Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na November 2
IZU NA-AMALITE NA NOVEMBER 2
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 14-18
Nke 1: Diuterọnọmi 15:1-15
Nke 2: Gịnị Ka Ịtụ Chineke Egwu Gụnyere?
Nke 3: Chineke Echeta Ọkpara Ya (lr isi nke 39)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jụọ ụfọdụ ndị nkwusa ị gwarala agwa ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị pụrụ iche ọgbakọ wepụtara maka ya. Kwuo ụbọchị ọzọ a haziri maka ịmalite ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ anyị gara na nke ndị nwe ụlọ, gwakwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ka ha mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee ya.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Jiri Akwụkwọ Ozi Na-agba Àmà. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 71 ruo peeji nke 73.