Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 19
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 19
Abụ nke 47 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 19 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 1-4 (Nkeji 8)
Nke 1: Ndị Ikpe 3:1-11 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú I Nwere Ike Isi Mụta Banyere Chineke?—igw p. 4 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Mmụọ Mmadụ Si Alaghachikwuru Chineke?—Ekli. 12:7 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Jiri Obi Umeala Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu.’—Ọrụ 20:19.
Nkeji 10: Ị̀ Na-agụ Akwụkwọ Bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Olee otú akwụkwọ bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ịghọta ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a: (a) Ndị Ikpe 16:1-3, (b) Luk 6:17, na (ch) Ndị Rom 15:19? (2) Olee otú ihe e kwuru n’akwụkwọ a ga-esi nyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ (a) “oma” na “efa (Ọpụ. 16:32, 36),” (b) “talent (Mat. 25:15),” na (ch) “Ebib” na “Naịsan (Diut. 16:1)”? Ná mmechi, gbaa mmadụ niile ume ka ha na-agụ akwụkwọ a.
Nkeji 10: Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Kwụsị Ịgbara Onyenwe Anyị Ohu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2014, peeji nke 59, paragraf nke 1, ruo peeji nke 62, paragraf nke 1; nakwa peeji nke 67, paragraf nke 2. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Gị.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 20 na Ekpere