Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị ka ị ga-eme ma a gwa gị kwụsị ikwusa ozi ọma?
O nweela mgbe ndị uwe ojii gakwuuru ụmụnna nọ n’ozi ọma gwa ha na iwu obodo akwadoghị ka ha na-ekwusa ozi ọma, nakwa ka ha kwụsị ozi ọma ahụ ha na-ekwusa. A gwa gị ụdị ihe ahụ, jiri nwayọọ si n’ókèala ahụ pụọ n’egbughị oge. (Mat. 5:41; Fil. 4:5) Gị na ha agakwala rụwa ụka ma iwu ọ̀ kwadoro ka anyị kwusawa ozi ọma ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị. Ọ bụrụ na ọ dịịrị gị mfe, jiri akọ chọpụta aha onye uwe ojii ahụ na nọmba e dere n’uwe ya. Ị laruhaala, gaa gwa ndị okenye ihe ahụ merenụ, hanwa ga-emezi ka alaka ụlọ ọrụ mara. Ọ bụrụkwa na ị gaa ikwusa ozi ọma ná nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi, onye na-elekọta ebe ahụ asị gị pụọ, i kwesịrị ịpụwa ozugbo, hụkwa na ị kọọrọ ya ndị okenye. Anyị agaghị abanye ná nsogbu ma ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi ma ghara isiwe ọnwụ mgbe anyị na ndị isi na-emekọ ihe.—Ilu 15:1; Rom 12:18.