Ì Nwere Ike Inyere Di ma Ọ Bụ Nwunye Na-ekweghị Ekwe Aka?
1. Gịnị mere na ọ bụghị naanị ụmụnna ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ ndị na-ekweghị ekwe chọrọ ka di ha ma ọ bụ nwunye ha bata n’eziokwu?
1 Ò nwere ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ unu di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ ndị na-ekweghị ekwe? Ọ bụrụ na e nwere, o doro anya na ndị nkwusa ndị ahụ chọrọ ka di ha ma ọ bụ nwunye ha bịa soro ha n’ezi ofufe. Ma ọ bụghị naanị ha chọrọ ka ọ dị otú ahụ. Ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ndị niile nọ n’ọgbakọ. (1 Tim. 2:4) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị bụ́ di ma ọ bụ ndị nwunye na-ekweghị ekwe aka, bụ́ ndị nwunye ha ma ọ bụ di ha nọ n’ọgbakọ anyị?
2. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị ghọta otú di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe si eche echiche?
2 Ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ịchọpụta otú onye ahụ na-ekweghị ekwe si ele ihe anya. Ọtụtụ ndị di na nwunye na-ekweghị ekwe hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya, na-agbalịkwa ịbụ ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye nakwa ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna. O nwekwara ike ịbụ na ha ji obi ha dum na-ekpe okpukpe ha na-ekpe. Ikekwe, ha amachaghị ndị Ndịàmà Jehova bụ, naanị ihe ha maara banyere ha bụ ihe ha nụrụ n’ọnụ ndị ọzọ na-amachaghịkwa ndị Ndịàmà Jehova bụ ma ọ bụ n’ọnụ ndị kpọrọ Ndịàmà asị. Ihe na-ewe ụfọdụ ndị iwe bụ na oge nwunye ha ma ọ bụ di ha bụ́ Onyeàmà na-eji aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma so n’oge ya na ezinụlọ ha ji anọbu. Ịghọta otú onye ahụ na-ekweghị ekwe si eche echiche ga-enyere anyị aka iji obiọma na-emeso ya ihe ma na-akwanyekwara ya ùgwù, ọ ga-emekwa ka ahụ́ ruo anyị ala mgbe anyị na ya nọ.—Ilu 16:20-23.
3. Olee otú kacha mma e nwere ike isi nyere onye na-ekweghị ekwe aka ịmata eziokwu?
3 Inwe Mmasị n’Ebe Ha Nọ: Otú kacha mma anyị ga-esi nyere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe aka ịbata n’eziokwu nwere ike ịbụ omume anyị, ọ bụghị ịgwa ya ihe Baịbụl kwuru, nke ka nke, mgbe anyị na ya ka na-achọ ịmata nke ọma. (1 Pita 3:1, 2) Otu ihe dị mkpa bụ igosi na anyị nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ụmụnna nwaanyị ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike igosi nwunye na-ekweghị ekwe na ha nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ebe ụmụnna nwoke nwere ike ime otu ihe ahụ n’ebe di na-ekweghị ekwe nọ. Olee otú ha ga-esi mee ya?
4. Olee otú anyị nwere ike isi gosi di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe na anyị nwere mmasị n’ebe ọ nọ?
4 Ọ bụrụ na gị na di ma ọ bụ nwunye ahụ na-ekweghị ekwe amatabeghị, i nwere ike ịgwa di ya ma ọ bụ nwunye ya nọ n’ọgbakọ unu na ị ga-achọ ịmata ya. N’oge mbụ gị na ya ga-ahụ, ewekwala iwe ma ọ bụrụ na ọ nabataghị gị nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ya na anyị nwere mmasị n’ebe ọ nọ nakwa na anyị chọrọ ịbụ enyi ya, o nwere ike ime ka o lewekwuo Ndịàmà Jehova anya ọma. (Rom 12:20) Ụfọdụ Ndị Kraịst torola eto akpọọla di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe na ezinụlọ ya oriri n’ụlọ ha. Ihe mere ha ji mee nke a bụ ka ha na onye ahụ na-ekweghị ekwe matakwuo, nakwa ka onye ahụ gbanwee obi ya ma ọ bụrụ na o nwere otú o si eburu Ndịàmà Jehova ihe na-adịghị mma n’obi. Ihe ha na onye ahụ na-ekweghị ekwe kparịtara bụ ihe ndị na-amasị onye ahụ, ọ bụghị ihe gbasara Baịbụl. Ka oge na-aga, ha na onye ahụ na-ekweghị ekwe mata nke ọma, ha na ya nweziri ike ịkparịtawa ihe dị na Baịbụl. O nwedịrị ike kweta ịbịa otu n’ime ọmụmụ ihe anyị iji chọpụta ihe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-amụ, nke ka nke, ugbu a ọ matarala ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụgodị na ọ chọghị ka a mụwara ya ihe, e kwesịrị ịja ya mma maka otú o si akwado di ya ma ọ bụ nwunye ya nọ n’ọgbakọ anyị.
5. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere onye na-ekweghị ekwe aka?
5 Ndị okenye, karịchaa, kwesịrị ịgbalị nyere ndị di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe aka, ha kwesịkwara ịchọpụta mgbe ohere ịgbara onye ahụ àmà dapụtara. Onye na-ekweghị ekwe bụ́ onye na-anaghị ekwe ka anyị na ya nwee mkparịta ụka si na Baịbụl nwere ike ige ntị n’agbamume si n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ma ọ rịawa ezigbo ọrịa. E nwee ihe mere n’ezinụlọ ebe di ma ọ bụ nwunye bụ onye na-ekweghị ekwe, dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ezinụlọ ha anwụọ, ndị okenye gaa ileta ha, ọ ga-adị mma ma ha gwa onye nke na-abụghị nwanna ka ọ nọrọ mgbe ha na-akasi ezinụlọ ahụ obi.
6. Olee ihe mere anyị ga-eji na-enyere ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-ekweghị ekwe aka?
6 Chegodị otú obi ga-adị nwanna nọ n’ọgbakọ anyị ma ọ bụrụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya emechaa nabata eziokwu ma bata n’ọgbakọ! Ihe ọma dị otú ahụ mee, ma Jehova ma ndị mmụọ ozi ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ. (Luk 15:7, 10) Ma, ọ bụrụ na onye ahụ na-ekweghị ekwe egosighị mmasị ná mmalite, anyị ka kwesịrị inwe obi ụtọ na mbọ anyị na-agba iji nyere onye ahụ aka na-amasị Jehova, bụ́ onye ‘na-achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’—2 Pita 3:9.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Otú kacha mma anyị ga-esi nyere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe aka ịbata n’eziokwu nwere ike ịbụ omume anyị, ọ bụghị ịgwa ya ihe Baịbụl kwuru, nke ka nke, mgbe anyị na ya ka na-achọ ịmata nke ọma