Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-eme ma Ọ Bụrụ na A Nabataghị Anyị
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Ọtụtụ ndị anyị na-aga ozi ọma na nke ha na-anabata anyị. Ma, echefukwala na Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị ga-akpọ anyị asị. (Jọn 17:14) N’ihi ya, ọ gaghị eju anyị anya ma anyị gaa ozi ọma na nke mmadụ, ya ajụ ịnabata anyị. Ọ bụrụ na onye anyị gara izi ozi ọma anabataghị anyị, anyị kwesịrị ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ, bụ́ onye nwee ozi ọma a anyị na-ezi. (Rom 12:17-21; 1 Pita 3:15) Ime otú ahụ ga-eme ka ihe ghara ịka njọ. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ hụrụ àgwà ọ kpasoro anyị mara na ọ bụ Jehova ka anyị na-ejere ozi. Ha nwekwara ike iji maka otú anyị si kpaa àgwà gee ụmụnna anyị ntị n’oge ọzọ.—2 Kọr. 6:3.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu na-enwe ofufe ezinụlọ, mụgharịanụ ihe unu ga na-agwa ndị na-achọghị ka e zie ha ozi ọma.
Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ka unu zie ya ozi ọma, unu pụta na nke ya, kwurịtanụ otú ka mma unu gaara esi agwa ya okwu.