Ihe Iri na Abụọ Mere Anyị Ji Ekwusa Ozi Ọma
Gịnị mere anyị ji aga n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma? Gịnịkwa mere anyị ji eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl? Ọ̀ bụ naanị ka anyị nyere ndị nwere ezi obi aka ka ha bata n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ? (Mat. 7:14) Nke ahụ bụ ihe mbụ mere anyị ji ekwusa ozi ọma. Ma, ọ bụghị ya bụ isi ihe mere anyị ji eme ya. N’okpuru ebe a, ị ga-ahụ ihe iri na abụọ mere anyị ji ekwusa ozi ọma. Ma, olee nke n’ime ha ka ị ga-asị na ọ bụ ya kacha mkpa?
1. E ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-azọ ndụ ndị mmadụ.—Jọn 17:3.
2. E ji ya na-adọ ndị ọjọọ aka ná ntị.—Ezik. 3:18, 19.
3. Ọ na-emezu amụma e dere na Baịbụl.—Mat. 24:14.
4. Ọ na-egosi na Chineke bụ onye ezi omume. Jehova mechaa gbuo ndị ọjọọ, o nweghị onye ga-asị na o nyeghị ha ohere ka ha chegharịa.—Ọrụ 17:30, 31; 1 Tim. 2:3, 4.
5. Chineke ji ọbara Jizọs zụta ụmụ mmadụ. Ozi ọma anyị na-ekwusa na-egosi na anyị na-akwụ ụgwọ anyị ji inyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma.—Rom 1:14, 15.
6. Ọ na-eme ka ikpe ọbara ụmụ mmadụ ghara ịma anyị.—Ọrụ 20:26, 27.
7. O so n’ihe anyị ga-eme ka a zọpụta anyị.—Ezik. 3:19; Rom 10:9, 10.
8. Ọ na-egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya.—Mat. 22:39.
9. O gosiri na anyị na-erubere Jehova na Ọkpara ya isi.—Mat. 28:19, 20.
10. Ọ bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova.—Hib. 13:15.
11. Anyị ji ya egosi Chineke na anyị hụrụ ya n’anya.—1 Jọn 5:3.
12. E ji ya na-edo aha Jehova nsọ.—Aịza. 43:10-12; Mat. 6:9.
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ihe iri na abụọ a mere anyị ji ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike. Anyị na-ekwusa ya, anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) Ma, ihe kacha mkpa mere anyị ji ekwusa ozi ọma bụ nke 12. Ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị, e ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-edo aha Chineke nsọ. Ọ na-emekwa ka Jehova hụ ihe ọ ga-eji zaa onye na-akwa ya emo okwu. (Ilu 27:11) N’eziokwu, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-ezisa ozi ọma banyere Kraịst n’akwụsịghị akwụsị.—Ọrụ 5:42.