Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 39 p. 202-206
  • Chineke Echeta Ọkpara Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Echeta Ọkpara Ya
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Dị Ndụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jisọs Dị Ndụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 39 p. 202-206

ISI NKE 39

Chineke Echeta Ọkpara Ya

JIZỌS bere ákwá mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Ì chere na o wutere Jehova mgbe Jizọs tara ahụhụ ma nwụọ?— Bible kwuru na Chineke pụrụ inwe ‘mwute’ nakwa na ihe ndị na-emenụ pụrụ ọbụna ‘ịkpasu ya iwe.’—Abụ Ọma 78:40, 41; Jọn 11:35.

Cheedị echiche otú ọ na-aghaghị isiworị wute Jehova ịnọ na-ele Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ya anwụọ. Jizọs ji n’aka na Chineke agaghị echefu ya. Ọ bụ ya mere ihe ikpeazụ o kwuru tupu ya anwụọ ji bụrụ: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.”—Luk 23:46.

Jizọs ji n’aka na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, na a gaghị ahapụ ya “na Hel,” ma ọ bụ n’ili. Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, Pịta onyeozi hotara ihe e dere n’ime Bible banyere Jizọs, na-asị: “A hapụghị mkpụrụ obi ya na Hel, anụ ahụ́ ya ahụghịkwa ire ure.” (Ọrụ 2:31; King James Version; Abụ Ọma 16:10) Ee e, ahụ́ Jizọs anọteghị aka n’ili iji ree ure ma sie ísì.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ọbụna ndị na-eso ụzọ ya na ya agaghị anọte aka dị ka onye nwụrụ anwụ. Ọ kọwaara ha na ‘a ga-egbu ya, n’ụbọchị nke atọ kwa a ga-akpọlite ya.’ (Luk 9:22) Ya mere, n’ezie, ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị inweworị ihe ijuanya mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ma ò juru ha anya?— Ka anyị lee.

Onye Ozizi Ukwu ahụ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ n’ihe dị ka elekere atọ n’ehihie Friday. Josef, bụ́ nwoke bara ọgaranya nke so na Sanhedrin, bụkwa onye kwere na Jizọs na nzuzo. Mgbe ọ chọpụtara na Jizọs anwụọla, ọ gakwuuru Paịlet, bụ́ gọvanọ ahụ bụ́ onye Rom. Ọ rịọrọ ya ma ya pụrụ ibudata ozu Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ ahụ gaa lie ya. Mgbe e mesịrị, Josef buuru ozu Jizọs gaa n’otu ogige e nwere otu ili, nke bụ́ ebe a na-etinye ozu ndị nwụrụ anwụ.

Mgbe e tinyere ozu ya n’ili ahụ, a kpọreere otu nnukwute nkume mechie ọnụ ya. Ya mere, e mechiri ili ahụ. Ugbu a, ọ bụzi ụbọchị nke atọ, bụ́ Sunday. Anyanwụ awapụtabeghị, ya mere ọchịchịrị ka dị. Ndị mmadụ nọ n’ebe ahụ na-eche ili ahụ nche. Ndị nchụàjà zigara ha iche ya nche. Ị̀ ma ihe mere ha ji na-eche ya nche?—

Ndị nchụàjà n’onwe ha kwa anụwo na Jizọs sịrị na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ya mere, ndị nchụàjà mere ndokwa ka e nwee ndị nche n’ebe ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya wee ghara ịga zuru ozu ya wee kwuo na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Na mberede, ala malitere ịma jijiji. N’ọchịchịrị ahụ, ìhè nwuru. Ọ bụ mmụọ ozi Jehova! Ezigbo ụjọ jidere ndị agha ahụ nke na ha apụghị imegharị ahụ́. Mmụọ ozi ahụ gara n’ili ahụ kpọrepụ nkume ahụ. O nweghị ihe dị n’ime ili ahụ!

[Foto dị na peeji nke 202]

Gịnị mere na o nweghị ihe dị n’ili a? Olee ihe merenụ?

Ee, ihe ahụ Pita onyeozi mesịrị kwuo bụ eziokwu: “Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ.” (Ọrụ 2:32) Chineke mere ka Jizọs dị ndụ n’ahụ́ yiri nke Jizọs nwere tupu ya abịa n’ụwa. A kpọlitere ya n’ahụ́ mmụọ, ahụ́ dị ka nke ndị mmụọ ozi. (1 Pita 3:18) Ya mere, ka ndị mmadụ wee nwee ike ịhụ Jizọs anya, ọ ghaghị imere onwe ya anụ ahụ́. Ọ̀ bụ ihe o mere?— Ka anyị lee.

Ugbu a, anyanwụ awapụtawala. Ndị agha ahụ esiwo n’ebe ahụ pụọ. Meri Magdalin na ndị inyom ndị ọzọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aga n’ili ahụ. Ha nọ na-ekwurịta n’etiti onwe ha, sị: ‘Ònye ga-akwapụrụ anyị nnukwute nkume ahụ?’ (Mak 16:3) Ma mgbe ha rutere n’ili ahụ, a kwapụlarị nkume ahụ. O nweghịkwa ihe dị n’ili ahụ! Ozu Jizọs adịghị ebe ahụ! Ozugbo ahụ, Meri Magdalin gbapụrụ gawa ịchọ ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Ụmụ nwanyị ndị nke ọzọ nọdụrụ n’akụkụ ili ahụ. Ha nọ na-eche, sị: ‘Olee ebe ozu Jizọs dịkwanụ?’ Na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe na-egbuke egbuke pụtara. Ha bụ ndị mmụọ ozi! Ha sịrị ụmụ nwanyị ahụ: ‘Gịnị mere unu ji na-achọ Jizọs n’ebe a? A kpọlitere ya n’ọnwụ. Gaanụ ọsọ ọsọ gaa kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya.’ Cheedị echiche otú ụmụ nwanyị ahụ na-aghaghị isi gbaa ọsọ! Ka ha nọ na-aga, otu nwoke zutere ha. Ị̀ ma onye ọ bụ?—

