ISI NKE 38
Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Hụ Jizọs n’Anya
KA E were ya na ị nọ n’ime ụgbọ mmiri na-ekpu ekpu. Ị̀ ga-achọ ka mmadụ bịa zọpụta gị?— Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ iji mee otú ahụ?— Ọ bụ ihe Jizọs Kraịst mere. Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 37, o nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta ka e wee nwee ike ịzọpụta anyị.
Otú ọ dị, Jizọs adịghị azọpụta anyị ka mmiri ghara iri anyị. Gịnị ka ọ na-azọpụta anyị na ya? Ì chetara ihe ọ bụ?— Site ná mmehie na ọnwụ nke anyị nile ketara site n’aka Adam. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị emewo ihe ndị dị oké njọ, Jizọs nwụkwara maka ha. Ị̀ ga-etinye ndụ gị n’ihe ize ndụ iji zọpụta ndị dị otú ahụ?—
Bible na-ekwu, sị: “O siri ike mmadụ ọ bụla ịnwụ maka onye ezi omume; n’ezie, ọ bụ maka ezi mmadụ, ma eleghị anya, ka mmadụ ga-anwadị anwa ịnwụ.” Ma, Bible na-akọwa na Jizọs ‘nwụrụ maka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.’ Nke ahụ na-agụnye ọbụna ndị na-adịghị ejere Chineke ozi! Bible gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe anyị ka bụ ndị mmehie [ka nọ na-eme ihe ọjọọ], Kraịst nwụrụ maka anyị.”—Ndị Rom 5:6-8.
Ị̀ pụrụ icheta otu onyeozi nke mere oké ihe ọjọọ na mbụ?— Onyeozi ahụ dere, sị: “Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie. Ná ndị a abụ m onye mbụ.” Onyeozi nke kwuru ihe a bụ Pọl. O kwuru na ọ dị mgbe ya “na-amaghị ihe,” na ya nọgidekwara “na-eme ihe ọjọọ.”—1 Timoti 1:15; Taịtọs 3:3.
Cheedị nnọọ echiche ịhụnanya Chineke nwere nke mere o ji zite Ọkpara ya ịbịa nwụọ maka ndị dị otú ahụ! Wetagodị Bible gị ma gụọ ya na Jọn isi 3, amaokwu 16. N’ebe ahụ ọ na-agụ, sị: “Chineke hụrụ ụwa [ya bụ, ndị mmadụ bi n’ụwa] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”
Olee ahụhụ Jizọs tara mgbe o nyefere ndụ ya maka anyị?
Jizọs gosiri na ya nwere ụdị ịhụnanya ahụ Nna ya nwere n’ebe anyị nọ. Ikekwe ị ga-echeta na anyị gụrụ n’Isi nke 30 nke akwụkwọ a banyere ụfọdụ n’ime ahụhụ ndị Jizọs tara n’abalị ahụ e jidere ya. A kpụụrụ ya gaa n’ụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Keifas, bụ́ ebe e kpere Ya ikpe. A kpọtara ndị akaebe ụgha bụ́ ndị ghagidere Jizọs ụgha, ndị mmadụ sukwara ya ọkpọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka Pita gọrọ na ya amaghị onye Jizọs bụ. Ugbu a, ka anyị were ya na anyị nọ kpọmkwem n’ebe ahụ nakwa na anyị na-ahụ ihe ndị ọzọ na-emenụ.
Chi abọọla. Jizọs mụ anya n’abalị ahụ nile. N’ihi na iwu akwadoghị ikpe ahụ e kpere ya n’abalị, ndị nchụàjà kpọkọtara Sanhedrin, ma ọ bụ ụlọikpe dị elu nke ndị Juu ngwa ngwa, ma kpee ya ikpe ọzọ. N’ebe a kwa, ha boro Jizọs ebubo na o mere ihe ọjọọ megide Chineke.
Ndị nchụàjà kwuziri ka e kee Jizọs agbụ, ha kpụkwaara ya gaa na nke Paịlet, bụ́ onye Rom bụ́ gọvanọ. Ha sịrị Paịlet: ‘Jizọs na-emegide ọchịchị. O kwesịrị ka e gbuo ya.’ Ma Paịlet hụrụ na ndị nchụàjà ahụ na-agha ụgha. Ya mere, Paịlet sịrị ha: ‘Ọ dịghị ihe ọjọọ m hụrụ n’ebe nwoke a nọ. M ga-ahapụ ya ka ọ gawara onwe ya.’ Ma ndị nchụàjà na ndị ọzọ tiri mkpu, sị: ‘Ee e! Gbuo ya!’
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Paịlet gbalịrị ọzọ ịgwa ndị ahụ na ya ga-ahapụ Jizọs ka ọ gawara onwe ya. Ma ndị nchụàjà kpasuru ìgwè mmadụ ahụ iti mkpu, sị: ‘Ọ bụrụ na ị hapụ ya, gị onwe gị kwa na-emegide ọchịchị! Gbuo ya!’ Ìgwè mmadụ ahụ malitere ime oké ụ̀zụ̀. Ị̀ ma ihe Paịlet mere?—
O kwenyere n’ihe ha kwuru. O bu ụzọ mee ka a pịa Jizọs ihe. Mgbe ahụ, ọ kpọọrọ ya kpọnye ndị agha ka ha gbuo ya. Ha kpukwasịrị Jizọs okpueze e ji ogwu kpaa, na-akwakwa ya emo site n’ịkpọrọ ya isiala. Ha bunyeziri Jizọs otu nnukwute ogwe osisi ka o buru, ha kpọkwaara ya gaa n’azụ obodo ahụ n’ebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi. N’ebe ahụ ha kpọgidere aka na ụkwụ Jizọs n’ogwe osisi ahụ. Ha buliziri osisi ahụ elu ka o guzoro ọtọ nke mere ka Jizọs kwụrụ n’elu osisi ahụ. Ọbara nọ na-agba ya. Ọ na-afụ ya ụfụ nke ukwuu.
Jizọs anwụghị ozugbo. Ọ kwụụrụ nnọọ n’elu osisi ahụ. Ndị isi nchụàjà ji ya na-eme ihe ọchị. Ndị na-agafe agafe kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke si n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata!” Ma Jizọs ma ihe Nna ya zitere ya ime. Ọ ma na ya aghaghị inyefe ndụ ya zuru okè ka anyị wee nwee ike inweta ohere ịdị ndụ ebighị ebi. N’ikpeazụ, n’ihe dị ka n’elekere anya atọ n’ehihie ahụ, Jizọs tikuru Nna ya wee nwụọ.—Matiu 26:36-27:50; Mak 15:1; Luk 22:39-23:46; Jọn 18:1-19:30.
Lee nnọọ otú Jizọs si dị iche n’Adam! Adam ahụghị Chineke n’anya. O nupụụrụ Chineke isi. Adam ahụghịkwa anyị n’anya. N’ihi na o mehiere, a mụrụ anyị nile n’ime mmehie. Ma Jizọs gosiri ịhụnanya n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe anyị nọ. O rubeere Chineke isi mgbe nile. O nyekwara ndụ ya ka o nwee ike iwepụ ihe ọjọọ Adam kpataara anyị.
Gịnị ka anyị pụrụ ime iji gosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya?
Ì nwere ekele maka ihe ahụ magburu onwe ya Jizọs mere?— Mgbe ị na-ekpegara Chineke ekpere, ị̀ na-ekele ya maka inye anyị Ọkpara ya?— Pọl onyeozi nwere ekele maka ihe Kraịst meere ya. Pọl onyeozi dere na Ọkpara Chineke “hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Galeshia 2:20) Jizọs nwụkwara maka mụ na gị. O nyere ndụ ya zuru okè ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi! N’ezie, nke ahụ bụ nnọọ ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji hụ Jizọs n’anya.
Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’obodo Kọrint akwụkwọ ozi, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-akpali anyị ime ihe.” Ụdị ihe dị aṅaa ka ịhụnanya Kraịst kwesịrị ịkpali anyị ime? Gịnị ka i chere?— Lee ihe Pọl zara: ‘Kraịst nwụrụ n’ihi mmadụ nile ka ha wee dịịrị Ya ndụ. Ha ekwesịghị ịdị ndụ iji na-eme ihe ga-atọ ha onwe ha ụtọ.’—2 Ndị Kọrint 5:14, 15, New Life Version.
Ị̀ ga-echeta ụzọ ndị ị pụrụ isi gosi na ị na-ebi ndụ iji na-eme ihe na-atọ Kraịst ụtọ?— Otu ụzọ bụ site n’ịgwa ndị ọzọ ihe ị mụtara banyere ya. Ma ọ bụ cheedị echiche banyere nke a: I nwere ike ịnọ nanị gị, ya mere nne gị ma ọ bụ nna gị agaghị na-ahụ ihe ị na-eme, mmadụ ọ bụla ọzọ apụghịkwa ịhụ gị. Ị̀ ga-ekiri ihe omume TV ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ ị ma na ha agaghị amasị Jizọs?— Cheta na Jizọs dị ndụ ugbu a, ọ pụkwara ịhụ ihe nile anyị na-eme!
Olee onye pụrụ ịhụ ihe nile anyị na-eme?
Ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji hụ Jizọs n’anya bụ na anyị chọrọ iṅomi Jehova. Jizọs sịrị: ‘Nna m hụrụ m n’anya.’ Ị̀ ma ihe mere o ji hụ Jizọs n’anya na ihe mere anyị onwe anyị kwa kwesịrị iji hụ Jizọs n’anya?— Ọ bụ n’ihi na Jizọs dị njikere ịnwụ ka e wee mezuo uche Chineke. (Jọn 10:17) Ya mere, ka anyị na-eme ihe Bible gwara anyị mee: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, nọgidekwanụ na-eje ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara unu n’anya ma nyefee onwe ya maka unu.”—Ndị Efesọs 5:1, 2.
Iji mee ka ị na-enwekwu ekele nye Jizọs nakwa maka ihe o meere anyị, biko gụọ Jọn 3:35; 15:9, 10; nakwa 1 Jọn 5:11, 12.