyị na-abịa ozi ọma n’ụlọ ha, ì nwere ike ịhazigharị oge i ji aga ozi ọma ma wepụtakwuo oge ná mgbede, ná ngwụcha izu ma ọ bụ n’oge e nwere ezumike? Ị ga-enwekwu ohere izi ụmụ nwoke ndị na-anaghị anọkarị n’ụlọ ozi ọma ma ọ bụrụ na ị na-agakarị ozi n’ebe a na-azụ ahịa. Ụmụnna ndị nwoke ga-agbakwa mbọ hụ na ha na-ezi ụmụ nwoke ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ ozi ọma mgbe ha nọ n’ụlọ ọrụ ha. A gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, nke ka nke, n’ókèala a na-ezikarị ozi ọma na ya, mgbe ụfọdụ, ụmụnna ndị nwoke nwere ike jụọ ma nwoke nwe ụlọ ọ̀ nọ ya ka ha na ya nwee ike ikwurịta okwu.

5. Gịnị ka nwanna nwaanyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwoke o ziri ozi ọma egosi mmasị n’ozi Alaeze ahụ?

5 Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị enweta nwoke gere ya ntị, o kwesịghị ka naanị ya gaa nletaghachi na nke ya. Ya na di ya ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ nwere ike iso ma ọ gawa. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ya na nwoke ahụ agawa n’ihu, ọ ga-akacha mma ma o nyefee ya otu nwanna nwoke ruru eru ka o duziwezie ya.

6. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe Pọl onyeozi mere iji “rite ọtụtụ mmadụ n’uru”?

6 Họrọ Isiokwu Na-amasị Ụmụ Nwoke: Pọl onyeozi chebaara ndị ọ na-agwa okwu echiche, ma họrọ isiokwu ndị ga-eru ha n’obi ka o wee “rite ọtụtụ mmadụ n’uru.” (1 Kọr. 9:19-23) Anyị kwesịkwara iche echiche chọpụta isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị nwoke anyị ga-ahụ n’ozi ọma, ma kwadebe isiokwu ndị ahụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, ihe ndị na-echukarị ụmụ nwoke ụra bụ okwu gbasara ego, otú a ga-esi nwee ezigbo ọchịchị na otú ha ga-esi na-elekọta ezinụlọ ha. Ha nwekwara ike ịchọ ịma ihe mere anyị ji dịrị ndụ, otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu na ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị. Ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa ga-aka aba ha n’obi ma ọ bụrụ na anyị eburu ihe ndị a n’obi mgbe anyị na-agwa ha okwu.—Ilu 16:23.

7. Olee otú mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike isi nye aka mee ka di na-abụghị Onyeàmà bịara ọmụmụ ihe nwewekwuo mmasị n’eziokwu ahụ?

7 Nyere Ndị Isi Ezinụlọ Na-abụghị Ndịàmà Aka: Ọ bụ eziokwu na àgwà ọma ụmụnna anyị ndị nwaanyị na-aka emekarị ka ndị di ha, bụ́ ndị na-ekweghị ekwe, ghọọ ndị kwere ekwe, ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwekwara ike inye aka. (1 Pita 3:1-4) Ọ bụrụ na nwoke na-abụghị Onyeàmà esoro nwunye ya bịa ọmụmụ ihe, otú ụmụnna si nabata ya ga-agbara ya ezigbo àmà. Ọ ga-abụ na ọmụmụ ihe ahụ ọ bịara gosiri na o nwetụrụ mmasị n’eziokwu ahụ, o nwekwara ike chọọ ka e duziwere ya ọmụmụ Baịbụl.

8. Olee otú ụmụnna nwoke nwere ike isi nyere ndị di na-adịghị egosicha mmasị n’eziokwu ahụ aka?

8 E nwekwara ụfọdụ ndị di na-adịghị egosicha mmasị n’Okwu Chineke ná mbụ, ma e mechaa ha achọọ ka ha na otu nwanna nwoke ahụ́ na-eru ha ala ma ha na ya nọrọ mụwa Baịbụl. Ụmụnna nwoke nọ n’otu ọgbakọ gbara ezigbo mbọ na-aga oge ụfọdụ eleta otu ezinụlọ. Mgbe ọ bụla ha garuru, ha na-ahụ na ha na onyeisi ezinụlọ ahụ, onye na-abụghị Onyeàmà, kparịtara ihe ndị ha ma na ọ na-amasị ya. Ha mechara kparịtawa ihe ndị dị na Baịbụl, ugbu a kwa, e meela nwoke ahụ baptizim. Otu nwanna nwoke ọzọ nyeere otu di na-abụghị Onyeàmà aka mgbe ọ na-agba ụlọ ya ogige. Otú ahụ o si nyere ya aka mere ka nwoke ahụ kwe ka a mụwara ya Baịbụl. (Gal. 6:10; Fil. 2:4) Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, gbalịa ka i nyere otu n’ime ndị di a na-abụghị Ndịàmà aka.

9. Olee uru ịzụ ụmụ nwoke nọ n’ọgbakọ nwere ike ịba?

9 Zụọ Ha Maka Ọdịnihu: Ụmụ nwoke ndị nabatara ozi ọma Alaeze ahụ ma gbalịa ka ha ruo eruo inwe ihe ùgwù n’ozi Jehova nwere ike iso ‘n’onyinye n’ụdị mmadụ,’ ya bụ, ndị okenye ọgbakọ. Ndị okenye a na-eji ike ha na ume ha na-arụrụ ndị Jehova nọ n’ọgbakọ dị iche iche ọrụ. (Efe. 4:8; Ọma 68:18) Ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-azụ atụrụ Chineke, ha na-ejikwa obi ha niile eme ya. (1 Pita 5:2, 3) Ha na-abụrụ ụmụnna ha niile ezigbo ngọzi!

10. Olee otú mbọ Ananayas gbara inyere Pọl aka si baara ọtụtụ ndị uru?

10 Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na Sọl kpagbuburu Ndị Kraịst, ọ ghọrọ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 11:13) Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Ananayas ekwebughị ezi Sọl ozi ọma n’ihi ụdị onye Sọl bụ. Ma, Ananayas mechara mee ihe Onyenwe anyị gwara ya mee ma zie Sọl, onye mechara ghọọ Pọl onyeozi, ozi ọma. Ozi ọma Pọl ziri mechara baara ọtụtụ puku ndị nụrụ ya uru, ọ ka na-abakwara ọtụtụ nde ndị na-agụ akwụkwọ ozi ndị o dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke, uru taa.—Ọrụ 9:3-19; 2 Tim. 3:16, 17.

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee ihe niile anyị nwere ike ime iji zie ụmụ nwoke ozi ọma?

11 N’ihi ya, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na anyị na-ezi ụmụ nwoke ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú a, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba ime uche ya na ilebara ihe gbasara Alaeze ya anya nke ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya