Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 30 p. 157-161
  • Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 30 p. 157-161

ISI NKE 30

Enyemaka Iji Merie Egwu Na-atụ Anyị

Ọ̀ DỊỊRỊ gị mfe ijere Jehova ozi?— Onye Ozizi Ukwu ahụ ekwughị na ọ ga-adị mfe. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo m asị tupu ọ kpọọ unu asị.”—Jọn 15:18.

Pita turu ọnụ na ya enweghị ike ịhapụ Jizọs ma ọlị, ma Jizọs kwuru na Pita ga-agọ ugboro atọ n’abalị ahụ na ya amaghị onye ya bụ. Pita mekwara otú ahụ kpọmkwem! (Matiu 26:31-35, 69-75) Olee otú ụdị ihe ahụ pụrụ isi mee?— O mere n’ihi na ụjọ jidere Pita, otú ahụ ka ọ dịkwa ndịozi ndị nke ọzọ.

Ị̀ ma ihe mere ụjọ ji jide ndịozi ahụ?— Ọ dị otu ihe dị oké mkpa ha na-emeghị. Ịmụta nke a pụrụ inyere anyị aka ijere Jehova ozi, ihe ọ sọkwara mmadụ ọ bụla gwa anyị ma ọ bụ mee anyị. Otú ọ dị, iji malite, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe mere n’abalị ikpeazụ ahụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ.

Nke mbụ, ha mekọrọ Ememe Ngabiga ọnụ. Nke a bụ nri pụrụ iche a na-eri kwa afọ iji chetara ndị Chineke nnapụta a napụtara ha n’ịbụ ohu n’Ijipt. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs malitere nri ọzọ pụrụ iche mgbe ya na ha nọ. Anyị ga-atụle ya n’isiakwụkwọ ka dị n’ihu ma kọwaa otú nri ahụ si enyere anyị aka icheta Jizọs. Mgbe ha risịrị nri ahụ, mgbe Jizọs gwasịkwara ndịozi ya okwu agbamume, ọ kpọọrọ ha gaa n’ogige Getsemeni. Nke a bụ ebe ha na-enwekarị mmasị ịga, ebe ha gawokwara ọtụtụ mgbe.

Mgbe ha nọ n’ogige ahụ, Jizọs pụrụ nanị ya ịga kpee ekpere. Ọ gwakwara Pita, Jems, na Jọn ka ha na-ekpe ekpere. Ma ha hiwere ụra. Jizọs pụrụ ugboro atọ nanị ya ịga kpee ekpere, ọ laghachitekwara ugboro atọ ahụ wee hụ Pita na ndị nke ọzọ ka ha nọ na-ehi ụra! (Matiu 26:36-47) Ị̀ ma ihe mere ha kwesịrị ijiworị mụrụ anya na-ekpe ekpere?— Ka anyị kwuo banyere ya.

[Foto dị na peeji nke 159]

N’ihi gịnị ka Pita, Jems, na Jọn gaara eji mụrụ anya?

Judas Iskarịọt so Jizọs na ndịozi ndị nke ọzọ mee Ememe Ngabiga n’uhuruchi ahụ tupu mgbe ahụ. Dị ka i nwere ike icheta, Judas aghọworị onye ohi. Ugbu a, ọ ghọrọ onye nraranye. Ọ ma ebe Jizọs na ndịozi ya zukọtaworo ọtụtụ mgbe n’ogige Getsemeni. Ya mere, Judas kpọọrọ ndị agha bịa n’ebe ahụ ịbịa jide Jizọs. Mgbe ha rutere, Jizọs jụrụ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?”

Ndị agha ahụ zara ya, sị: ‘Ọ bụ Jizọs.’ Egwu adịghị atụ Jizọs, ya mere, ọ sịrị ha: “Ọ bụ m.” Obi ike Jizọs nwere juru ndị agha ahụ anya nke na ha lara azụ wee daa n’ala. Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: ‘Ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndịozi m ka ha laa.’—Jọn 18:1-9.

Mgbe ndị agha ahụ jidere Jizọs kee ya agbụ, ụjọ jidere ndịozi ya ha wee gbaa ọsọ. Ma, Pita na Jọn chọrọ ịma ihe ga-emenụ, ya mere ha nọ ebe dịtụ anya ma na-eso ha n’azụ. N’ikpeazụ, a kpụụrụ Jizọs bịa n’ụlọ Keifas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà. Ebe nnukwu onye nchụàjà ahụ maara Jọn, onye nche ọnụ ụzọ kwere ka ya na Pita bata n’ime ogige ụlọ ahụ.

Ndị nchụàjà ezukọtaworị n’ụlọ Keifas maka ikpe ikpe. Ha chọrọ ka e gbuo Jizọs. Ya mere, ha kpọtara ndị akaebe, ndị ghagidere ya ụgha. Ndị ahụ suru Jizọs ọkpọ, maakwa ya ụra. Ka ihe a nile nọ na-eme, Pita nọ nso.

Otu nwa agbọghọ, bụ́ onye nche ọnụ ụzọ, nke kwere ka Pita na Jọn bata, hụrụ Pita. Ọ sịrị: ‘Gị onwe gị kwa na Jizọs nọrọ!’ Ma, Pita gọrọ na ya amadịghị onye Jizọs bụ. Mgbe nwa oge gasịrị, nwa agbọghọ ọzọ matara na ọ bụ Pita wee gwa ndị guzo n’akụkụ ebe ahụ, sị: ‘Nwoke a na Jizọs nọrọ.’ Pita gọrọ ọzọ na ya amaghị onye ọ bụ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ìgwè mmadụ ụfọdụ hụrụ Pita wee sị ya: “N’ezie gị onwe gị kwa bụ otu n’ime ha.” Pita gọrọ agụgọ nke ugboro atọ, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!” Pita ọbụna ṅụrụ iyi na ya na-ekwu eziokwu, Jizọs tụgharịrị lee ya anya.—Matiu 26:57-75; Luk 22:54-62; Jọn 18:15-27.

[Foto dị na peeji nke 160]

Gịnị mere Pita ji tụọ nnọọ egwu nke na ọ ghara ụgha na ya amaghị onye Jizọs bụ?

Ị̀ ma ihe mere Pita ji ghaa ụgha?— Ee, ọ bụ n’ihi na ụjọ ji ya. Ma, gịnị mere o ji na-atụ ụjọ? Olee ihe ọ na-emeghị bụ́ ihe gaara eme ka o nwee obi ike? Chee echiche. Gịnị ka Jizọs mere iji nwee obi ike?— O kpegaara Chineke ekpere, Chineke nyekwaara ya aka inwe obi ike. Chetakwa, Jizọs gwara Pita ugboro atọ ka ọ na-ekpe ekpere, ka ọ mụrụkwa anya ma nọrọ na nche. Ma, gịnị mere?—

N’oge nke ọ bụla, Pita hiwere ụra. O kpeghị ekpere, ọ nọghịkwa na nche. Ya mere, mgbe e jidere Jizọs, ọ tụghị anya ya. Ka e mesịrị, n’oge a na-ekpe Jizọs ikpe, mgbe ha tiri Jizọs ihe ma mee atụmatụ igbu ya, egwu tụrụ Pita. Otú ọ dị, nanị awa ole na ole tupu mgbe ahụ, gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya ka ha tụọ anya ya?— Jizọs gwara ha na ụwa ga-akpọ ha asị, dịkwa nnọọ ka ọ kpọrọ ya.

[Foto dị na peeji nke 160]

N’ụzọ dị aṅaa ka ị pụrụ isi nọrọ n’ụdị ọnọdụ yiri nke Pita?

Ugbu a, ka anyị chee echiche ihe nwere ike ime anyị bụ́ nke yiri ihe mere Pita. Ka e were ya na ị nọ n’ime klas mgbe ndị ọzọ malitere ikwu okwu ọjọọ banyere ndị na-adịghị ekele ọkọlọtọ ma ọ bụ ndị na-adịghị agba Krismas. Gịnị ma ọ bụrụ na otu onye atụgharịa jụọ gị, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ị dịghị ekele ọkọlọtọ?” Ma ọ bụ, ndị ọzọ asị: “Anyị nụrụ ọbụna na ị dịghị agba Krismas!” Ị̀ ga-atụ ụjọ ịgwa ha ihe bụ́ eziokwu?— Ọ̀ ga-adị gị ka ọ bụ gị ghaa ụgha, otú Pita ghara?—

Mgbe e mesịrị, o wutere Pita nke ukwuu na ya gọrọ agọ na ya amaghị onye Jizọs bụ. Mgbe ọ ghọtara ihe o mere, ọ pụrụ n’èzí bee ákwá. Ee, ọ laghachikwuuru Jizọs. (Luk 22:32) Ugbu a, cheedị echiche banyere ya. Olee ihe pụrụ inyere anyị aka ka anyị ghara ịtụ oké egwu nke na anyị ga-ekwu ụdị ihe ahụ Pita kwuru?— Cheta, Pita ekpeghị ekpere, ọ nọghịkwa na nche. Ya mere, olee ihe ị ga-asị na ọ dị mkpa ka anyị mee iji bụrụ onye na-eso ụzọ Onye Ozizi Ukwu ahụ?—

N’ezie, ọ dị anyị mkpa ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka. Mgbe Jizọs kpere ekpere, ị̀ ma ihe Chineke meere ya?— O zipụrụ otu mmụọ ozi ịga mee ka ọ dị ike. (Luk 22:43) Ndị mmụọ ozi Chineke hà pụrụ inyere anyị aka?— Bible na-ekwu, sị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.” (Abụ Ọma 34:7) Ma, iji nweta enyemaka Chineke, ọ dị mkpa ka anyị mee ihe ọzọ ma e wezụga ikpe ekpere maka ya. Ị̀ ma ihe ọzọ ọ dị mkpa ka anyị mee?— Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha mụrụ anya ma nọrọ na nche. Olee otú i chere anyị pụrụ isi mee nke a?—

Ọ dị mkpa ka anyị na-ege ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu ná nzukọ Ndị Kraịst, na-aṅakwa ntị n’ihe anyị na-agụta na Bible. Ma, ọ dịkwa anyị mkpa ịdị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe nile ma na-arịọ ya ka o nyere anyị aka ijere ya ozi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, a ga-enyere anyị aka imeri egwu anyị na-atụ. Mgbe ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ mgbe anyị nwere ohere ịkọrọ ndị ọzọ banyere Onye Ozizi Ukwu ahụ na Nna ya.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a pụrụ inyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ma ọlị ka ịtụ ndị ọzọ egwu gbochie anyị ime ihe ziri ezi: Ilu 29:25; Jeremaịa 26:12-15, 20-24; nakwa Jọn 12:42, 43.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya