Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Gị
1. Olee ihe ndị mere n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ndị na-egosi na anyị kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị?
1 Ndị Kraịst kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’ozi ha. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma. (Luk 9:1-5; 10:1-11) Ọ bụkwa ya mere Prisila na Akwịla ji bịa Apọlọs nso ma “kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” (Ọrụ 18:24-26) Otu ihe ahụ mekwara ka Pọl gwa Timoti, bụ́ aka ochie n’ikwusa ozi ọma, ka ọ gbalịa na-ezi ihe nke ọma ka ndị mmadụ wee hụ ọganihu ọ na-enwe. (1 Tim. 4:13-15) N’agbanyeghị afọ ole anyị kwusarala ozi ọma, anyị kwesịrị ịna-agba mbọ na-enwekwu ọganihu.
2. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịmụta otú ndị ọzọ si eme nke ọma n’ozi ha?
2 Mụta Ihe n’Aka Ndị Ọzọ: Otu n’ime ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma bụ ịmụta otú ndị ọzọ si eme nke ọma n’ozi nke ha. (Ilu 27:17) N’ihi ya, gị na nwanna ọzọ soro gaa ozi, gee ntị ka ị nụ otú o si ezi ozi ọma. I nwekwara ike ịgwa ndị bụ́ aka ochie n’ikwusa ozi ọma ka ha gwa gị ihe ụfọdụ na-edochaghị gị anya. Ha gwawa gị ya, gee ha ntị nke ọma. (Ilu 1:5) Ọ bụrụ na ịga nletaghachi, ịmụrụ mmadụ ihe ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ anyị si ezi ozi ọma edoghị gị anya, gwa onye nlekọta ìgwè ị nọ na ya ma ọ bụ nwanna ọzọ ihe ndị a doro anya ka o nyere gị aka. Chetakwa na mmụọ nsọ ga-emeli ka anyị na-emekwu nke ọma n’ozi anyị. N’ihi ya, na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nye gị ya.—Luk 11:13.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna agwa anyị otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi ọ bụrụgodị na anyị agwaghị ya ka ọ tụọrọ anyị aro?
3 Nwanna gwa gị ihe ga-enyere gị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma, ewela iwe, ọ bụrụgodị na ọ bụghị gị bịakwutere ya ka o nyere gị aka. (Ekli. 7:9) Mee ka Apọlọs. Jiri obi umeala nabata aro ahụ, keleekwa ya. Ime otú a ga-egosi na ị ma ihe.—Ilu 12:15.
4. Olee ihe Jizọs kwuru mere anyị ga-eji na-emekwu nke ọma n’ozi anyị?
4 Imekwu nke Ọma n’Ozi Anyị Na-ewetara Chineke Otuto: Jizọs ji otu ihe atụ o mere gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha na-emekwu nke ọma n’ozi ha. O ji onwe ya tụnyere osisi vaịn, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ tụnyere alaka osisi vaịn. O kwuru na Nna ya na-eme ka nke ọ bụla na-amị mkpụrụ dị ọcha “ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.” (Jọn 15:2) Ọ bụ otú ahụ onye nwe ubi vaịn si achọ ka osisi vaịn ndị dị n’ubi ya na-amịkwu mkpụrụ ka Jehova si chọọ ka anyị na-amịkwu “mkpụrụ egbugbere ọnụ.” (Hib. 13:15) Ọ bụrụ na anyị na-emekwu nke ọma n’ozi anyị, olee uru ọ ga-aba? Ihe Jizọs kwuru zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu.”—Jọn 15:8.