Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’October 26, 2009.
1. Ebe ọ bụ Jehova gwara Belam ka o soro ndị ikom Belak gawa, gịnị mere Jehova ji wesa Belam iwe mgbe o sooro ha? (Ọnụ Ọgụ. 22:20-22) [w04 8/1 p. 27 para. 2]
2. Ebe ọ bụ na Finihas ‘ekweghị ka a maa Jehova aka,’ olee ihe ihe ahụ o mere na-enyere anyị aka icheta banyere nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke? (Ọnụ Ọgụ. 25:11) [w95 3/1 p. 16 para. 13]
3. Gịnị mere e ji họrọ Jọshụa ka ọ nọchie anya Mozis? (Ọnụ Ọgụ. 27:15-19) [w02 12/1 p. 12 para. 1]
4. Olee otú Ọnụ Ọgụgụ 31:27 si agba Ndị Kraịst taa ume? [w05 3/15 p. 24]
5. Olee otú ndokwa e mere ka e nwee obodo mgbaba si baara ụmụ Izrel uru? (Ọnụ Ọgụ. 35:11, 12) [w95 11/15 p. 14 para. 17]
6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Onye Kraịst nwee ezi uche, oleekwa ihe ọ na-arụpụta? (Diut. 1:13) [w03 1/15 p. 30; w00 10/1 p. 32 para. 1-3]
7. Olee otú Iwu Mozis si mee ka ahụ ezi omume Chineke? (Diut. 4:8) [w02 6/1 p. 14 para. 8–p. 15 para. 9-10]
8. Jiri ihe e dere na Diuterọnọmi 6:16-18 kọwaa ụzọ ziri ezi na ụzọ na-ezighị ezi mmadụ ga-esi lee Jehova ule. [w04 9/15 p. 26 para. 5]
9. Olee otú okwu si n’ọnụ Jehova si gbooro ụmụ Izrel mkpa ha, oleekwa otú okwu ndị ahụ si egboro anyị mkpa anyị taa? (Diut. 8:3) [w99 8/15 p. 25-26]
10. Olee otú Diuterọnọmi 12:16, 24 si gbasa otú anyị si ewere iji ọbara mmadụ agwọ onye ahụ ọrịa? [w00 10/15 p. 30 para. 7]