“Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
1. Ọ bụrụ na iwe abịa onye anyị gara izi ozi ọma, olee otú Ndị Rom 12:18 ga-esi nyere anyị aka?
1 Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo. Ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ bụkwa ozi udo. (Aịza. 52:7) Ma mgbe ụfọdụ, iwe na-abịa ndị mmadụ ma anyị gaa izi ha ozi ọma. Gịnị ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị ma ndị anyị gara izi ozi ọma wewe iwe?—Rom 12:18.
2. Olee ihe ọ ga-abụ anyị cheta anyị aghara ịgwa ndị mmadụ okwu ọjọọ ma ha jụ ige anyị ntị?
2 Ghọta Ihe Mere na Ọ Chọghị Ige Ntị: O nwere ndị iwe na-ewe ma ha hụ anyị n’ihi na ha achọghị ịnụ ozi anyị. Nweekwa ndị nke iwe na-ewe n’ihi ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na oge anyị ji bịa na nke ha adịghị ha mma. O nwekwara ike ịbụ na o nwere nsogbu ha na ya na-alụ. Ọ bụrụgodị na ọ bụ ozi ọma anyị bịara izi mmadụ mere o ji na-ewe iwe, cheta na o nwere ike ịbụ n’ihi ihe a gwara ya banyere anyị. (2 Kọr. 4:4) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe ndị a n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịmata na ọ bụghị anyịnwa ka ha na-ewesa iwe. Ọ ga-emekwa ka anyị ghara ịgwa ha okwu ọjọọ.—Ilu 19:11.
3. Olee otú anyị ga-esi kwanyere onye anyị gara na nke ya ùgwù?
3 Kwanyere Ha Ùgwù: Ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ihe ndị ha kweere ha na-agaghị achọ ịhapụ ahapụ. (2 Kọr. 10:4) Ọ bụ ha ga-ekpebi ma hà ga-ege anyị ntị, ọ bụghị anyịnwa. Anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-egosi na anyị na-eleda ha anya ma ọ bụ na anyị ka ha mara Baịbụl. Ha sị anyị lawa, anyị kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù, lawa.
4. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma onye anyị gara izi ozi ọma gwa anyị okwu ọjọọ?
4 Agwala Ha Okwu Ọjọọ: Ọ bụrụ na onye anyị gara izi ozi ọma agwa anyị okwu ọjọọ, anyị ekwesịghị ịgwagwara ya. (Kọl. 4:6; 1 Pita 2:23) Anyị gaa ozi ọma, kama anyị na mmadụ ga-arụwa ụka, anyị kwesịrị ịgbalị kwuo banyere ihe onye ahụ kweere nke anyịnwa kwekwara. Anyị nwere ike meda obi ala jụọ ya ihe mere na ọ chọghị ige ozi ọma. Ma mgbe ụfọdụ, ọ ga-aka mma ka anyị hapụ onye ahụ gawa ebe ọzọ, ka iwe ghara iwekwu ya.—Ilu 9:7; 17:14.
5. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ka anyị na onye anyị gara izi ozi ọma dịrị n’udo?
5 Ọ bụrụ na anyị agwagwaraghị onye anyị gara izi ozi ọma okwu ọjọọ, o nwere ike ime ka o gee ụmụnna anyị ntị n’oge ọzọ. (Rom 12:20, 21) Ọ bụrụgodị na ọ dị ka onye na-agaghị agbanwe agbanwe, o nwere ike imecha ghọọ Onyeàmà Jehova. (Gal. 1:13, 14) Ma ọ̀ ga-emecha gewe anyị ntị ma ọ bụ na ọ gaghị ege anyị ntị, anyị kwesịrị ịgba mbọ jide onwe anyị ma gbalịa ka anyị na ya dịrị n’udo. Anyị mee otú ahụ, anyị na-asọpụrụ Jehova ma na-achọ ozi ọma anyị na-ezi mma.—2 Kọr. 6:3.