Ọ bụ Jizọs, bụ́ onye yikwasịworo anụ ahụ́! Ọ sịkwara ụmụ nwanyị ahụ: ‘Gaanụ kọọrọ ndị na-eso ụzọ m.’ Ụmụ nwanyị ahụ nwere oké obi ụtọ. Ha hụrụ ndị ahụ na-eso ụzọ wee sị ha: ‘Jizọs dị ndụ! Anyị hụrụ ya!’ Meri agwaworị Pita na Jọn banyere ili ahụ ihe ọ bụla na-adịghị n’ime ya. Ugbu a, ha gawara ịga hụ ya, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a. Ha hụrụ ákwà e ji kechie Jizọs, ma ha amaghị ihe ha ga-asị merenụ. Ha chọrọ ikwere na Jizọs adịla ndụ ọzọ, ma o yiri ka ọ bụghị eziokwu.

[Foto dị na peeji nke 205]

Gịnị ka Pita na Jọn nwere ike ịdị na-eche n’uche ha?

Ka oge gatụkwuru na Sunday ahụ, Jizọs mere ka mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị nọ na-aga obodo nta bụ́ Emeọs hụ ya. Jizọs sooro ha na-aga, sorokwa ha na-ekwurịta okwu, ma ha amataghị onye ọ bụ n’ihi na ọ bụghị anụ ahụ́ ahụ o nwere na mbụ ka o nwere mgbe ahụ. Ọ bụ nanị mgbe Jizọs sooro ha rie nri, kpeekwa ekpere ka ha matara ya. Ndị ahụ na-eso ụzọ nwere oké obi ụtọ nke na ha mere ngwa ngwa gaa ọtụtụ kilomita laghachi Jeruselem! Ikekwe ọ bụ ntakịrị oge mgbe nke a gasịrị ka Jizọs mere ka Pita hụ ya iji gosi ya na Ya dị ndụ.

Ka oge na-aga, ná mgbede Sunday ahụ, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ zukọtara n’otu ọnụ ụlọ. A kpọchiri ọnụ ụzọ ya akpọchi. Na mberede, Jizọs batara, soro ha nọrọ kpọmkwem n’ime ọnụ ụlọ ahụ! Ugbu a ha amatawo n’ezie na Onye Ozizi Ukwu ahụ dị ndụ ọzọ. Lee obi ụtọ ha nwere!—Matiu 28:1-15; Luk 24:1-49; Jọn 19:38–20:21.

Ruo ụbọchị 40 Jizọs pụtara n’ụdị anụ ahụ́ dịgasị iche iche iji gosi ndị na-eso ụzọ ya na ya dị ndụ. Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ụwa laghachikwuru Nna ya n’eluigwe. (Ọrụ 1:9-11) N’oge na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịgwa mmadụ nile na Chineke mere ka Jizọs si n’ọnwụ bilie. Ọbụna mgbe ndị nchụàjà tiri ha ihe ma mee ka e gbuo ụfọdụ n’ime ha, ha nọgidere na-eme nkwusa. Ha maara na ọ bụrụ na ha anwụọ, Chineke ga-echeta ha dị nnọọ ka o chetara Ọkpara ya.

[Foto dị na peeji nke 206]

N’oge ahụ n’afọ bụ́ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, gịnị ka ọtụtụ ndị na-eche banyere ya? Ma gịnị ka ị na-eche banyere ya?

Lee ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge mbụ si dị nnọọ iche n’ebe ọtụtụ ndị nọ taa! N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị mmadụ na-eche echiche nanị banyere òké bekee Ista na àkwá Ista ndị nwere àgwà n’oge ahụ n’afọ bụ́ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ma Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere òké bekee Ista na àkwá Ista. O kwuru okwu banyere ijere Chineke ozi.

Anyị pụrụ ime dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere site n’ịgwa ndị mmadụ na Chineke mere ihe dị ebube mgbe ọ kpọlitere Ọkpara ya n’ọnwụ. Ọ dịghị mkpa ka anyị tụọ egwu mgbe ọ bụla, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ ekwuo na ha ga-egbu anyị. Ọ bụrụ na anyị anwụọ, Jehova ga-echeta anyị ma kpọlite anyị n’ọnwụ, dị nnọọ ka ọ kpọlitere Jizọs.

Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ ịmara na Chineke na-echeta ndị na-ejere ya ozi, ọbụna na ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ?— Ịmara ihe ndị a kwesịrị ime ka anyị chọọ ịmata otú anyị pụrụ isi mee ka Chineke nwee obi ụtọ. Ị̀ ma na anyị pụrụ ime ya n’ezie?— Ka anyị kwuo banyere nke a n’isiakwụkwọ na-esonụ.

Ikwere ná mbilite n’ọnwụ Jizọs kwesịrị ime ka olileanya na okwukwe anyị nwere sie ike. Biko gụọ Ọrụ 2:22-36; 4:18-20; nakwa 1 Ndị Kọrint 15:3-8, 20-23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya