Chebe Akọnuche Gị
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ 2013? Gịnịkwa ka ọ ga-enyere anyị aka ịma?
1 Kwa ụbọchị, a na-anwa anyị ọnwụnwa ime ihe ọ ga-abụ anyị mechaa akọnuche anyị amawa anyị ikpe. Mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ 2013 ga-enyere anyị aka ichebe akọnuche anyị. Isiokwu ya bụ, “Chebe Akọnuche Gị.” (1 Tim. 1:19) Mgbakọ a ga-amalite n’ọnwa Febụwarị 2013. Ọ ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma otú onye nyere anyị ya si chọọ.
2. Olee ajụjụ asaa dị mkpa mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga ga-enyere anyị aka ịza?
2 Ihe Ndị Anyị Ga-atụ Anya Ịnụ: Mgbakọ ahụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ asaa dị mkpa gbasara akọnuche. Ajụjụ ndị ahụ bụ:
• Olee ihe ndị nwere ike imebi akọnuche anyị?
• Olee otú anyị ga-esi zụọ akọnuche anyị?
• Gịnị ka anyị ga-eme ka ikpe ọbara onye ọ bụla ghara ịma anyị?
• Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru, gịnị ka ọ na-egosi?
• Gịnị ka anyị ga-eme ka ndị ọzọ ghara ịsụ ngọngọ?
• Ndị na-eto eto, gịnị ga-enyere unu aka ka unu ghara ime omume ọjọọ ndị ọgbọ unu na-achọ ka unu mee?
• Olee uru mmadụ ga-erite ma ọ na-eme ihe akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ gwara ya?
3. Olee uru anyị ga-erite ná mgbakọ a?
3 Jehova na-ezi anyị ụzọ anyị ga-eje ije na ya. (Aịza. 30:21) Ọ bụrụ na anyị egee ya ntị, Setan agaghị eduhieli anyị. Anyị agaghịkwa eme ihe ga-emebi akọnuche anyị. Mgbakọ a anyị ga-aga bụ otu n’ime ụzọ Jehova si egosi anyị ụzọ. N’ihi ya, hazie onwe gị nke ọma ka i nwee ike ịga ya. Hụkwa na i gere ntị n’ihe niile a ga-ekwu. E mechaa, chebara ihe ị nụrụ echiche ka ị mara otú ị ga-esi mee ya eme. Unu laruo n’ezinụlọ unu, kwurịtanụ ihe unu mụtara ná mgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị mụtara ná mgbakọ a, anyị ga-enwe ezi akọnuche. Anyị agaghịkwa eme ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma.—1 Pita 3:16.